Publicidade

Provérbios 11

1 Ihe ọtụtụ aghụghọ bụ arụ nʼihu Onyenwe anyị

ma ihe ọtụtụ zuru ezu na-anata ihuọma nʼebe ọ nọ.

2 Nganga bịa, nlelị a na-eso ya,

ma onye dị umeala nʼobi na-amụta ihe.

3 Eziokwu nke ndị ziri ezi nʼobi na-edu ha;

ma omume gbagọrọ agbagọ nke ndị aghụghọ nʼala ha nʼiyi.

4 Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe;

ọ bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ.

5 Ezi omume nke ndị na-enweghị ịta ụta na-eme ka ụzọ ha zie ezi,

ma ajọ omume nke ndị na-emebi iwu na-akwada ha.

6 Ezi omume nke onye ziri ezi na-azọpụta ya;

ma ọchịchọ ọjọọ nke ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-eji jide ha.

7 Mgbe onye ajọ omume nwụrụ, olileanya ya niile alala nʼiyi,

ihe niile ọ na-ele anya inweta site nʼike ya alaakwala nʼiyi.

8 Chineke na-azọpụta ndị ezi omume site na nsogbu ha,

ma ndị ajọ omume ka ọ na-ahapụ ka ha daba nʼime ya.

9 Okwu ọjọọ ka onye ajọ omume ji emebi onye agbataobi ya.

Ma site nʼihe ọmụma ka onye ezi omume ga-eji dọpụta ndụ ya.

10 Ọganihu nke onye ezi omume na-atọ mmadụ niile ụtọ,

otu aka ahụ kwa, ọnwụ onye ajọ omume na-atọ mmadụ niile ụtọ.

11 A na-esite na ngọzị nke ndị ziri ezi bulie obodo elu,

ma a nʼala ya nʼiyi site nʼokwu ọnụ ndị ajọ omume.

12 Ikwu okwu nleda megide onye agbataobi gị bụ nzuzu;

ma onye ahụ nwere nghọta na-agba nkịtị.

13 Onye na-agba asịrị na-ekpughe ihe nzuzo,

ma onye kwesiri ntụkwasị obi na-ekpuchi ihe nzuzo.

14 Nʼihi enweghị ezi ndị ndu ka obodo ji ada,

ma ọtụtụ ndị ezi ndụmọdụ na-eweta mmeri.

15 Onye ọbụla na-ana onye ọbịa nʼakaebe ga-ata ahụhụ,

ma onye jụrụ ịkwụ ụgwọ onye ọzọ ji, nọ na ntụkwasị obi.

16 Nsọpụrụ na-adịrị nwanyị nwere obiọma,

ma ndị na-adịghị eme ebere bụ naanị akụnụba ka ha na-enweta.

17 Onye nwere obiọma baara onwe ya uru,

ma onye nwere obi ọjọọ na-ewetara onwe ya nsogbu.

18 Onye ajọ omume na-anata ụgwọ ọrụ aghụghọ,

ma onye na-agha ezi omume dịka mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ kwesiri ekwesi.

19 Onye na-eguzosi ike ime ihe ziri ezi ga-enwe ndụ;

ma onye na-agbaso ihe ọjọọ ga-ahụ ọnwụ.

20 Onyenwe anyị na-akpọ ndị obi ha gbagọrọ agbagọ asị

ma ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta na-amasị ya.

21 Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-emebi iwu ga-ata ahụhụ,

ma ndị ezi omume ka a ga-anapụta.

22 Nwanyị mara mma, nke na-enweghị uche,

dịka ọlaedo a gbanyere ezi nʼimi.

23 Olileanya onye ezi omume bụ ọṅụ,

ma onye na-emebi iwu na-ele naanị anya ihe ọjọọ.

24 Otu onye na-agbasapụ aka ya na-enye enye ma na-enweta akụ karịa,

ma onye ọzọ na-egbochi egbochi ma na-ada ogbenye.

25 E, onye na-agbasa aka ya ga-aba ọgaranya;

onye ọbụla na-atụte ndị ọzọ ka a ga-atụtekwa.

26 Ndị mmadụ na-abụ onye na-achịkọba mkpụrụ ọka na-ereghị ya ere ọnụ,

ma ha na-ekpetara onye nke dị njikere ire nke ya ngọzị Chineke.

27 Onye na-achọ ihe ọma na-enweta ihuọma,

ma ihe ọjọọ na-abịakwasị onye na-achọ ya.

28 Ndị tụkwasịrị obi nʼakụnụba ha ga-ada,

ma onye ezi omume ga-epupụta dịka akwụkwọ ndụ.

29 Onye na-ewetara ezinaụlọ ha nsogbu ga-eketa naanị ifufe,

onye nzuzu ga-abụ ohu nke onye maara ihe.

30 Mkpụrụ nke ndị ezi omume bụ osisi na-enye ndụ,

onye na-erita mkpụrụobi nʼuru bụ onye maara ihe.

31 Ọ bụrụ na a ga-akwụ ndị ezi omume ụgwọ ọrụ ha nʼụwa a;

a ga-esi aṅaa ghara ịkwụ ndị na-amaghị Chineke na ndị mmehie ụgwọ ọrụ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-