Publicidade

Provérbios 14

1 Nwanyị maara ihe na-ewu ụlọ ya,

ma nwanyị nzuzu na-eji aka ya akwada ụlọ ya.

2 Ime ihe ziri ezi bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị;

ma ndị na-ejehie nʼụzọ ha na-akpọ ya asị.

3 Ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu mpako,

ma egbugbere ọnụ onye maara ihe na-echebe ha.

4 Mgbe ehi na-adịghị, ụlọ ebe a na-azụ anụ na-adị ọcha,

ma site nʼike ehi ihe omume nke ubi na-ejupụta nʼụlọ.

5 Onye akaebe eziokwu adịghị aghọgbu mmadụ,

ma onye akaebe ụgha na-agha ụgha mgbe ọbụla.

6 Onye na-akwa emo na-achọ amamihe ma ọ dịghị achọta ya;

ma ihe ọmụma na-abịara onye nwere nghọta ọsịịsọ.

7 Si nʼebe onye nzuzu wezuga onwe gị,

nʼihi na ị gaghị achọta ihe ọmụma nʼọnụ ya.

8 Amamihe nke onye nwere uche bụ ihe na-eme ka ọ mata ebe ọ na-aga,

ma enweghị uche nke ndị nzuzu bụ aghụghọ.

9 Ndị nzuzu na-eji okwu idozi ihe mmehie mebiri akwa emo;

ma obi ebere ka a na-achọta nʼetiti ndị omume ha ziri ezi.

10 Ọ bụ naanị onye ihe na-eme maara ụfụ ya,

ọ dịghị onye ọzọ ga-eso keta ọṅụ ya.

11 A ga-ala ụlọ onye ajọ omume nʼiyi,

ma ụlọ ikwu onye omume ya ziri ezi ga-awasa ka igu.

12 Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ,

ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ.

13 Ọ bụladị nʼime ọchị obi mgbu na-adị,

ma ọṅụ nwere ike kwụsị nʼiru ụjụ.

14 Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi aghaghị inweta ụgwọ ọrụ ha,

ma ezi mmadụ ga-enwetakwa ụgwọ ọrụ ya.

15 Onye na-enweghị uche na-ekwenye ihe niile a gwara ya;

ma onye nwere uche na-atule mara ebe ọ na-eje.

16 Onye mara ihe na-atụ egwu Onyenwe anyị na-ewezugakwa onwe ya nʼihe ọjọọ,

ma onye nzuzu na-ewebiga iwe oke ma na-eche na ọ ka bụ onye kwesiri ntụkwasị obi.

17 Onye iwe ọkụ na-eme ihe nzuzu,

ma onye na-echepụta nzube ọjọọ ka a na-akpọ asị.

18 Ndị na-enweghị uche na-enweta ụgwọ ọrụ nke uche gbagọrọ agbagọ,

ma onye nwere uche na-enweta ihe ọmụma.

19 Ndị ọjọọ ga-akpọ isiala nʼihu ndị ezi mmadụ,

ndị ajọ omume ga-ada nʼọnụ ụzọ ama ndị ezi omume.

20 Ọ bụladị ndị agbataobi onye ogbenye na-akpọ ya asị,

ma ọgaranya na-enwe ọtụtụ ndị enyi.

21 Onye na-eleda onye agbataobi ya anya na-emehie,

ma onye na-emere ndị ogbenye ebere ka ihe ga-agara nke ọma.

22 Ndị na-ezube ihe ọjọọ, ha ọ naghị akpafu?

Ma ndị na-ezube ihe ọma na-achọta ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.

23 Ịrụsị ọrụ ike na-eweta uru;

ma oke okwu na-eweta ụkpa.

24 Okpueze nke ndị maara ihe bụ akụnụba ha,

ma enweghị uche nke ndị nzuzu na-emepụta naanị ihe na-abaghị uru.

25 Onye na-agba akaebe eziokwu na-anapụta ndụ mmadụ,

ma onye akaebe ụgha bụ onye aghụghọ.

26 Onye ọbụla na-atụ egwu Onyenwe anyị nwere ebe mgbaba;

nye ụmụ ya ọ ga-abụkwa ebe ize ndụ.

27 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ isi iyi nke ndụ;

nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.

28 Otuto onye eze na-enwe dabeere nʼọnụọgụgụ ndị ọ na-achị,

e wezuga ndị ọ na-achị, eze enweghị ugwu ọbụla.

29 Onye na-enwe ndidi nwere ọtụtụ nghọta,

ma onye obi ọkụ na-egosi enweghị uche ya.

30 Ndụ dị jụụ na-eme ka ụbọchị mmadụ dị ogologo;

ekworo na-eme ka o ree ure.

31 Onye ọbụla na-emegbu onye ogbenye na-elelị Chineke kere ha anya,

ma onye na-emere onye ogbenye ebere na-asọpụrụ Chineke.

32 Ọ bụladị nʼọnwụ onye ezi omume nwere ebe mgbaba nʼime Chineke,

ma ndị ajọ omume na-ala nʼiyi, mgbe mbibi bịara.

33 Nʼobi onye nwere nghọta ka amamihe na-anọgide,

ma ọ bụladị nʼetiti ndị nzuzu ọ na-eme ka amara ya.

34 Ezi omume na-ewuli mba elu,

ma mmehie bụ ihe ihere nye ndị ọbụla.

35 Eze na-aṅụrị ọṅụ nʼihi odibo maara ihe;

ma odibo na-eweta ihere na-akpali oke iwe ya.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-