Publicidade

Provérbios 16

1 Mmadụ nwere ike pịa ihe ọ chọrọ ime,

ma okwu ikpeazụ ga-esi nʼọnụ Onyenwe anyị.

2 Ụzọ niile nke mmadụ dị ọcha nʼanya ya,

ma Onyenwe anyị na-atule ebumnobi niile nke mmadụ.

3 Were ọrụ gị niile nyefee nʼaka Onyenwe anyị,

ọ ga-eme ka ha gaa nʼihu.

4 Onyenwe anyị na-eme ka ihe niile rụpụta ebumnuche ya,

o bụladị ndị mmebi iwu ka e debere maka ụbọchị mbibi.

5 Onyenwe anyị kpọrọ ndị nwere obi dị mpako asị.

Mara nke a nke ọma: Ha aghaghị ịta ahụhụ.

6 Ọ bụ site nʼịhụnanya na eziokwu ka eji ekpuchi mmehie;

ọ bụkwa site nʼegwu Onyenwe anyị ka mmadụ ji agbanarị mmehie.

7 Mgbe ụzọ mmadụ na-agbaso na-atọ Onyenwe anyị ụtọ,

ọ na-eme ka mmadụ ahụ na ndị iro ya dị nʼudo.

8 Ọ dị mma inwe ihe nta nʼezi omume

karịa inwe ọtụtụ uru nʼụzọ ikpe na-ezighị ezi.

9 Anyị nwere ike pịa ọpịpịa nʼobi anyị,

maọbụ Onyenwe anyị na-edu ije anyị.

10 Egbugbere ọnụ eze na-ekwu okwu sitere na-ezi nghọta,

ọnụ ya adịghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.

11 Ihe ọtụtụ ziri ezi na ihe niile ha nʼotu dịrị Onyenwe anyị,

ihe niile e ji atụ ihe dị nʼime akpa bụ ya mere ha.

12 Ndị eze kpọrọ ime ihe na-adịghị mma asị,

nʼihi na site nʼezi omume ka ocheeze ji eguzosi ike.

13 Ndị eze na-enwe mmasị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu eziokwu,

ha na-agụ onye na-ekwu eziokwu dị ka ezi mmadụ.

14 Iwe eze bụ onyeozi nke ọnwụ.

Onye maara ihe ga-eme ka ọ dajụọ.

15 Mgbe ọchị dị nʼihu eze ọ na-ewetara onye hụrụ ya ndụ,

ihuọma ya dị ka igwe ojii na-eweta mmiri ozuzo.

16 Ọ ka mma inwe amamihe na mmụọ ịghọta ihe

karịa inwe ọlaọcha na ọlaedo.

17 Ụzọ dị larịị nke onye ziri ezi bụ iwezuga onwe ya pụọ nʼihe ọjọọ,

ndị na-echebe ụzọ ha niile na-echebekwa ndụ ha.

18 Nganga na-eweta ịla nʼiyi,

mpako na-ewetakwa ọdịda.

19 Ọ ka mma ịbụ onye ogbenye nwere obi umeala karịa ịbụ onye nganga,

na onye so ndị nganga keta oke nʼihe ha kwatara nʼagha.

20 Onye ọbụla na-aṅa ntị na ndụmọdụ ka ihe na-agara nke ọma,

onye a gọziri agọzi bụ onye ahụ nke na-atụkwasị Onyenwe anyị obi.

21 A na-amata onye nwere uche site nʼụdị nghọta o nwere.

Okwu dị ụtọ na-eme ka mmadụ mụta ihe nke ọma.

22 Inwe uche bụ isi iyi ndụ nye ndị niile nwere ya,

ma enweghị uche na-ewetara ndị nzuzu ntaramahụhụ.

23 Obi onye maara ihe na-eme ka e tinye uche nʼokwu ọnụ ya,

egbugbere ọnụ ha na-emekwa ka mmụta gaa nʼihu.

24 Okwu dị nro na-atọ ụtọ ka mmanụ aṅụ,

ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, na-enyekwa ọkpụkpụ ahụ ike.

25 Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ,

ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ.

26 Agụụ ihe oriri nke onye ọrụ na-arụpụtara ya ọrụ;

agụụ na-akpali mmụọ ya ịga nʼihu.

27 Ndị ọjọọ na-atụpụta echiche ọjọọ,

egbugbere ọnụ ha dị ka ọkụ nke na-ekpochapụ ahụ.

28 Onye na-emebi iwu na-agbasa ise okwu;

ha na-akpali nsogbu, na-ekewa enyi na enyi.

29 Ndị ọjọọ na-arafu ndị agbataobi ha,

na-edubakwa ha nʼụzọ ga-ewetara ha mbibi.

30 Onye ji ikuanya ya ekwu okwu na-atụ atụmatụ ọjọọ,

onye na-atabi egbugbere ọnụ ya abụọ ekpebiela ime mmehie.

31 Isi awọ bụ okpueze nke mara mma,

a na-enweta ya nʼụzọ ezi omume.

32 Onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ karịrị onye a maara aha ya.

Onye nwere ogologo ntachiobi karịrị onye na-adọta obodo nʼagha.

33 A na-efe nza, nʼihi ịchọpụta uche Onyenwe anyị,

maọbụ Chineke nʼonwe ya na-ekpebi ihe a ga-efeta na nza ahụ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-