Pular para o conteúdo
Publicidade

Aịzaya 18

Amụma e buru banyere Kush

1 Ahụhụ ga-adịrị ala ahụ a na-anụ ụzụ ọtụtụ nku nʼime ya,18:1 Maọbụ, ụzụ igurube

ala ahụ dị nʼofe iyi ukwu niile nke Kush.18:1 Nʼoge Aịzaya onye amụma, ndị Kush nʼachị Ijipt. Mgbe ha chọrọ ibuso ndị Asịrịa agha, ha rịọrọ ndị Palestin ka ha nyere ha aka.

2 Ala nke na-ezipụ ndị ozi ya site nʼosimiri,

bụ ndị na-eji ụgbọ mmiri papịrọs nʼaga nʼelu mmiri.

Gaanụ ngwangwa, unu ndị ozi dị nkọ

gakwuru ndị toro ogologo nke ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ,

gakwuru ndị a na-atụ egwu nʼebe niile,

mba na-achọ okwu na ụka, nke na-azọpịakwa azọpịa,

ndị osimiri dị iche iche kewara ala ha.

3 Unu niile bi nʼelu ụwa dum,

na unu ndị nwere ebe obibi nʼụwa, geenụ m ntị.

Mgbe e buliri ọkọlọtọ elu nʼelu ugwu niile,

lee anya;

mgbe a fụrụ opi ike,

gee ntị.

4 Nʼihi na ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị gwara m,

"Aga m anọ jụụ na-elepụ anya site nʼebe obibi m,

dịka mgbe igirigi na-ada nʼoge okpomọkụ nke owuwe ihe ubi,

na dịka anyanwụ si acha nʼoge okpomọkụ."

5 Nʼihi na tupu oge owuwe ihe ubi eruo, mgbe ifuru dapụsịrị,

mgbe okoko na-aghọ mkpụrụ vaịnị nke ka na-achata achata,

ga-eji mma oge gbuchapụ ụmụ alaka ya,

ga-egbutu ma wezugakwa alaka ndị ahụ na-awasa awasa.

6 A ga-ahapụ ozu ndị agha ha

ka anụ ufe nke ugwu na ụmụ anụ ọhịa rie ha.

Ụmụ nnụnụ ga-eri anụ ha nʼoge okpomọkụ,

ma ụmụ anụ ọhịa ga-eri ha nʼoge oyi.

7 Ma mgbe ahụ, a ga-ewetara Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile onyinye dị iche iche,

site na ndị toro ogologo, ndị ahụ na-akwọ mụrụmụrụ,

site na ndị a na-atụ egwu nʼebe niile,

bụ mba ndị okwu na ụka,18:7 Maọbụ, asụsụ dị iche nke na-azọpịakwa azọpịa,

ndị osimiri dị iche iche kewara ala ha.

A ga-eweta onyinye18:7 Abụ 72:10; Aịz 16:2; Zef 3:10 a nʼUgwu Zayọn, nʼebe ahụ a na-akpọku aha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também