Publicidade

Provérbios 9

Ọkpụkpọ oku nke amamihe na nzuzu

1 Amamihe ewuola ụlọ ukwu ya

nʼelu ogidi asaa.

2 O doziela oriri ya nʼusoro,

o gbuola anụ ya, gwaakwa mmanya.

3 O zipụkwala ndị ozi ya ka ha gaa kpọọ mmadụ niile,

site nʼebe dị elu nke obodo ka ha nọ na-akpọ oku na-asị,

4 "Bịanụ nʼụlọ m, unu ndị niile na-enweghị uche"

Ma nye ndị amamihe kọrọ, ọ na-asị,

5 "Bịanụ, rie nri m,

ṅụọkwa mmanya m gwakọtara.

6 Hapụnụ ụzọ enweghị uche unu, ka unu were dị ndụ;

gbasokwanụ ụzọ mmụọ ịghọta ihe."

7 Onye ọbụla na-adọ onye na-akwa emo aka na ntị na-ewetara onwe ya nlelị;

onye na-abara mmadụ ọjọọ mba na-enweta nkọcha.

8 Abarala ndị na-akwa emo mba, ma ọ bụghị ya, ha ga-akpọ gị asị;

baara ndị maara ihe mba, ha ga-ahụ gị nʼanya.

9 Kuziere onye maara ihe ihe o kwesiri ịmụta, ọ ga-ama ihe karịa,

kuziere onye ziri ezi ihe ọ ga-atụkwasị ihe ọ mụtara nʼamamihe ya.

10 Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe,

inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta.

11 Nʼihi na ọ bụ site na amamihe, ka ụbọchị gị ga-adị ogologo.

A ga-etinyekwara gị ọtụtụ afọ na ndụ gị.

12 Ị bụrụ onye nwere amamihe, amamihe gị ga-abara gị uru,

ma ị bụrụ onye na-akwa emo, naanị gị ga-ata ahụhụ ya.

13 Nwanyị dị nzuzu na-eme mkpọtụ,

o nweghị uche; ihere adịghịkwa eme ya.

14 Ọ na-anọ ọdụ nʼọnụ ụzọ ụlọ ya,

nʼelu oche nʼebe dịkarịsịrị elu nʼobodo,

15 na-akpọ ndị na-aga nʼụzọ oku,

bụ ndị na-aga mkpa ha,

16 "Ka ndị niile amamihe kọrọ bịa nʼụlọ m."

Ọ na-asịkwa ndị na-enweghị uche,

17 "Mmiri e zutere nʼohi na-atọ ụtọ,

nri e riri na nzuzo na-atọkarịkwa nʼụtọ."

18 Ma ha adịghị aghọta na ndị nʼadịghị ndụ nọ nʼebe ahụ,

na ndị ọ kpọrọ oku nri aghọọlarị ndị nọ nʼala mmụọ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-