Publicidade

Provérbios 29

1 Onye a na-abara mba mgbe niile ma ọ naghị anata ndụmọdụ,

nʼotu ntabi anya ka a ga-etipịa ya, ọ gaghị ekulikwa ọzọ.

2 Mgbe ndị ezi omume nọ nʼọchịchị, ndị a na-achị na-aṅụrị ọṅụ,

ma ha na-asụ ude mgbe onye ajọ omume na-achị.

3 Nwoke hụrụ amamihe nʼanya na-eme ka nna ṅụrịa,

ma onye bụ enyi ụmụ nwanyị akwụna, na-ala akụnụba ya nʼiyi.

4 Eze na-achị nʼeziokwu na-ewetara obodo ya ọganihu,

ma nke na-achọ ngarị na-ala ya nʼiyi.

5 Onye ahụ ji ire ụtọ na-aja onye agbataobi ya mma

bụ ọnya ka ọ na-esiri ya.

6 Ọ bụ onye ajọ omume siri ọnya ka ọnya ahụ na-ama.

Ma ndị ezi omume na-anọrọ onwe ha na-agụ egwu ọṅụ.

7 Onye ezi omume na-etinye anya nʼihe banyere ikpe ziri ezi nke ndị ogbenye,

ma ụdị echiche ahụ adịghị abata ndị ajọ omume nʼobi.

8 Ndị nzuzu na-amalite ọgụ ebe niile,

ma ndị nwere uche na-agbalịsị ike ime ka udo dị.

9 Ọ bụrụ na onye maara ihe esoro onye nzuzu gaa nʼụlọikpe,

onye nzuzu ga-ewe iwe ọkụ, mee mkpọtụ, kwaa emo ma udo agaghị adị.

10 Ndị ndụ ha na-ebi bụ ime ihe ike na-akpọ onye eziokwu asị,

ha na-achọsikwa ike ụzọ ha ga-esi gbuo onye ndụ ya ziri ezi.

11 Onye nzuzu na-egosi oke iwe ya,

ma onye nwere uche na-ejide onwe ya na-emekwa ka mmụọ ya dajụọ.

12 Ọ bụrụ na onye na-achị achị aṅaa ntị nʼokwu ụgha,

ndị niile na-ejere ya ozi ga-aghọ ndị ajọ omume.

13 Ogbenye na ọgaranya bụ otu na nke a:

ọ bụ Onyenwe anyị na-eme ka ha jiri anya ha na-ahụ ụzọ.

14 Ọ bụrụ na eze esite nʼizi ezi kpee ndị ogbenye ikpe,

a ga-eme ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.

15 Ịba mba na iti nwantakịrị ihe na-enye aka mee ka ọ bụrụ ezi nwa,

ma nwantakịrị a na-adịghị adụ ọdụ na-eme nne ya ihe ihere.

16 Mgbe ndị na-emebi iwu na-aga nʼihu, njehie na-aba ụba nʼetiti ndị a na-achị achị,

ma ndị ezi omume ga-eguzo hụ ọdịda ha.

17 Dọọ nwa gị aka na ntị, ndụ ya ga-enye obi gị udo na ọṅụ.

Ọ gaghị emekwa ka ihere mee gị.

18 Obodo na-adịghị atụ egwu Chineke bụ obodo na-adịghị agazi nʼusoro,

ma ọṅụ na-adịrị obodo ahụ na-edebe ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu.

19 Ọ bụghị naanị okwu ọnụ ka e ji adọ ndị na-eje ozi aka na ntị,

nʼihi na ha nwere ike ghọta ma ha ga-ajụ ime ihe ị chọrọ.

20 Olileanya dịrị onye nzuzu

karịa onye ahụ na-adịghị echezi echiche tupu o kwuo okwu.

21 Ị malite na mbụ na-emezi onye na-ejere gị ozi,

ọ ga-emesịa chọọ ka i meere ya dịka nwa gị.

22 Onye na-ewe iwe na-akpali ọgụ,

onye na-ewe iwe ọkụ na-eme ọtụtụ mmehie.

23 Nganga mmadụ na-eme ka ọ daa,

ma mmadụ ahụ dị umeala nʼobi ga-eweta nsọpụrụ.

24 Ndị ọbụla na-enyere ndị ohi aka bụ ndị iro nke ndụ ha,

a na-edu ha nʼịṅụ iyi, ma ha adịghị agba akaebe.

25 Ịtụ egwu mmadụ bụ ihe ịma nʼọnya,

ma onye ọbụla na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọ nʼudo.

26 Ị chọrọ ikpe ziri ezi?

Elela onye ikpe anya nʼihu, kama gwa Onyenwe anyị maka ya.

27 Onye ezi omume na-akpọ ajọ omume asị;

ndị na-emebi iwu na-akpọ onye ndụ ya ziri ezi asị.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-