Publicidade

Provérbios 15

1 Ọsịsa okwu dị nro na-eme ka iwe na ọnụma laa azụ;

ma okwu ike na-akpali iwe.

2 Ire onye maara ihe na-eme ka ihe ọmụma mụbaa,

ma ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu enweghị uche.

3 Onyenwe anyị na-ahụzu ihe niile,

anya ya dịkwa nʼahụ ndị ọma na ndị ọjọọ.

4 Okwu dị nwayọọ na-eweta ndụ na ume;

ma nkwutọ na-eweta ịda mba.

5 Naanị onye nzuzu na-akpọ ndụmọdụ ndị mụrụ ya ihe efu;

ma onye ọbụla na-ege ntị nye mgbanwe na-ezipụta ezi uche.

6 Ụlọ ndị ezi omume na-ejupụta nʼọtụtụ akụ,

ma akụ ndị na-emebi iwu na-ewetara ha nsogbu.

7 Egbugbere ọnụ onye maara ihe na-agbasa ihe ọmụma,

ma obi ndị nzuzu ezighị ezi.

8 Onyenwe anyị na-akpọ aja ndị ajọ omume asị,

ma ekpere ndị ndụ ha ziri ezi na-atọ ya ụtọ.

9 Onyenwe anyị kpọrọ ụzọ ndị na-emebi iwu asị,

ma ndị na-achụso ezi omume ka ọ na-ahụ nʼanya.

10 Oke ịdọ aka na ntị na-echere ndị na-ahapụ ụzọ.

Onye kpọrọ ịba mba asị ga-anwụ ọnwụ.

11 Onyenwe anyị mazuru ihe omimi niile nke ọnwụ na ọkụ ala mmụọ;

ọ ga-esikwa aṅaa ghara ịma obi ụmụ mmadụ?

12 Ọ dịghị atọ onye na-akwa emo ụtọ ma a baara ya mba,

ya mere ọ dịghị ejekwuru onye maara ihe.

13 Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ihu dị mma.

Ihu gbarụrụ agbarụ na-egosi obi nwere ihe mwute.

14 Obi nwere nghọta na-achọ ịmata ihe,

ma ọnụ onye nzuzu na-azụ onwe ya nʼokwu na-abaghị uru.

15 Ndụ onye ogbenye jupụtara nnọọ na mgbalị,

ma ndị nwere udo nʼobi na-eri oriri mgbe niile.

16 Ọ dị mma inwe akụnụba dị nta ma bụrụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị,

karịa inwe akụ ma nọrọ na nsogbu.

17 Ọ ka mma bụ oke nri akwụkwọ nri nta nke nwere ịhụnanya,

karịa ehi buru ibu a zụziri azụzi nke ịkpọ asị dị na ya.

18 Onye iwe ọkụ na-amalite ọgụ;

ma onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ na-eme ka ịlụ ọgụ kwụsị.

19 Eji ogwu gbochie ụzọ onye umengwụ,

ma ụzọ onye omume ya ziri ezi bụ ụzọ dị larịị.

20 Nwa nke maara ihe na-eme ka obi tọọ nna ya ụtọ,

ma onye nzuzu na-eleda nne ya anya.

21 Onye na-enweghị uche na-aṅụrị ọṅụ nʼime amaghị ihe ya,

ma onye nwere nghọta na-aga ije nʼụzọ ziri ezi.

22 Nzube na-enweghị ndụmọdụ na-ama afọ nʼala,

ma ndị ndụmọdụ dịrị ọtụtụ ọganihu ga-adị.

23 Ọṅụ na-adị mgbe mmadụ natara ọsịsa dị mma,

okwu e kwuru nʼoge o kwesiri dị mma.

24 Ụzọ ndụ na-agbago elu nye onye nwere uche,

iwezuga ha site na-ịgbada nʼala mmụọ dị nʼokpuru.

25 Onyenwe anyị na-adọtu ma na-adọrisi ụlọ nke onye mpako,

ma oke ala nke nwanyị di ya nwụrụ ka ọ na-elekọta.

26 Echiche ọjọọ niile nke ndị na-emebi iwu ka Onyenwe anyị kpọrọ asị

ma okwu ebere niile dị ọcha nʼanya ya.

27 Onye anya ukwu na-ewetara ezinaụlọ ya nsogbu.

Ma onye kpọrọ iri ngarị asị ga-adị ndụ.

28 Obi onye ezi omume na-atule ọsịsa ya

ma ọnụ nke onye ajọ omume na-asọpụta ihe ọjọọ dị iche iche.

29 Onyenwe anyị anọghị ndị na-emebi iwu nso;

ma ọ na-anụ ekpere ndị ezi omume.

30 Ihu ọchị na-eweta obi ụtọ.

Akụkọ ọma na-enyekwa ọkpụkpụ ndụ.

31 Onye na-ege ntị nye ịba mba nke na-enye ndụ

ga-esoro ndị amamihe nọrọ.

32 Onye jụrụ ịdọ aka na ntị kpọrọ onwe ya asị

ma onye ọbụla naara ndụmọdụ nwere nghọta.

33 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ amamihe na-abịa site nʼịdọ aka na ntị;

onye dị umeala nʼobi ga-anata ugwu na nsọpụrụ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-