Publicidade

Lamentações 5

1 Onyenwe anyị, biko, cheta ihe niile dakwasịrị anyị;

leekwa anya ka ị hụrụ ọnọdụ ihere anyị.

2 E werela ihe nketa anyị nyefee ndị ọbịa nʼaka,

werekwa ebe obibi anyị nyefee nʼaka ndị mba ọzọ.

3 Anyị aghọọla ụmụ mgbei, na ndị na-enweghị nna.

Nne anyị ha dị ka ndị inyom di ha nwụrụ.

4 Anyị na-akwụ ụgwọ nʼihi mmiri anyị na-aṅụ.

Ọ bụkwa ego ka anyị ji azụ nkụ.

5 Agbanyeghị na anyị nya yoku nʼolu, anyị bụ ndị a na-adọgbu nʼọrụ,

ike agwụla anyị, enyeghị anyị izuike.

6 Anyị weere onwe anyị nyefee ndị Ijipt na ndị Asịrịa nʼaka

nʼihi inweta nri ga-ezuru anyị.

7 Nna anyị ha mehiere, ma ha anwụọla.

Ma ọ bụ anyị na-anata ntaramahụhụ kwesiri ịbụ nke ha.

8 Ndị bụ ohu na-achị anyị.

Ọ dịghị onye anyị nwere nke ga-anapụta anyị site nʼaka ha.

9 Anyị ji ndụ anyị nʼaka mgbe anyị na-achọ inweta ihe anyị ga-eri,

nʼihi mma agha nke dị nʼọzara.

10 Anụ ahụ anyị dị ọkụ dịka ite ọkụ,

na-amakwa jijiji nʼihi agụụ.

11 Emerụọla ndị inyom dị na Zayọn,

ha na ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke niile dị nʼobodo dị iche iche nke Juda.

12 Akwụgbuola ụmụ eze site nʼikegide aka ha nʼelu;

a dịghị enyekwa ndị okenye nsọpụrụ.

13 Ụmụ okorobịa na-adọgbu onwe ha nʼọrụ na nkume ịkwọ nri,

ụmụntakịrị ndị nwoke na-asụkwa ngọngọ nʼokpuru ọtụtụ nkụ.

14 Ndị okenye adịghịkwa anọ nʼọnụ ụzọ ama,

ụmụ okorobịa akwụsịkwala ịkpọ ụbọ akwara ha.

15 Ọṅụ adịghịkwa nʼobi anyị;

ite egwu anyị aghọọlara anyị ịnọ ọnọdụ iru ụjụ.

16 Okpueze esitela nʼisi anyị dapụ.

Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na anyị emehiela.

17 Nʼihi nke a, obi anyị na-ada mba,

nʼihi ihe ndị a ka anya anyị na-agba ọchịchịrị.

18 Nʼihi ugwu Zayọn nke tọgbọrọ nʼefu,

nke ghọrọ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị.

19 Gị, Onyenwe anyị, na-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi.

Ocheeze gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

20 Gịnị mere i ji na-echezọ anyị kpamkpam?

Gịnị mere i ji gbakụta anyị azụ ogologo ụbọchị ndị a niile?

21 Mee ka anyị lọghachikwute gị, Onyenwe anyị, ka anyị si otu a lọtakwa;

gbanwee ụbọchị anyị ka ọ dị ọhụrụ dịka na mgbe ochie,

22 ma ọ bụghị na ị jụla anyị kpamkpam

na-eweso anyị iwe nke ukwu.

Veja também

Publicidade
Lamentações
Ver todos os capítulos de Lamentações
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-