Publicidade

Provérbios 25

1 Ndị a bụkwa ilu Solomọn, nke ndị ozi Hezekaya eze ndị Juda dekọtara nʼakwụkwọ.

2 Ọ bụ nsọpụrụ Chineke izobe okwu,

ma nsọpụrụ ndị eze bụ ịchọpụta ala okwu.

3 Dịka ịdị elu nke eluigwe, dịka ịdị omimi nke ala,

otu a ka obi ndị eze bụ ihe a na-apụghị ịchọpụta.

4 Wepụ ihe ahụ niile na-ekpuchi mma ọlaọcha,

onye ọkpụ ụzụ ọla ga-arụpụta efere;

5 wezugakwa ndịisi nʼeme ajọ ihe nʼihu eze,

ocheeze ya ga-eguzosikwa ike site nʼezi omume.

6 Egosipụtala onwe gị nʼihu eze,

ewerela ọnọdụ nʼetiti ndị oke mmadụ,

7 ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na ọ si gị, "Rigota nʼebe a,"

karịa na o wedara gị ala nʼihu ndị oke mmadụ.

Ihe iji anya gị abụọ hụ

8 e mekwala ngwangwa ịga nʼụlọikpe,

nʼihi na ọ bụ gịnị ka ị ga-eme nʼikpeazụ

ma ọ bụrụ nʼonye agbataobi gị etinye gị nʼọnọdụ ihere?

9 Ọ bụrụ na gị na onye ọzọ enwee esemokwu, dozienụ ya nʼonwe unu,

emekwala ka ndị ọzọ mata okwu nzuzo gị na onye ọzọ kwuru,

10 ma ọ bụghị ya, onye nụrụ ya nwere ike menye gị ihere,

agwa ọjọọ gị agaghị enwekwa ọgwụgwụ.

11 Ndụmọdụ e nyere nʼoge kwesiri ekwesi

dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo e tinyere nʼefere ọlaọcha.

12 Dịka ọlantị ọlaedo maọbụ ihe ịchọ mma nke ọlaedo mara mma

ka mba onye maara ihe bụ na ntị onye na-anụ ya.

13 Onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ntute na ndụ,

dịka mmiri oyi si eme ka ahụ dị jụụ

nʼoge okpomọkụ owuwe ihe ubi.

14 Onye ahụ na-adịghị emezu nkwa o kwere

dịka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri.

15 Nwee ndidi, nʼikpeazụ ị ga-enwe mmeri,

nʼihi na ire dị nro na-agbaji ọkpụkpụ.

16 Mmanụ aṅụ ọ na-atọ gị ụtọ?

Arachala ya karịa, ka ọ ghara iwetara gị ọrịa.

17 Ejela ileta onye agbataobi gị mgbe mgbe,

ka ị ghara ire ugwu gị.

18 Onye na-agbagịde onye agbataobi ya ama ụgha,

dịka mkpọrọ osisi maọbụ mma agha, maọbụ àkụ a pịziri apịzi.

19 Ịtụkwasị onye aghụghọ obi nʼoge nsogbu dị ka iji eze na-eme ndakapụ ata ihe,

maọbụ iji ụkwụ jiri eji agba ọsọ.

20 Dịka onye e yipụrụ uwe nʼụbọchị oyi ụgụrụ,

maọbụ iwere nnu tee nʼelu ọnya,

otu a ka onye na-abụrụ onye iwe na-ewe abụ dị.

21 Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri ka o rie,

ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ.

22 Mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya,

Onyenwe anyị ga-akwụghachikwa gị.

23 Dịka ifufe si nʼugwu si eweta mmiri ozuzo,

otu a ka ikwu mmadụ okwu azụ si eweta iwe.

24 Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ

karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu.

25 Oziọma e sitere na mba dị anya nata

dị ka mmiri jụrụ oyi nye onye akpịrị na-akpọ nkụ.

26 Onye ezi omume nke kwenyere nʼihe onye na-emebi iwu kwuru

dị ka iyi a gwọrụrụ nʼisi ya.

27 Dịka ịracha mmanụ aṅụ hie nne si jọọ njọ,

otu a ka o si bụrụ ihe na-enweghị nsọpụrụ, mmadụ ịchọpụta ihe ndị ezomiri ezomi.

28 Nwoke ọbụla na-adịghị achị mmụọ ya

dị ka obodo na-enweghị ndị na-eche ya nche, nke e tikpọrọ mgbidi ya etikpọ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-