amor de Deus
O amor de Deus é a maior realidade do universo. Ele nos amou com amor eterno, incondicional e sacrificial — e nada no mundo pode nos separar desse amor.
Amor eterno
Deus amou o mundo de tal maneira que deu o seu Filho. Seu amor é de eternidade a eternidade — nunca falha.
Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.
Ma lee ka ịhụnanya Chineke siri pụta ìhè! Mgbe anyị ka nọrịị na-eme mmehie, Kraịst nwụrụ nʼihi anyị.
Nʼihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, na ọnwụ, maọbụ ndụ, maọbụ ndị mmụọ ozi, maọbụ mmụọ dị iche iche ndị na-achị nʼelu na nʼụwa, maọbụ ike ọchịchịrị dị iche iche, maọbụ ihe dị ugbu a, maọbụ ihe gaje ịbịa, maọbụ ịdị elu, maọbụ ịdị omimi, ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ e kere eke, agaghị enwe ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Chineke, nke dị nʼime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.
Onyenwe anyị mere ka anyị hụ ya anya site nʼebe dị anya, na-asị,
"Ọ bụ ịhụnanya nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi ka m ji hụ gị nʼanya;
Ọ bụ ebere nke na-adịghị agbanwe ka m ji dọta unu nso.
Abụ ekele
Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma.
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Onyenwe anyị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara.
Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya.
Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara,
iwe adịghị ewe gị ngwangwa, i jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.
Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ,
aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma.
Natureza do amor divino
Deus é amor. O amor é paciente, benigno. O amor do Pai nos adota como filhos e nos transforma à sua imagem.
Chineke bụ ịhụnanya
Ndị m hụrụ nʼanya, o kwesiri ka anyị hụrịtaa onwe anyị nʼanya, nʼihi na ịhụnanya na-esi nʼebe Chineke nọ abịa. Onye ọbụla nwere ịhụnanya bụ onye amụrụ site na Chineke, ọ makwara Chineke. Onye na-enweghị ịhụnanya amaghị Chineke, nʼihi na Chineke bụ ịhụnanya.
E siri otu a mee ka ịhụnanya Chineke nʼebe anyị nọ pụta ìhè: Chineke zitere naanị otu Ọkpara ya nʼụwa ka anyị nwee ndụ site na ya. Nke a bụ ihe a na-akpọ ịhụnanya, ọ bụghị na anyị hụrụ Chineke nʼanya kama na ọ hụrụ anyị nʼanya ma zite Ọkpara ya dịka aja nke juru ya obi maka mmehie niile anyị. Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ bụ na Chineke si otu a hụ anyị nʼanya, anyị kwesiri ịhụrịta onwe anyị nʼanya.
Anyị maara ma kwerekwa nʼịhụnanya Chineke nwere nʼebe anyị nọ.
Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụlakwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nʼime Chineke. Chineke nʼonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a.
Anyị hụrụ ya nʼanya nʼihi na o buru ụzọ hụ anyị nʼanya.
Ibi ndụ dị ka ụmụ Kraịst
Lee ụdị oke ịhụnanya nke Nna ahụ nwere nʼebe anyị nọ, na-aga akpọ anyị ụmụ Chineke. Nʼezie, nke a bụ ihe anyị bụ. Ihe mere na ụwa amaghị anyị bụ nʼihi na ọ maghị ya.
Ndị enyi m hụrụ nʼanya, anaghị m edere unu ihe gbasara iwu ọhụrụ, kama ọ bụ otu iwu ochie ahụ, nke na-adị site na mbụ. Iwu ochie a bụ nke e ziri unu ozi banyere ya. Ma otu ọ dị, ana m edere unu iwu ọhụrụ, nke bụ eziokwu nʼime ya na nʼime unu. Nʼihi na ọchịchịrị na-agafe, ezi ìhè ebidola ịchawapụta.
Nke a bụ ịhụnanya Chineke, na anyị ga-edebe iwu ya. Iwu ya adịghịkwa arọ.
Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachiobi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu.
Expressões do amor de Deus
O Senhor nos ama com alegria e canta sobre nós. Queni a mim vem, amará; e quem me ama, o Pai o amará.
Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị,
ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri.
Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị;
nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba,
kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ."
Ndị niile hụrụ m nʼanya ka m na-ahụ nʼanya.
Ndị niile na-achọ m aghakwaghị ịchọta m.
Ebe ị bụ ihe dị oke ọnụahịa nʼanya m,
ebe ọ bụkwa na m hụrụ gị nʼanya,
aga m ewere ndị mmadụ nye nʼihi ịgbapụta gị.
Aga m ebibi ndụ ndị mmadụ nʼihi ichebe gị ndụ.
O Chineke, nʼime ụlọnsọ ukwuu gị,
ka anyị nọ na-atụgharị uche nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ.
Mee ka ịhụnanya gị na-adịgidere ndị maara gị,
ka ezi omume gị na-adịgidekwara ndị ziri ezi nʼobi.
Ọ bụkwaghị mụ onwe m na-adị ndụ ugbu a, kama ọ bụ Kraịst na-adị ndụ ya nʼime m. Ndụ ahụ nke m na-adị ugbu a nʼanụ ahụ m bụ nke m na-adị nʼihi okwukwe m nwere nʼime Ọkpara Chineke, onye hụrụ m nʼanya, ma werekwa onwe ya nye nʼihi m.
Chineke onye jupụtara nʼobi ebere, maka oke ịhụnanya o nwere nʼebe anyị nọ, mere ka anyị soro Kraịst dịrị ndụ ọzọ; ọ bụladị mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nʼime ajọ omume. Ọ bụ site nʼamara ya ka e ji zọpụta unu.
Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ịhụnanya Chineke, na mmekọ nke Mmụọ Nsọ dịnyere unu niile.
Ka Onyenwe anyị duzie obi unu ịghọta ịhụnanya Chineke ya na ụdị ntachiobi Kraịst nwere.