Publicidade

Provérbios 20

1 Mmanya bụ onye na-akwa emo. Onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya bụ.

Onye ọbụla kwere ka ha duhie ya bụ onye nzuzu.

2 Ọnụma eze na-emenye oke ụjọ nʼahụ dịka mbigbọ nke ọdụm;

ndị na-akpasu ya iwe ga-atụfu ndụ ha.

3 Ọ bụ ihe nsọpụrụ nye onye na-ezere okwu na ụka,

ma onye nzuzu ọbụla na-eme ngwa ise okwu.

4 Onye umengwụ adịghị arụ ọrụ ubi nʼoge ya.

Nʼoge owuwe ihe ubi ọ pụghị ịchọta ihe oriri.

5 Nzube niile nke dị mmadụ nʼobi bụ mmiri dị omimi,

ma onye nwere nghọta na-adọpụta ha.

6 Ọtụtụ mmadụ na-asị na ha nwere ịhụnanya na-adịghị agharịpụ,

ma onye kwesiri ntụkwasị obi, onye pụrụ ịchọta ya?

7 Onye ezi omume nke na-ejegharị nʼizuoke,

ndị ihe na-agara nke ọma ka ụmụ ga-anọchi ya ga-abụ.

8 Mgbe eze na-anọkwasị nʼocheeze ya ikpe ikpe,

ọ na-eji anya ya abụọ afụchapụ ihe ọjọọ niile.

9 Onye pụrụ ị sị, "Emeela m ka obi m dị ọcha;

Abụ m onye dị ọcha, mmehie adịghịkwa nʼime m?"

10 Ihe ọtụtụ aghụghọ na ihe ọtụtụ nghọgbu,

ha niile bụ ihe arụ nʼihu Onyenwe anyị.

11 Ọbụladị ụmụntakịrị ka a na-amata site nʼomume ha niile,

nke a ọ pụtara nʼomume ha dị ọcha nʼezie a, bụrụkwa ihe ziri ezi?

12 Ntị nke na-anụ ihe na anya nke na-ahụ ụzọ,

ọ bụ Onyenwe anyị mere ha abụọ.

13 Ahụla ịrahụ ụra nʼanya, ka ị ghara ịghọ onye ụkpa.

Bilie, mụrụ anya, rụsie ọrụ ike, ka i nweekwa ihe oriri.

14 "Lee, ihe a jọrọ njọ, ọ baghị uru," ka onye na-azụ ahịa na-asị,

ma mgbe ọ pụrụ ọ na-anya isi nʼihi ihe ọ zụtara.

15 Ọlaedo dị, na ọtụtụ rubi nʼebe ọ bara ụba,

ma egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta ihe ọmụma bụ ọla dị oke ọnụahịa.

16 Chiri uwe onye ahụ naara onye mba ọzọ nʼaka mbe.

Jichiekwa ihe mbe ahụ o nyere nʼihi onye mba ọzọ ọ nara na mbe.

17 Nri e nwetara nʼụzọ aghụghọ na-atọ mmadụ ụtọ.

Ma nʼikpeazụ aja ga-eju ya ọnụ.

18 Buru ụzọ nata ndụmọdụ tupu i mee ihe ọbụla ị chọrọ ime;

ebula agha ma i bubeghị ụzọ pịa ọpịpịa.

19 Agwala onye na-akpa asịrị ihe nzuzo gị,

nʼihi na ọ ga-akụ ya nʼekwe nye ụwa niile.

20 Oriọna onye ahụ na-akọcha nne ya na nna ya

ka Chineke na-afụnyụ.

21 Ihe nketa nke anatara nʼoke ọsịịsọ,

agaghị agọzi ya nʼikpeazụ.

22 A sịkwala, "Aga m akwụghachi gị nʼihi ihe ọjọọ a."

Chere Onyenwe anyị, ọ ga-abọrọ gị ọbọ.

23 Onyenwe anyị kpọrọ ihe ọtụtụ gbara iche iche asị,

ihe ọtụtụ aghụghọ adịghị atọ ya ụtọ.

24 Onyenwe anyị na-eduzi nzọ ụkwụ niile nke mmadụ.

Olee otu onye ọbụla ga-esi ghọta ụzọ ha?

25 Ime ngwangwa doo ihe nsọ, bụ ịma nʼọnya

ma mesie tụgharịwa uche banyere imezu nkwa ahụ.

26 Eze maara ihe na-afụchapụ ndị ajọ omume,

ọ na-eji wịịlu ịfụcha mkpụrụ gaa nʼelu ha.

27 Akọnuche mmadụ bụ ọkụ Onyenwe anyị ji enyocha mmụọ ya,

ọ na-egwupụta ala ala obi ya, igosi anyị ihe anyị bụ.

28 Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi na-echebe eze,

site nʼịhụnanya ka ocheeze ya na-eguzo chịm.

29 Ugwu a na-akwanyere ụmụ okorobịa bụ nʼihi ịdị ike ha,

ma isi awọ bụ nsọpụrụ ndị okenye.

30 Ọkpọ na mmerụ ahụ na-ehichapụ ihe ọjọọ,

ụtarị na-asachapụ ime ime nke ahụ mmadụ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-