Publicidade

Lamentações 1

1 Lee ka obodo ahụ nke ndị ya dị ọtụtụ

si bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu!

Lee ka o si ghọọ nwanyị di ya nwụrụ,

bụ obodo ahụ a maara aha ya nʼetiti mba niile.

Lee ka onye naara abụ eze nwanyị nʼetiti ala niile a na-achị achị

si ghọọ ohu.

2 Ọ na-akwasị akwa ike nʼabalị,

anya mmiri na-asọdakwa na nti ya,

nʼetiti ndị ahụ niile hụrụ ya nʼanya,

ọ dịghị onye na-akasị ya obi.

Ndị enyi ya niile aghọgbuola ya;

ha niile aghọọla ndị iro ya.

3 Juda ejeela biri nʼala ọzọ,

mgbe o siri nʼọnọdụ mweda nʼala na ndọgbu nʼọrụ pụta.

Ọ na-ebi nʼetiti mba dị iche iche,

ma ọ chọtaghị ebe izuike ọbụla.

Nʼetiti nhụju anya ya

ndị niile na-achụ ya ọsọ achụkwutela ya.

4 Okporoụzọ niile e si eje Zayọn na-eru ụjụ,

nʼihi na ọ dịghị onye na-abịakwa na mmemme ndị ahụ a kara aka.

Ọnụ ụzọ ama ya niile atọgbọrọla nʼefu,

ndị nchụaja ya na-asụ ude,

ụmụ agbọghọ nọ nʼọnọdụ mwute,

ya onwe ya nọkwa nʼọnọdụ dị ilu.

5 Ndị iro ya aghọọla ndị na-achị ya;

ndị iro ya nọ nʼahụ udo.

Nʼihi na Onyenwe anyị emekpaala ya ahụ,

nʼihi ịba ụba nke njehie ya niile.

E burula ụmụntakịrị ya bulaa mba ọzọ,

dịka ndị a dọtara nʼagha.

6 Ịma mma niile

esitela nʼahụ ada Zayọn pụọ.

Ụmụ eze ya dị ka ele

nke na-enweghị ike ịchọta ebe ịta nri.

Nʼihi adịghị ike ha,

ha esitela nʼihu ndị na-achụ ha ọsọ gbalaga.

7 Nʼụbọchị ndị ahụ niile e wedara ya nʼala,

Jerusalem echetala akụ ndị ahụ niile bụ nke ya na mgbe ochie.

Jerusalem echetala ha nʼụbọchị ndị ahụ niile ọ na-awagharị.

Mgbe ndị ya dabara nʼaka ndị iro ya,

o nweghị onye inyeaka ha hụrụ.

Nʼoge ahụ, ndị iro ya hụrụ ọnọdụ

ya, chịa ya ọchị.

8 Jerusalem emehiela nke ukwu,

nʼezie, ọ ghọọla ihe rụrụ arụ.

Ndị ahụ niile na-asọpụrụ ya na mbụ elelịala ya anya,

nʼihi na ha ahụla ọtọ ya.

Ya onwe ya kwa na-asụ ude,

ma chigharịakwa azụ.

9 Ịrụ arụ ya pụtara ihe, ọ bụladị nʼuwe ya.

Ọ dịkwaghị mgbe o chere echiche banyere ihe dị na-eche ya nʼoge dị nʼihu.

Lee ka o si daa, dasie ike,

ma ọ dịghị onye bịara kasịe ya obi.

"Onyenwe anyị, lee nsogbu m niile.

Lee ka ndị iro si merie m."

10 Onye iro agbasaala aka ya

chịkọtaa akụ ya niile.

O ji anya ya hụ ka mba ndị ọzọ dị iche iche

si bata ebe nsọ ya.

Ndị ahụ na-ekwesighị ịbata

bụ ndị batara nʼebe nzukọ gị.

11 Ndị ya niile na-asụ ude

mgbe ha na-achọ ihe ha ga-eri.

Ha na-ewere ihe ha nwere nye nʼihi oriri,

ime ka ha nwee ike dịrị ndụ.

"Onyenwe anyị, lee, ma tuleekwa ihe ndị a niile,

nʼihi na abụrụla m onye a na-elelị."

12 "Ọ bụ na ọ dịghị emetụ unu nʼobi, unu ndị niile na-esi ebe a na-agafe?

Legharịanụ anya unu ka unu hụrụ.

O nwere ahụhụ dịka ahụhụ m,

nke e mere ka ọ bịakwasị m,

bụ nke Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị m,

nʼụbọchị ọ na-ewe iwe ya dị ọkụ?

13 "O si nʼelu zite ọkụ,

e, o zitere ọkụ nke na-ere nʼime ọkpụkpụ m.

Ọ gbasara ụgbụ nʼebe ụkwụ m ga-esi gafee,

meekwa ka m laghachi azụ.

O mere ka m bụrụ ihe tọgbọrọ nʼefu,

onye na-ada mba ogologo ụbọchị niile.

14 "Ọ na-eleru anya na mmehie m niile;

jiri aka ya na-akpa ha dịka ụdọ.

A nyakwasịla ya nʼolu m.

Onyenwe anyị emeela ka ike gwụsịa m.

O werela m nyefee nʼaka ndị ahụ

m na-apụghị iguzogide.

15 "Onyenwe anyị ajụla

ndị niile bụ dike nʼagha nọ nʼetiti m.

Ọ kpọkuola usuu ndị agha ka ha bịa buo agha megide m,

ka ha bịa gwepịa ụmụ okorobịa m niile.

Nʼebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị ya

ka Onyenwe anyị zọchara ada Juda na-amaghị nwoke.

16 "Ọ bụ nke a mere m ji akwa akwa.

Ọ bụ ya mekwara anya mmiri ji ju m anya.

O nweghị onye nkasiobi ọbụla nọ m nso;

o nwekwaghị onye ga-akpọghachi mkpụrụobi m.

Ụmụ m atọgbọla nʼefu,

nʼihi na onye iro emeriela."

17 Lee ka Zayọn si gbasapụ aka ya

ma o nweghị onye nkasiobi o nwere.

Onyenwe anyị enyela iwu banyere Jekọb

na ndị agbataobi ya ga-aghọ ndị iro ya.

Jerusalem aghọkwaala

ihe rụrụ arụ nʼetiti ha.

18 "Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume.

Ọ bụ mụ onwe m nupuru isi nʼiwu ya.

Geenụ ntị unu ndị niile,

leenụ anya nʼụdị ahụhụ dakwasịrị m.

A dọtala ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa m niile nʼagha

buru ha jee mba ọzọ.

19 "Akpọkuru m ndị mụ na ha dị na mma,

ma ha ghọgburu m.

Ndị nchụaja m na ndị okenye m

nwụrụ nʼime obodo

mgbe ha nọ na-achọta nri

ha ga-eji debe onwe ha ndụ.

20 "Lee, Onyenwe anyị, ka m si bụrụ onye ahụhụ dị ukwuu dakwasịrị.

Ime anụ ahụ m na-anụ ọkụ,

obi m kwa enweghị izuike nʼime m

nʼihi na onye nnupu isi dị ukwuu ka m bụ.

Nʼezi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji mee ka mmadụ gbara aka nwa.

Ma nʼime ụlọ, ọ bụ naanị ọnwụ dị ya.

21 "Ndị mmadụ anụla olu ịsụ ude m,

ma o nweghị onye bịara ịkasị m obi.

Ndị iro m niile anụla akụkọ ihe ọjọọ dakwasịrị m,

ma ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ihe i mere ka ọ bịakwasị m.

Mee ka ụbọchị ahụ i kara aka bịa,

nke ga-eme ka ha dịrị ka m dị.

22 "Kwere ka ihe ọjọọ niile ha na-eme bịa nʼihu gị.

Mesokwa ha mmeso

dịka i si mesoo m

nʼihi mmehie niile nke m.

Nʼihi na ịsụ ude m dị ọtụtụ,

ana m adakwa mba nʼobi m."

Veja também

Publicidade
Lamentações
Ver todos os capítulos de Lamentações
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-