Publicidade

Provérbios 7

Ịdọ aka na ntị banyere nwanyị na-akwa iko

1 Na-agbaso okwu m nwa m, nọgide na ya,

dokwaa iwu m niile nʼime obi gị.

2 Debe iwu m ka ị dị ndụ,

chee ozizi m nche dịka ọ bụ mkpụrụ anya gị.

3 Kee ha na mkpịsịaka gị,

deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.

4 Hụ amamihe nʼanya dịka nwaagbọghọ ị hụrụ nʼanya;

hụkwa inwe nghọta nʼanya dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne gị.

5 Kwee ka ha debe gị, ka ị ghara ijekwuru nwanyị na-akwa iko,

ka ị gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ire ụtọ ya.

6 Nʼihi na otu ụbọchị,

esi m na oghereikuku dị nʼụlọ m lepụ anya,

7 hụ nʼetiti ndị na-enweghị uche,

ahụtara m otu nwokorobịa nʼetiti ha,

onye amamihe kọrọ,

8 ka ọ na-aga nʼụzọ dị nso ebe nkuku ụlọ

nʼakụkụ ụlọ nwanyị ihere na-adịghị eme,

9 nʼoge anyasị, dịka chi na-eji,

mgbe ọchịchịrị na-agbachi.

10 Mgbe ahụ, nwanyị ahụ pụtara zute ya.

O yi uwe dịka nwanyị akwụna, jiri aghụghọ na-abịakwute ya.

11 (Ọ na-eme ụzụ na-aṅaghị ntị ịnụ ihe ọbụla.

Ụkwụ ya anaghị anọgide nʼụlọ ya.

12 Ọ na-akwụgharị ma nʼokporoụzọ ma nʼama;

na-amịgharị nʼebe nzuzo niile.)

13 O weere aka ya abụọ jikụọ nwokorobịa ahụ nʼolu, sutu ya ọnụ,

were ihu nke ihere na-adịghị, sị:

14 "Emezuru m nkwa niile m kwere taa,

enwekwara m nri nke sitere nʼihe aja udo m chụrụ nʼụlọ m,

15 Ọ bụ gị ka m na-achọkwute,

lee gị ka ị na-abịa.

16 Agbasaala m akwa mara mma nʼelu ihe ndina m,

bụ akwa ọcha mara mma tụrụ ọtụtụ agwa nke e ji ogho ndị Ijipt kpaa.

17 Efesakwala m mmanụ isi ọma nke máá, aloos na sinamọn

nʼelu nʼihe ndina m.

18 Bịa, ka anyị were ịhụnanya ṅụjụbiga afọ anyị;

ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ site ugbu a ruo ụtụtụ echi.

19 Nʼihi na di m anọghị nʼụlọ

o jeela njem dị anya.

20 O ji akpa ego juru gaa njem,

abalị ole na ole ga-agafekwa tupu ọ lọta."

21 Otu a ka o si jiri okwu ire ụtọ ya megharịa nwokorobịa ahụ isi tutu o kwenyere ya.

O nwekwaghị ike ịnapụta onwe ya site nʼokwu nrafu nke nwanyị ahụ.

22 O sooro nwanyị ahụ dịka ehi

a na-adọkpụ na-aga ebe a ga-egbu ya,

dịka ele nke na-aba nʼọnya,

23 nke na-eche ka e were àkụ gbata ya nʼobi.

Nwoke ahụ dịka nnụnụ nke na-efeba nʼọnya

na-amaghị ihe na-eche ya pụrụ iwepụ ndu ya.

24 Geenụ ntị, ụmụ m, ma ọ bụghị naanị ige ntị,

kama meekwanụ ihe m na-ekwu.

25 Ekwela ka agụụ nke obi gị chịa gị;

ejela nwanyị dị otu a nso; gbaara ya ọsọ, ka ọ ghara ịnwa gị nwetakwa gị.

26 Nʼihi na o mebiela ndụ ọtụtụ mmadụ,

ọtụtụ mmadụ amaala nʼọnya ya.

27 Ụlọ ya bụ okporoụzọ nke na-eduba nʼili,

nke na-edubakwa nʼala ọnwụ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-