Publicidade

Isaías 24

Mbibi Onyenwe anyị ga-ebibi ụwa

1 Lee, na Onyenwe anyị na-aga ịgba ụwa ọtọ.

Ọ na-aga ime ka ọ tọgbọrọ nʼefu.

Ọ na-aga ibibicha ihe dị nʼelu ụwa,

mee ka ndị bi nʼime ya gbasasịa.

2 Otu ihe ahụ ka ọ ga-eme mmadụ niile,

nye ndị nchụaja ma ndị mmadụ,

nye ụmụodibo na ndị nwe ha,

nye ndị odibo nwanyị, na nne ha ukwu,

nye ndị na-azụ ihe a na-ere ere, na ndị na-ere ihe orire;

nye ndị na-ebinye ego, na ndị a na-ebinye ego;

nye ndị ji ụgwọ, na ndị e ji ụgwọ.

3 O nweghị onye ọ ga-ahapụ.

A ga-agba ala ahụ ọtọ kwakọrọ ihe niile dị nʼime ya.

Nke a ka Onyenwe anyị kwuru.

4 Ala atakọchaala, ma kpọnwụọ.

Ụwa ahụjuola anya ma kpọnwụọ.

Eluigwe na nʼụwa so na-ahụjukwa anya.

5 Ụwa bụ ihe e merụrụ emerụ site na ndị ya;

ha enupula isi nʼiwu niile,

ha agbanweela ụkpụrụ ya,

mebie ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ.

6 Ya mere, ọbụbụ ọnụ na-eripịa ụwa;

ndị bi nʼime ya aghaghị ịnatakwa ikpe ọmụma ha.

Ya mere ndị niile bi nʼụwa na-ere ọkụ,

ọ bụkwa naanị mmadụ ole na ole fọdụrụ.

7 Mmanya ọhụrụ atakọrọla, osisi vaịnị akpọnwụọkwala,

nʼihi ya, ndị ahụ niile ọṅụ na-ejupụta nʼobi ha na-asụ ude.

8 Egwu ụtọ niile akwụsịla,

mkpọtụ nke ndị na-eri oriri dị iche iche akwụsịla.

Ụda obi ụtọ nke ụbọ akwara adịghịkwa.

9 Abụ obi ụtọ nke ya na mmanya na-eso adịghịkwa;

mmanya dị ike na-akụzi ilu nʼọnụ ndị na-aṅụ ya.

10 Obodo atọgbọrọla nʼefu;

a kpọchichaala ọnụ ụzọ e si abata ụlọ ndị mmadụ ka onye ọbụla ghara inwe ike ịbata.

11 Igwe ndị mmadụ nọ nʼokporoụzọ na-eti mkpu nʼihi na mmanya adịghịkwa.

Ọṅụ adịghịkwa,

otu a, ewezugakwala obi ụtọ site nʼụwa.

12 Obodo ahụ aghọọla mkpọmkpọ ebe,

e tikpọọla ọnụ ụzọ ya niile.

13 Otu a ka ọ ga-adị nʼụwa niile,

nakwa nʼetiti mba niile,

dịka mgbe a na-etitusi mkpụrụ dị nʼelu osisi oliv,

maọbụ mgbe ahapụrụ ụfọdụ mkpụrụ grepu nʼelu osisi mgbe a ghọchasịrị ihe ubi.

14 Ma ndị niile fọdụrụ ga-eti mkpu ọṅụ;

ndị nọ nʼọdịda anyanwụ ga-eto ịdị ebube nke Onyenwe anyị.

15 Ndị nọ nʼọwụwa anyanwụ ga-enye Onyenwe anyị otuto.

Ndị bi nʼala nta niile osimiri gbara gburugburu

ga-ebuli aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel elu.

16 Anyị ga-anụ abụ ọma dị iche iche site na nsọtụ ụwa.

Ha ga-abụ abụ na-asị, "Otuto dịrị Onye ezi omume ahụ."

Ma nʼezie, o nweghị olileanya dịịrị m. "Lee ka anụ ahụ m si na-akpọnwụ!

Ahụhụ dịrị m!

Nʼihi na ndị ahụ na-ekwesighị ntụkwasị obi ereela anyị.

Akpịrị ego ha ka ha ji refuo anyị."

17 Ihe egwu, na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya dị na-eche unu,

unu ndị niile bi nʼụwa.

18 Onye ọbụla nʼime unu nke gbara ọsọ nʼihi ihe egwu

ga-adaba nʼolulu;

onye ọbụla sitekwara nʼolulu rịpụta

ga-azọnye ụkwụ ya nʼọnya.

Nʼihi na mmiri nke ịla nʼiyi esitela na mbara eluigwe na-ezokwasị unu.

Ntọala ụwa na-amakwa jijiji.

19 Ụwa adapịasịala;

ụwa agbawasịala;

e jirila oke ike nugharịa ụwa.

20 Ụwa ga-adagbugharị dịka onye mmanya na-egbu.

Ọ ga-aṅagharịkwa dịka osisi nke oke ifufe na-efegharị.

Ọ daala, ọ pụghịkwa ibili ọzọ,

nʼihi na njehie ya dị arọ na-anyịdakwa ya.

21 Nʼụbọchị ahụ,

Onyenwe anyị ga-ata ike usuu niile dị nʼeluigwe ahụhụ.

Ọ ga-atakwa ndị eze niile nʼụwa ahụhụ.

22 A ga-achịkọta ha dịka ndị mkpọrọ,

kpọchiekwa ha nʼụlọ mkpọrọ

nʼebe ahụ ka ha ga-anọgide,

tutu ruo mgbe a ga-ekpe ha ikpe.

23 Ọnwa ga-ada mba,

anwụ ka ihere ga-eme;

nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-achị

nʼugwu Zayọn nakwa nʼime Jerusalem,

ọ ga-eji oke ebube chịa nʼihu ndị okenye ya.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-