Publicidade

Provérbios 26

1 Ịhụ onye nzuzu a na-enye nsọpụrụ

dịka ịhụ mkpụrụ mmiri ka ọ na-ada nʼoge ọkọchị maọbụ mmiri na-ezo nʼoge owuwe ihe ubi.

2 Dịka nnụnụ nta na-efegharị efegharị, maọbụ dịka eleke na-awụgharị

otu a ka ọbụbụ ọnụ na-ekwesighị agaghị ere.

3 Ụtarị dịrị ịnyịnya, ịnyịnya ibu ka a na-ekenye mkpụmkpụ igwe nʼọnụ;

otu a kwa ka apịpịa dị nye azụ ndị nzuzu.

4 A zaghachila onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị,

ma ọ bụghị ya gị onwe gị ga-adị ka ya.

5 Zaa onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị,

ma ọ bụghị ya ọ ga-abụ onye maara ihe nʼanya onwe ya.

6 Iziga ozi site nʼaka onye nzuzu

dịka mmadụ ibipụ ụkwụ ya maọbụ ịṅụ ihe ike dịka mmiri.

7 Dịka onye ngwụrọ si eji ụkwụ ya eje ije,

otu a ka ilu si esite nʼọnụ onye nzuzu apụta.

8 Ọ baghị uru inye onye nzuzu nsọpụrụ, nʼihi na ọ gaghị anọgide.

Ọ dị ka ịwụ ọkụkọ mmiri nʼazụ.

9 Dịka ogwu manyere nʼaka onye na-aṅụbiga mmanya oke

otu a ka ilu dị nʼọnụ onye nzuzu.

10 Dịka ọgba ụta si agba ụta ya na-enweghị onye o bụ nʼobi,

otu a ka ọ dị bụ onye na-enye onye nzuzu maọbụ onye o bụla na-agafe nʼụzọ ọrụ ka o rụọra ya.

11 Dịka nkịta laghachiri ọzọ nʼihe ọ gbọrọ,

otu a ka ndị nzuzu dị mgbe ha na-emekwa omume enweghị uche ha.

12 Ị hụrụ onye mara ihe nʼanya nke onwe ya?

Olileanya dị nye onye nzuzu karịa ndị dị otu a.

13 Onye umengwụ na-asị, "Ọdụm nọ nʼokporoụzọ,

ọdụm ji oke iwe na-awagharị nọ nʼama niile!"

14 Dịka ibo ọnụ ụzọ si emegharị nʼihe nkonye ya,

otu a ka onye umengwụ si na-atụgharị onwe ya nʼelu ihe ndina ya.

15 Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri

ma oke umengwụ a naghị ekwe ka o weghachi ya tinye nʼọnụ ya.

16 Nʼuche ya, onye umengwụ na-eche na ọ maara ihe

karịa ndị ikom asaa na-eji ezi uche azaghachi okwu.

17 Onye na-etinye onwe ya nʼesemokwu na-agbasaghị ya

dị ka mmadụ na-apụ nʼokporoụzọ dọkpụrụ nkịta ọbụla ọ hụrụ na ntị.

18 Dịka onye ara na-agba àkụ

na-ere ọkụ nke na-eweta ọnwụ,

19 ka nwoke ahụ bụ nke na-aghọgbu onye agbataobi ya

ma sị, "ọ bụ naanị egwuregwu ka m na-egwu."

20 Ọkụ na-anyụ mgbe nkụ gwụrụ,

otu a kwa esemokwu na-akwụsị mgbe a kwụsịrị ikwu ndị ọzọ okwu nʼazụ.

21 Dịka icheku si eme ka nkụ nwuru ọkụ,

otu a ka onye na-ese okwu si eme ka ọgụ nwuru ọkụ.

22 Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ,

ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.

23 Dịka ite aja ụrọ nke e ji ọlaọcha na-abaghị uru techie,

ka egbugbere ọnụ dị nro nke obi jupụtara nʼihe ọjọọ bụ.

24 Ndị iro na-eji egbugbere ọnụ ha gbanwee onwe ha,

ma nʼime obi ha ọ bụ naanị aghụghọ dị ya.

25 Okwu ọnụ ya nwere ike tọọ ụtọ na ntị ma ekwenyerela ha,

nʼihi na ihe arụ asaa jupụtara nʼime obi ha.

26 Ọ bụ ezie na ọ ga na-eme ka ọ hụrụ gị nʼanya,

ma iro ya ga-apụta ihe, mmadụ niile ga-ahụkwa ya.

27 Onye na-egwuru ibe ya olulu ga-adaba nʼime ya.

Ọzọ, onye na-enuda nkume, ya ka nkume ahụ ga-adagbu.

28 Onye ị kpọrọ asị bụ onye ị ga-achọ iwetara ihe mgbu site nʼịgha ụgha.

Okwu ọma na-esighị nʼobi mmadụ pụta na-eweta ịla nʼiyi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_10-32-54-