Publicidade

Lamentações 4

1 Lee ka ọlaedo si chuo echu.

Lee ka ọlaedo makarịsịrị mma si gbanwee ghọọ ihe na-amakwaghị mma.

Nkume niile dị oke ọnụahịa nke ebe nsọ bụ

ndị a ghasara nʼisi okporoụzọ niile.

2 Lee ka ụmụ ndị ikom Zayọn dị oke ọnụahịa,

ndị dị oke ọnụahịa na mbụ dịka ọlaedo a nụchara anụcha,

si dịrị ugbu a dịka ite aja

nke ọkpụ ite kpụrụ.

3 Ọ bụladị ụmụ nkịta ọhịa na-eji ara ha

azụ ụmụ ha,

ma ndị a aghọọla ndị na-enweghị obi ebere;

ha aghọọla enyi nnụnụ nke na-ebi nʼọzara.

4 Lee na ire nwa ọhụrụ na-arapara nʼakpo ọnụ ya

nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ.

Ụmụntakịrị na-arịọkwa ka e nye ha nri,

ma o nweghị onye na-enye ha nri ahụ.

5 Ndị ahụ naara eri ihe ụtọ dị iche iche

tọgbọrọ nʼefu ugbu a nʼokporoụzọ.

Ndị ahụ a zụrụ iyi uwe uhie uhie

nọ ugbu a na-edina nʼebe a na-ekpofu ahịhịa.

6 Ahụhụ dịịrị ndị m dị ukwuu

karịa ahụhụ nke bịakwasịrị Sọdọm.

Nʼihi na ọ bụ nʼotu ntabi anya ka a kwatụrụ ya.

Ọ dịkwaghị onye bịara nyere ya aka.

7 Ụmụ ndị eze ha na-egbuke karịa akụmmiri igwe,

ha na-acha ọcha chakarịa mmiri ara ehi.

Anụ ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ dịka nkume rubi dị oke ọnụahịa;

ha makwara mma ile anya dịka nkume safaia, bụ nkume dị oke ọnụahịa.

8 Ma ugbu a, ha na-eji nji karịa unyi.

A naghị amatakwa ha ma a hụ ha nʼezi.

Anụ ahụ ha araparala nʼọkpụkpụ ha;

ọ kpọnwụọla dịka a ga-asị na ọ bụ osisi kpọrọ nkụ.

9 Ọnọdụ ndị e ji mma agha gbuo ka mma

karịa ọnọdụ ndị nwụrụ site nʼụnwụ,

ndị agụụ gụgburu, ndị ji nwayọọ nwayọọ nwụọ

nʼihi nri nke na-adịghị nʼubi.

10 Aka ha ka ndị inyom ndị ahụ nwere obi ebere

ji gbuo ụmụ ha, sie ha.

Ụmụ ha ghọọrọ ha nri

nʼoge ahụ a lara ndị m nʼiyi.

11 Onyenwe anyị emeela ka nrubiga oke nke iwe ya pụta ìhè;

ọ wụpụla iwe ya dị ọkụ.

O sunyela ọkụ na Zayọn,

nke rechapụrụ ntọala ya niile.

12 Ndị eze nke ụwa ekwetaghị;

otu a kwa, ndị ụwa niile ekwetakwaghị

na ndị iro nwere ike

si nʼọnụ ụzọ ama banye nʼime Jerusalem.

13 Ma ihe ndị a mere nʼihi mmehie ndị amụma ya,

na nʼihi ajọ omume nke ndị nchụaja ya,

ndị wụsiri ọbara

ndị ezi omume nọ nʼetiti ya.

14 Ugbu a, ha na-asọ isi nʼokporoụzọ niile,

dịka ndị kpuru ìsì.

Ha ejirila ọbara merụọ onwe ha.

O nwekwaghị onye na-agbalị ịbịaru ha nso ịmetụ uwe ha aka.

15 Ndị mmadụ na-eti mkpu na-asị ha, "Sitenụ nʼebe anyị nọ wezuga onwe unu! Unu rụrụ arụ!

Wezuganụ onwe unu, unu emetụkwala anyị aka!"

Mgbe ha gbapụrụ ọsọ bido na-awagharị,

ndị nọ na mba dị iche iche na-asị ha,

"O kwesighị ka ha nọrọkwa nʼebe a."

16 Onyenwe anyị nʼonwe ya achụsaala ha.

Ọ gaghị agụnyekwa ha.

Ọ dịkwaghị ndị na-asọpụrụ onye nchụaja,

ọ dịkwaghị ndị na-emere ndị okenye amara.

17 Nke ka nke, anya agbaala anyị ọchịchịrị,

ebe anyị nọ na-elepụ anya nʼefu maka enyemaka.

Ọ bụ site nʼụlọ elu nche ka anyị nọ na-elepụ anya, na-ele anya

maka ọbịbịa mba ahụ na-enweghị ike bịa zọpụta anyị.

18 Ndị mmadụ na-esogharị anyị ebe niile anyị jere,

nʼihi ya anyị enweghị ike jegharịakwa nʼokporoụzọ anyị.

Ọgwụgwụ anyị adịla nso, a pụkwara ịgụta ụbọchị ole fọdụụrụ anyị,

tupu ọgwụgwụ anyị eruo.

19 Ndị na-achụ anyị ọsọ na-agbasi ọsọ ike

karịa ugo na-efe na mbara eluigwe.

Ha chụgharịrị anyị nʼelu ugwu niile,

nọrọkwa nʼọzara zoo onwe ha na-eche anyị.

20 Ume ndụ anyị, nke Onyenwe anyị tere mmanụ,

ka ha jidere nʼọnya ha.

Anyị naara eche na anyị ga-ebi nʼokpuru ndo ya,

nʼetiti mba dị iche iche.

21 Ṅụrịa ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị ada Edọm,

onye nke bi nʼala Uz.

Ma a ga-emesịakwa nye gị iko ahụ.

Ị ga-esitekwa na ya ṅụọ ihe ọṅụṅụ ṅụjụbiga afọ oke. A ga-agbakwa gị ọtọ.

22 Gị ada Zayọn, ahụhụ gị agwụsịala;

Ọ gaghị emekwa ka i jee biri ogologo oge na mba ọzọ.

Kama, ọ ga-ata gị ahụhụ nʼihi mmehie gị, gị, ada Edọm,

kpugheekwa ajọ omume gị niile.

Veja também

Publicidade
Lamentações
Ver todos os capítulos de Lamentações
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-