Publicidade

Provérbios 28

1 Ndị ajọ omume na-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha,

ma ndị ezi omume na-enwe ntụkwasị obi dịka ọdụm.

2 Mgbe njehie dị nʼobodo dị ọtụtụ, o nwere ọtụtụ ndịisi,

ma onyeisi nwere ezi nghọta na ihe ọmụma ga-eme ka udo na-adịgide ogologo oge.

3 Onye na-achị achị nke na-emegbu ndị ogbenye,

bụ mmiri ozuzo nke na-azachapụ ihe niile mee ka nri ghara ịdị.

4 Onye na-adịghị asọpụrụ iwu na-eto ndị ajọ omume,

ma ndị na-edebe ihe iwu kwuru na-ebu agha megide ha.

5 Ndị ajọ omume adịghị aghọta uru ikpe ziri ezi bara,

ma ndị na-eso Onyenwe anyị na-aghọta ihe bụ uru ya.

6 Ọ kaara gị mma ịbụ nwa ogbenye na onye eziokwu

karịa na ị bụ ọgaranya na eze aghụghọ.

7 Ụmụ okorobịa nwere nghọta na-eme ihe iwu kwuru,

ma nwa nke ya na ndị oke oriri bụ enyi na-emenye nna ya ihere.

8 Onye na-eme ka akụ ya baa ụba site na ịnara ụma maọbụ ọmụrụnwa nʼaka onye ogbenye,

na-ekpokọta ya nye onye ọzọ, onye na-emere ndị ogbenye ebere.

9 Onye na-ewezuga ntị ya site nʼebe iwu m dị,

ọ bụladị ekpere ha bụ ihe arụ.

10 Onye ọbụla na-eduhie ndị ziri ezi nʼụzọ ihe ọjọọ,

ga-adaba nʼọnya ahụ ha onwe ha gbara,

ma ndị na-enweghị ịta ụta ga-anata ezi ihe nketa.

11 Nʼanya nke onwe ya, onye ọgaranya na-agụ onwe ya dịka onye maara ihe,

ma nʼezie, onye ogbenye nwere nghọta na-enyochapụta amaghị ihe nke onye ọgaranya.

12 Mgbe ihe na-agara ndị ezi omume nke ọma, onye ọbụla na-aṅụrị ọṅụ,

ma onye ọbụla na-ezo onwe ya mgbe onye na-emebi iwu na-aga nʼihu.

13 Onye na-ezo mmehie ya agaghị enwe ọganihu na ndụ ya.

Ma onye na-ekwupụta mmehie ya hapụkwa ha, ka a ga-emere ebere.

14 Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ na-atụ egwu Chineke,

ma onye na-enupu isi na-etinye onwe ya na nsogbu.

15 Dịka ọdụm na-agbọ ụja maọbụ nne bịa na-achụ mmadụ

otu a ka onye ọchịchị ọjọọ nke na-achị ndị na-enweghị ike dị.

16 Ọ bụ naanị eze na-amaghị ihe ga-akpagbu ndị ya;

ma eze ga-achị ogologo oge bụ eze kpọrọ iri ngarị asị.

17 Obi ogbu mmadụ ga na-ama ya ikpe

ruo ala mmụọ.

Ka onye ọbụla ghara inyere ya aka.

18 Onye na-eje ije na-enweghị ịta ụta ka a na-echebe,

ma onye ụzọ ya gbagọrọ agbagọ ga-adaba nʼolulu.

19 Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba,

ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, ụbịam ga-eju ya afọ.

20 Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị,

ma nwoke ahụ na-achọ ịbụ ọgaranya ngwangwa aghaghị inweta ntaramahụhụ.

21 Ile mmadụ anya nʼihu nʼoge ikpe jọgburu onwe ya.

Ma ụfọdụ ndị ikpe na-eme ihe na-ezighị ezi, ọ bụladị, nʼihi iberibe nri.

22 Onye aka ntagide ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịghọ ọgaranya

amaghị na ụkpa nọ na-eche ya.

23 Onye ọbụla na-abara mmadụ mba, nʼikpeazụ ga-enweta amara

karịa onye ahụ na-aja mmadụ ibe ya mma ire ụtọ.

24 Nwoke na-ezu nne na nna ya ohi ma na-asịkwa,

"Olee ihe ọjọọ dị na ya?"

Onye dị otu a bụ nnọọ enyi ndị mbibi.

25 Ndị oke ọchịchọ na-akpali ise okwu,

ma ndị na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-enwe ọganihu.

26 Nwoke ahụ na-atụkwasị onwe ya obi bụ onye nzuzu!

Ma ndị na-agbaso amamihe Chineke, aka adịghị akpa ha.

27 Ọ bụrụ na i nye ogbenye, a ga-egboro gị mkpa gị.

Ma ọbụbụ ọnụ dịrị ndị ahụ na-ekpuchi anya ha nʼebe ndị ogbenye nọ.

28 Mgbe ndị ajọ omume na-aga nʼihu, ndị ezi omume na-ezo onwe ha,

ma mgbe ha nʼala nʼiyi, ndị ezi omume nʼaba ụba.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-