Publicidade

Isaías 12

Abụ Otuto

1 Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwu sị,

"Aga m eto gị Onyenwe anyị.

Ọ bụ ezie na ị wesara m iwe,

ma ugbu a, iwe gị adajụọla;

ị kasịkwara m obi.

2 Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m;

aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m.

Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m,

ọ ghọrọla m onye nzọpụta."

3 Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri

site nʼolulu mmiri nke nzọpụta.

4 Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị,

"Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya;

meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ;

kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu.

5 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube.

Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ.

6 Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ, bụkwaa abụ.

Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel. dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-