Publicidade

Isaías 6

Ọkpụkpọ Aịzaya

1 Nʼafọ ahụ, mgbe eze bụ Ụzaya nwụrụ, ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọ nʼocheeze ya dị oke elu. Ọnụ ọnụ ala uwe ya jupụtara ụlọnsọ ukwuu ya. 2 Ndị na-erugharị nʼelu ocheeze ya bụ ndị mmụọ ozi a na-akpọ seraf, ndị nwere nku isii. Ha ji nku ha abụọ kpuchie ihu ha; abụọ ka ha ji kpuchie ụkwụ ha, abụọ nke fọdụrụ ka ha ji na-efegharị. 3 Ha na-abụrịtara onwe ha abụ, sị,

"Nsọ, Nsọ, Nsọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile dị.

Ụwa niile jupụtara nʼebube ya."

4 Nʼihi ụda olu ha, ọnụ ụzọ na mgbidi ụlọnsọ mara jijiji, ụlọ ahụ jupụtara nʼanwụrụ ọkụ.

5 Etiri m mkpu akwa sị. "Ewoo! Onye nwụrụ anwụ ka m bụ, nʼihi na onye mmehie ka m bụ, egbugbere ọnụ m bụ egbugbere ọnụ rụrụ arụ; ọ bụkwa nʼetiti ndị egbugbere ọnụ ha rụrụ arụ ka m bi. Ugbu a, ejirila m anya m hụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Eze ukwu ahụ!"

6 Mgbe ahụ, otu nʼime seraf ndị ahụ sitere nʼebe ọ nọ fekwute m, were mkpa gụta otu icheku dị ọkụ site nʼebe ịchụ aja. 7 O weere icheku ọkụ ahụ sọtụ m nʼọnụ, sị m, "Ugbu a, a gụọla gị dịka onye dị ọcha, nʼihi na icheku a emetụla gị nʼọnụ. A gbagharakwala gị mmehie gị niile."

8 Mgbe ahụ, anụrụ m olu Onyenwe anyị ka ọ na-ajụ, "Onye ka m ga-eziga? Onye ga-ejekwara anyị?"

Asịrị m, "Lee m, ziga m."

9 Ọ siri, "Gaa gwa ndị a sị,

" ‘Na-anụnụ, ma unu aghọtala,

na-elenụ anya ma unu ahụla.

10 Mee ka obi ndị a maa abụba, dịkwa arọ,

mee ka ntị ha kpọchie,

mechiekwa anya ha.

Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ,

jiri ntị ha nụ ihe,

jirikwa obi ha ghọta,

ma chigharịa bụrụ ndị a gwọrọ."

11 Ma ekwuru m sị, "Onyenwe m, ọ bụ ruo ole mgbe?"

Ọ zara,

"Ọ bụ ruo mgbe obodo ha tọgbọrọ nʼefu,

mgbe ọ na-adịghị onye ga-afọdụ nʼime ya;

mgbe ụlọ obibi ha niile ga-atọgbọrọ nʼefu,

mgbe e bibisịrị ala ubi ha niile.

12 Ọ bụ ruo mgbe Onyenwe anyị zigara onye ọbụla gaa ebe dị anya,

ala niile atọgbọkwara nʼefu.

13 Ma ọ bụrụkwa na otu ụzọ nʼime ụzọ iri nʼime ha niile afọdụ nʼala a,

a ga-eme ka ọ laa nʼiyi.

Ma dịka osisi terebint na osisi ook

na-ahapụ ogwe mgbe e gbujiri ha,

ya mere mkpụrụ nsọ ahụ ga-abụ ogwe osisi nʼala ahụ."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-