Publicidade

Provérbios 19

1 Ọ ka mma ịbụ ogbenye onye kwesiri ntụkwasị obi

karịa ịbụ onye nzuzu na-ekwu okwu ụgha mgbe niile.

2 Arịrịọ nke na-enweghị ihe ọmụma adịghị mma

otu a kwa onye ụkwụ ya na-eme ngwa na-ejehie ụzọ.

3 Enweghị uche nke mmadụ na-eduba ha nʼọghọm,

ma obi ha na-ewe iwe dị ukwuu megide Onyenwe anyị.

4 Onye nwere ego na-enwe ọtụtụ ndị enyi,

ma ọ na-ara ahụ ka ndị enyi onye ogbenye nọgide.

5 Onye na-agba ama ụgha ga-ata ahụhụ,

ụzọ onye na-ekupụ ụgha dịka ume ka a ga-achọpụtakwa.

6 Ọtụtụ mmadụ na-achọ ihuọma nʼebe onye na-achị achị nọ,

otu a kwa, mmadụ niile na-agbalị ịbụ enyi onye na-agbasa aka ya na-enye onyinye.

7 Ebe ọ bụ na ụmụnne onye ogbenye na-akpọ ya asị,

gịnịkwa ka ndị enyi ya ga-eme?

Mgbalị ya niile ịrịọ ha arịrịọ

ezughị ime ka ha nọgide.

8 Onye na-enweta amamihe hụrụ ndụ nʼanya,

onye na-edebekwa nghọta na-enweta ọganihu.

9 Onyeama ụgha aghaghị ịta ahụhụ,

onye ọbụla na-ekwupụ okwu ụgha dịka mmiri ga-ala nʼiyi.

10 Onye nzuzu ekwesighị ibi dịka ọgaranya;

ohu ekwesịkwaghị ịchị ụmụ eze.

11 Ezi uche mmadụ nwere na-amụpụta ndidi;

ọ bụkwa nkwanye ugwu nye onye nʼadịghị agụ mkparị a na-akparị ya.

12 Iwe eze dị ka mbigbọ nke ọdụm.

Ma obi ụtọ ya dị ka igirigi nʼelu ahịhịa ndụ.

13 Nwa nzuzu bụ ịla nʼiyi nke nna,

nwunye na-ese okwu dị ka mmiri ọtụtụ na-atụ kpọm, kpọm,

mgbe niile nʼelu ụlọ puru epu.

14 Ụlọ dị iche iche na akụ bụ ihe nketa a na-anata nʼaka ndị nne na nna,

ma nwunye nwere uche na nghọta na-esite naanị nʼaka Onyenwe anyị.

15 Umengwụ na-akpata oke ịrahụ ụra,

onye ọfọ ogori ka agụụ na-agụ.

16 Onye na-edebe iwu Chineke na-enweta ndụ,

ma onye na-akpọ ya asị na-anwụ.

17 Onye ọbụla na-egosi ndị ogbenye obi ebere na-ebinye Onyenwe anyị ihe,

ọ ga-akwụghachi ha nʼihi ihe ọma ha mere.

18 Dọọ nwa gị aka na ntị mgbe ọ ka dị na nwantakịrị nʼihi na oge ahụ ka olileanya dị.

Ma i meghị otu a, ọ bụ ndụ ya ka ị na-emebi.

19 Onye oke iwe ga-anata nra so ya,

nʼihi na ọ bụrụ na ị napụta ya, ị ga-anapụtakwa ya ọzọ.

20 Gee ntị na ndụmọdụ a na-enye gị, nabata ịdọ aka na ntị.

Nʼikpeazụ, ị ga-abụ onye maara ihe.

21 Ọtụtụ atụmatụ dị nʼobi mmadụ;

maọbụ uche Onyenwe anyị ga-emezu.

22 Obi ebere mmadụ na-eme ka a na-achọsi ya ike.

Ọ ka mma ịbụ ogbenye karịa ịbụ mmadụ nke eziokwu ọbụla na-adịghị nʼọnụ ya.

23 Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-eweta ndụ na ọṅụ,

na nchebe site nʼihe mmerụ ahụ.

24 Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri,

ọ gaghị eweghachi ya ọ bụladị tinye nʼọnụ ya.

25 Tie onye na-akwa emo ihe, onye na-enweghị uche ga-aghọ onye nwere ezi uche,

baara onye nwere nghọta mba, ha ga-enweta ihe ọmụma.

26 Ọ bụ nwa ahụ na-eweta ihere ga-ezu nne na nna ya ohi,

maọbụ chụpụ ha site nʼụlọ ya.

27 Nwa m ọ bụrụ na ị hapụ ige ntị na ntụziaka m,

ị ga-esi nʼokwu ihe ọmụma kpafuo.

28 Onyeama ụgha na-akwa ikpe ziri ezi emo.

Ọnụ nke onye ajọ omume na-eloda ajọ ihe.

29 Ndị na-akwa emo na ndị nzuzu ga-ata ahụhụ;

a ga-etikwa ha ihe.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-