Publicidade

Provérbios 8

Ọkpụkpọ oku amamihe na-akpọ

1 Ọ bụ na amamihe adịghị eti mkpu?

Ọ bụ na nghọta anaghị eme ka olu ya daa ụda?

2 Ọ na-eguzo nʼelu ebe niile dị elu nʼokporoụzọ,

nʼagbata ụzọ niile.

3 Nʼọnụ ụzọ nke obodo niile

na nʼọnụ ụzọ ụlọ niile ka ọ nọ na-eti mkpu,

4 ọ na-asị, "Ụmụ mmadụ geenụ m ntị;

ọ bụ unu ndị dị ndụ ka m na-agwa okwu.

5 Unu ndị na-enweghị uche, nweenụ uche zuruoke;

unu ndị nzuzu, nweenụ nghọta.

6 Geenụ m ntị, nʼihi na enwere m okwu dị mkpa m ga-agwa unu;

Ihe ọbụla m kwuru bụ ihe ziri ezi,

7 Ọnụ m na-ekwu eziokwu

nʼihi na akpọrọ m okwu ụgha asị.

8 Ndụmọdụ m zuruoke, ọ dịkwa mma.

Ihe ọjọọ ọbụla adịghị nʼime ya.

9 Nʼebe onye nwetara nghọta nọ, okwu m doro anya;

nʼebe ndị chọtara ihe ọmụma nọ, okwu m ziri ezi.

10 Họrọ ịdọ aka na ntị m karịa ọlaọcha

họrọkwa ihe ọmụma karịa ọlaedo dị ezi mma."

11 Amamihe dị mkpa karịa nkume rubi dị oke ọnụahịa.

Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji tụnyere ya.

12 "Mụ onwe m bụ amamihe na ezi nghọta na-agakọta.

Enwere m ọmụma ihe na ezi izuzu.

13 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị.

Akpọrọ m nganga na mpako,

omume ọjọọ nakwa okwu gbagọrọ agbagọ asị.

14 Ndụmọdụ na ezi nghọta bụ nke m;

enwekwara m ọmụma ihe na ike.

15 Site na m ka ndị eze ji achị,

ọ bụ m na-eme ka ndị na-achị achị mee iwu ziri ezi.

16 Site na m ka ndị eze ji achị

bụ ndịisi niile na-achị nʼụwa.

17 Ndị niile hụrụ m nʼanya ka m na-ahụ nʼanya.

Ndị niile na-achọ m aghakwaghị ịchọta m.

18 Ana m ekenye ụba na nsọpụrụ,

na ikpe ziri ezi na ezi omume.

19 Onyinye m na-enye dị mma karịa ọlaọcha,

ọ karịkwara ọlaedo.

20 Ana m aga ije nʼụzọ ezi omume,

nʼokporoụzọ ikpe ziri ezi.

21 Ndị niile hụrụ m nʼanya, na-eketa akụnụba.

Ana m emejupụtakwa ụlọakụ ha.

22 "Onyenwe anyị kpụrụ m dịka mmalite ụzọ ya,

tupu o bido ike ihe ọbụla ọzọ.

23 Site nʼebighị ebi gara aga ka m dị;

adịkwa m adị tupu e kee ụwa.

24 Anọ m na-adị tupu e kee ogbu mmiri,

tupu isi iyi ọbụla agbapụta mmiri nʼelu ụwa,

25 tupu e kee ugwu ukwu

na ugwu nta.

26 E, amụọla m rịị tupu Chineke ekee ụwa

na osisi niile, na aja niile dị nʼime ya.

27 Anọ m ya mgbe o doziri mbara eluigwe nʼọnọdụ ya,

mgbe ọ tụsara ha nʼelu ogbu mmiri niile;

28 mgbe o hiwere mbara eluigwe,

mgbe o mere ka isi iyi niile nke ogbu mmiri dị ike,

29 mgbe ọ kpara oke nye osimiri ebe ọ ga-akwụsị,

ka mmiri ya ghara ịgafe iwu ya,

mgbe ọ kara akara ebe a tọrọ ntọala nke ụwa.

30 Oge ahụ niile ka m na-anọ nʼakụkụ ya dịka onye ǹka.

Ihe banyere m na-atọkwa ya ụtọ;

ana m egwuri egwu nʼihu ya.

31 Ihe niile o kere tọkwara m ụtọ,

ụwa niile na ụmụ mmadụ!

32 "Nʼihi ya, ụmụ m ndị ikom, geenụ m ntị;

nʼihi na ndị niile na-eso ụzọ m na-enwe ọṅụ.

33 Gee ntị na ndụmọdụ m ka ị bụrụ onye maara ihe,

agbakụtakwala ndụmọdụ m azụ.

34 Ngọzị dịrị mmadụ ahụ na-aṅa ntị nʼokwu m,

onye na-anọ na nche nʼọnụ ụzọ m ụbọchị niile,

onye na-anọ na-echere m nʼọnụ ụzọ ụlọ m;

35 nʼihi na onye ọbụla chọtara m chọtara ndụ;

ọ natakwala ihuọma nʼebe Onyenwe anyị nọ.

36 Ma onye na-enweghị ike chọta m na-emerụ onwe ya ahụ;

ndị niile kpọrọ m asị hụrụ ọnwụ nʼanya."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-