Publicidade

Provérbios 22

1 Ihe nhọrọ dị ezi mma ka aha ọma bụ karịa ọtụtụ akụ,

ịnata amara ihuọma ka mma karịa ọlaọcha na ọlaedo.

2 Ma ogbenye ma ọgaranya bụ otu nʼihu Onyenwe anyị

onye kere ha niile.

3 Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya,

ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya.

4 Obi umeala bụ egwu Onyenwe anyị,

ụgwọ ọ na-akwụ bụ akụnụba, na nsọpụrụ na ndụ ogologo.

5 Ogwu na igbudu dị nʼụzọ onye na-emebi iwu;

ma onye kpọrọ ndụ ya ihe na-asọ ya asọ.

6 Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi,

mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya.

7 Dịka ọgaranya si achị ogbenye,

otu a kwa ka onye na-ebi ego si bụrụ ohu onye na-ebinye ya ego.

8 Onye na-agha ikpe na-ezighị ezi dịka mkpụrụ, ga-ewe ajọ ihe dịka ihe ubi,

mkpanaka nke ikike iwe ha ga-agbajikwa.

9 Onye na-agbasapụ aka enye onyinye ga-abụ onye a gọziri agọzi,

nʼihi na ha na ekenyetụ ndị ogbenye nri.

10 Chụpụ onye na-akwa emo, ise okwu ga-akwụsị,

e, ịlụ ọgụ na nlelị ga-akwụsịkwa.

11 Onye na-ahụ ịdị ọcha nke obi nʼanya,

onye okwu ya jupụtara nʼamara ga-abụ enyi eze.

12 Anya Onyenwe anyị na-echebe ihe ọmụma,

ma ọ na-emebi atụmatụ niile nke ndị aghụghọ.

13 Onye umengwụ na-asị, "Ọdụm nọ nʼezi!

A ga-egbu m nʼama ọha mmadụ!"

14 Ọnụ nwanyị na-akwa iko bụ oke olulu,

nwoke nọ nʼokpuru oke iwe Onyenwe anyị na-adaba nʼime ya.

15 Obi ụmụntakịrị jupụtara nʼenweghị uche,

ma apịpịa ịdọ aka na ntị ga-achụpụ ya nʼebe dị anya.

16 Onye na-achọ uru site nʼimegbu onye na-enweghị ike,

maọbụ onye na-enye ọgaranya onyinye ga-ebi nʼoke ụkọ.

Okwu nke mbụ

17 Lezie anya gee ntị nʼokwu niile nke ndị maara ihe,

tinye uche gị nʼihe m na-akụzi.

18 Ọ dị ụtọ ma idebe ha nʼobi gị,

ma ha dịkwa nʼegbugbere ọnụ gị mgbe niile.

19 Ọ bụ ka ntụkwasị obi gị dị nʼime Onyenwe anyị,

ya ka m na-akụziri gị taa, ọbụladị gị onwe gị.

20 Ọ bụ na m edepụtabereghị gị iri ndụmọdụ atọ ndị a,

bụ okwu ndụmọdụ na ihe ọmụma?

21 Ha na-ezi gị ihe bụ ikwesi ntụkwasị obi na ikwu eziokwu.

Mgbe ahụ ọ bụrụ na-ezie gị sị gị gaa chọta eziokwu

ị ga-eji ezi ọsịsa lọghachi.

Okwu nke abụọ

22 Emegbula ogbenye nʼihi na ọ bụ ogbenye.

Emegidekwala ya nʼụzọ ikpe.

23 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ekwuchitere ha ọnụ ha

ma bibiekwa ndị na-emegide ha.

Okwu nke atọ

24 Gị na onye na-ewe oke iwe abụla enyi,

gị na onye na-ewe iwe ọsịịsọ emekọkwala ihe,

25 ma ọ bụghị ya, i nwere ike ịmụta ndụ ha,

si otu a tinye ndụ gị na nsogbu.

Okwu nke anọ

26 Abụla onye otu nʼime ndị na-anara ndị mmadụ akaebe

maọbụ kwee nkwa ikwu ụgwọ onye ọzọ ji.

27 Nʼihi na ọ bụrụ na i nweghị ego ị ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ,

a ga-anapụ gị ọ bụladị ihe ndina gị.

Okwu nke ise

28 Ehigharịla oke ala e tinyere site na mgbe ochie.

Nke ndị nna ochie gị ha hiwere.

Okwu nke isii

29 Ị hụrụ mmadụ ahụ nke nwere ǹka nʼịrụ ọrụ ya nke ọma?

Ọ ga-eguzo nʼihu ndị eze,

ọ gaghị eguzo nʼihu ndị a na-amaghị aha ha.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-