Publicidade

Provérbios 5

Ịdọ aka na ntị banyere ịkwa iko

1 Nwa m, ṅaa ntị nʼokwu amamihe m,

gee ntị nʼokwu nghọta m ndị a.

2 Lezie anya, ka i debe izuzu dị iche iche,

ka egbugbere ọnụ gị na-echebekwa ihe ọmụma.

3 Nʼihi na egbugbere ọnụ nwanyị na-akwa iko na-atọ ka mmanụ aṅụ,

okwu ọnụ ya na-akwọ mụrụmụrụ karịa mmanụ.

4 Ma nʼikpeazụ, ọ na-elu ilu dịka oluilu

dịkwa nkọ ka mma agha ihu abụọ.

5 Ụkwụ ya abụọ na-arịdaru nʼọnwụ,

nzọ ụkwụ ya abụọ na-eje nʼụzọ ọkụ ala mmụọ.

6 Nʼihi na ọ dịghị agbaso ụzọ kwesiri ndụ;

ụzọ ya gbagọrọ agbagọ, ma ọ maghị nke a.

7 Ugbu a ụmụ m, geenụ m ntị,

unu esikwala nʼokwu niile nke ọnụ m wezuga onwe unu.

8 Gbaara nwanyị dị otu a ọsọ!

Ejekwala ọnụ ụzọ ụlọ ya nso,

9 ka ị ghara ire ugwu gị nʼebe ndị ọzọ nọ,

maọbụ were ndụ gị tinye nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.

10 Ka ndị ọbịa ghara inwe oke oriri nʼelu akụ gị,

ka ihe niile ị dọgburu onwe gị nʼọrụ ịkpata gharakwa imejupụta ụlọ onye ọzọ.

11 Ka ị gharakwa ịsụ ude nʼikpeazụ

mgbe ọrịa ga-eripịa ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị.

12 Mgbe ị ga-asị, Lee ka m si kpọọ ịdọ aka na ntị asị!

"Leekwa ka obi m si lelịa iba mba anya!

13 Egeghị m ntị nʼozizi nke ndị nkuzi m

maọbụ nabata ndụmọdụ nke ndị ndụmọdụ m.

14 Nʼihi na ugbu a, abịaruola m na mbibi

nʼihu ọha mmadụ niile."

15 Ṅụọ naanị mmiri nke si nʼite mmiri gị;

mmiri dị mma nke si nʼolulu mmiri gị.

16 Gịnị mere ị ga-eji kwe ka isi mmiri gị sọọ nʼokporoụzọ,

ka mmiri nke aka gị sọọ nʼama?

17 Kwee ka ha bụrụ nke naanị gị,

nke onye ọbịa na-agaghị enwe oke nʼime ya.

18 Kwere ka ịbụ nwoke gị bụrụ ngọzị nye gị;

ṅụrịakwa ọṅụ nʼihi nwunye nke ị lụtara nʼokorobịa gị.

19 Nne anụ nke na-ahụ nʼanya, dịka ele mara mma,

ka ara dị ya nʼobi zuore gị,

ka ịhụnanya ya na-enye gị obi ụtọ mgbe ọbụla.

20 Gịnị ka ị na-achọ nʼahụ nwanyị na-akwa iko?

Gịnị mere i ji na-amaku nwunye onye ọzọ obi?

21 Nʼihi na Onyenwe anyị na-ele gị anya,

ihe niile ị na-eme ka ọ na-ahụ.

22 Onye na-emebi iwu na-esite na mmehie ya laa onwe ya nʼiyi;

mmehie ndị a bụ ụdọ nke na-ejide ya.

23 Ọ ga-anwụ nʼihi na ọ nabataghị ịdọ aka na ntị;

ọ bụkwa nzuzu ya dufuru ya.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-