Publicidade

Provérbios 24

Okwu nke iri abụọ

1 Ekwosola ndị ajọ omume ekworo,

ka ihe banyere ha ghara ịtọ gị ụtọ.

2 Nʼihi na-atụmatụ obi ha niile bụ otu ha ga-esi mee ihe ike,

egbugbere ọnụ ha na-ekwu naanị maka ọgbaaghara.

Okwu nke iri abụọ na otu

3 Ọ bụ amamihe ka e ji ewu ụlọ,

ọ bụkwa nghọta ka e ji eme ka o guzosie ike.

4 Sitekwa nʼihe ọmụma ka akụ niile ji ejupụta nʼime ya,

bụ akụ ndị pụrụ iche ma dịkwa oke ọnụahịa.

Okwu nke iri abụọ na abụọ

5 Onye maara ihe na-emeri site nʼịdị ike,

ndị nwere ọmụma ihe na-akpali ike ha.

6 Ejela ọgụ ma ọ bụghị na i nwetara ezi ndụmọdụ,

nʼihi na nzọpụta dị nʼige ọtụtụ ndị ndụmọdụ ntị.

Okwu nke iri abụọ na atọ

7 Amamihe dị elu nke ukwuu nye ndị nzuzu,

ha gaghị asaghe ọnụ ha nʼọgbakọ ọnụ ụzọ ama.

Okwu nke iri abụọ na anọ

8 Onye na-eche echiche ime ihe ọjọọ

ka a ga-agụ dịka onye nzube ihe ọjọọ

9 Nzube niile nke onye na-enweghị uche bụ mmehie,

ndị mmadụ na-akpọ onye na-akwa emo asị.

Okwu nke iri abụọ na ise

10 Ọ bụrụ na ị pụghị iguzosi ike nʼoge nsogbu,

ị bụ nnọọ onye ike ya dị ntakịrị.

11 Napụta ndị a na-eduba nʼọnwụ.

Napụtakwa ndị ahụ a mara ikpe ọnwụ nʼụzọ na-ezighị ezi.

12 Ọ bụrụ na ị sị, "Anyị amaghị banyere ihe ndị a,"

ọ bụ na onye na-enyocha obi aghọtaghị ya?

Ọ bụ na onye na-eche ndụ gị amaghị ya?

Ọ bụ na ọ gaghị akwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka akaọrụ ya siri dị?

Okwu nke iri abụọ na isii

13 Nwa m nwoke, rachaa mmanụ aṅụ nʼihi na ọ dị mma.

Mmanụ aṅụ nke si nʼugbugbo mmanụ aṅụ na-adị gị ụtọ nʼọnụ.

14 Marakwa na otu a ka amamihe kwesiri isi tọọ obi gị ụtọ.

Ọ bụrụ na i chọta ya

i nwere olileanya nke ga-adịgide.

Okwu nke iri abụọ na asaa

15 Adịla ka onye na-emebi iwu, onye echiche ya niile bụ imegide ụlọ onye ezi omume.

A gakwala ga kwakọrọ ihe dị nʼụlọ ya.

16 Nʼihi na onye ezi omume nwere ike daa ugboro asaa ma o ga-ebilikwa ọzọ.

Ma ndị na-emebi iwu na-asọ ngọngọ mgbe nsogbu bịakwasịrị ha.

Okwu nke iri abụọ na asatọ

17 Aṅụrịla ọṅụ mgbe onye iro gị dabara na nsogbu.

Ka obi gharakwa ịtọ gị ụtọ mgbe ọ dara.

18 Nʼihi na Onyenwe anyị pụrụ iwe iwe nʼihi ya

megide gị ma kwụsị ịta ya ahụhụ.

Okwu nke iri abụọ na itoolu

19 Ekwosola onye na-emebi iwu ekworo,

maọbụ nwe anya ukwu nʼebe onye ajọ omume nọọ.

20 Nʼihi na onye na-emebi iwu enweghị ọdịnihu;

a ga-afụnyụkwa ọkụ onye ajọ omume.

Okwu nke iri atọ

21 Nwa m, tụọ egwu Onyenwe anyị na onye bụ eze,

esonyerela ndị ozi na-enupu isi megide nna ha ukwu.

22 Nʼihi na ọ bụ na mberede ka ị ga-eso ha daba na nhụju anya.

Onye maara ihe ga-abụ ọgwụgwụ ya?

23 Ndị a bụkwa okwu ọzọ ndị amamihe kwuru,

iji gosi na ikpe ikpe na-akwụghị ọtọ adịghị mma.

24 Onye ọbụla nke na-asị onye ikpe mara, "Onye ezi omume ka ị bụ,"

ga-anata ọbụbụ ọnụ site nʼọnụ ọtụtụ mmadụ, mba niile ga-eweso ya iwe.

25 Ma ọ ga-adịrị ndị ahụ na-abara onye ikpe mara mba na mma,

ha ga-anatakwa ezi ngọzị.

26 Ọsịsa ziri ezi

bụ ihe na-egosi ikwesi ntụkwasị obi.

27 Rụchaa ọrụ gị dị nʼezi.

Dozie ala ubi gị.

Emesịa wuoro onwe gị ụlọ.

28 Agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị nʼefu.

Ọ bụ egbugbere ọnụ gị abụọ ka ị ga-eji ghọọ aghụghọ?

29 Asịla, "Aga m emeso ha dịka ha siri meso m.

Aga m akwụghachi ha ụgwọ ihe ha mere."

30 Esitere m nʼubi otu onye umengwụ gafee,

bụ ubi vaịnị nke onye na-enweghị uche,

31 hụ na ogwu etochiela ya,

ahịhịa etochiekwala ya;

mgbidi dị ya gburugburu adaakwala.

32 Elegharịrị m ya anya

site na ya mụta otu ihe a:

33 Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta,

nwa ịchịkọba aka nta zuo ike

34 ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi,

ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-