Publicidade

Isaías 10

1 Ahụhụ na-adịrị ndị niile na-atụpụta iwu na-ezighị ezi;

ndị niile na-atụpụta iwu mmegbu,

2 iji napụ ndị ogbenye ihe ruru ha

nakwa ịnapụ ndị m a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi,

na-emekwa ka ụmụ nwanyị di ha nwụrụ bụrụ anụ oriri ha

na izunara ụmụ na-enweghị nne na nna ihe ha nwere.

3 Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-abịa ileta unu?

Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-eweta ịla nʼiyi, nke ga-esi nʼebe dị anya bịara unu?

Onye ka unu ga-agbakwuru maka enyemaka?

Ọ bụ ebe ka unu ga-ahapụ akụ unu niile?

4 Mba, ọ dịghị ihe ga-afọdụ; karịa na a ga-egbu unu nʼihu ọgụ,

maọbụ dọkpụrụ unu dịka ndị mkpọrọ.

Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,

aka ya ka setịpụkwara esetipụ.

Ikpe ọmụma Chineke nke dịrị Asịrịa

5 "Ahụhụ ga-adịrị Asịrịa onye bụ mkpara nke iwe m.

Nʼaka ya ka mkpọ nke ọnụma m dị.

6 Ana m ezipu ya imegide mba a na-amaghị Chineke,

m na-eziga ya imegide ndị na-akpasu m iwe,

ka ha kwakọrọ ihe nkwata nʼagha ha, pụnakwara ha ụfọdụ nʼike,

nakwa ịzọtọ ndị ha niile nʼala dịka apịtị nke okporoụzọ.

7 Ma ọ bụghị ihe a ka o zubere,

nke a abụghị ihe ọ na-eche nʼobi ya;

o zubere ịla ndị m nʼiyi,

na ibibi ọtụtụ mba dị iche iche.

8 Ọ sịrị, ‘Ndị ọchịagha m niile ha abụghị ndị eze?’

9 ‘Ọnọdụ Kalno ọ dịghị ka nke Kakemish?

Hamat ọ dịghị ka Apad;

Sameria ọ dịghịkwa ka Damaskọs?

10 Dịka aka m si chịkọta alaeze dị iche iche nke ọtụtụ arụsị,

alaeze dị iche iche nke arụsị apịrị apị ha karịrị nke Jerusalem na Sameria.

11 Ọ bụ na m agaghị emekwa Jerusalem na arụsị ya niile apịrị apị

dịka m mere Sameria na arụsị ya niile?’ "

12 Mgbe Onyenwe anyị rụsịrị ọrụ ya niile megide ugwu Zayọn na Jerusalem, ọ ga-asị, "Aga m ata eze ndị Asịrịa ahụhụ nʼihi nganga nke obi ha, na ịnya isi nke anya mpako ya. 13 Nʼihi na ọ na-asị,

" ‘Ọ bụ site nʼike aka m, ka m ji mee nke a,

ọ bụkwa na amamihe m, nʼihi na m nwere nghọta.

Ewezugara m oke ala mba niile dị iche iche,

apụnara m ha akụ ha niile;

dịka onye dị ike, e wedara m ndị eze ha niile nʼokpuru m.

14 Dịka mmadụ si agbatị aka nʼime akwụ nnụnụ,

otu a ka m chịkọtara akụnụba mba dị iche iche,

dịka mmadụ si achịkọta akwa ahapụrụ ahapụ,

otu a ka m chịkọtara mba ụwa niile;

Ọ dịghị onye megharịrị otu nku,

maọbụ saghee ọnụ ya ime mkpọtụ!’ "

15 Anyụike ọ ga-anya isi sị na ya dị ukwuu karịa onye na-eji ya awa nkụ,

ka ọ bụ mma nkwọ, ọ ga-aja onwe ya karịa onye na-eji ya akpọwa ihe?

Dịka a ga-asị na okporo igwe ga-ebuli onye na-eweli ya elu,

maọbụ mkpọ ọ ga-efegharị onye na-abụghị osisi.

16 Nʼihi ya, Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,

ga-ezitere ndị agha gị mara abụba ihe otiti;

ọ ga-akwanye ọkụ nʼokpuru ihe ngosipụta nke ịdị ebube ya

dịka ire ọkụ nke na-ere ere.

17 Ìhè nke Izrel, ga-aghọ ọkụ,

Onye nsọ ha, ga-aghọkwa ire ọkụ nke ga-ala ihe niile nʼiyi.

Nʼotu abalị ka ọ ga-erechapụ

ogwu niile na uke niile ọkụ.

18 A ga-ala ịma mma nke oke ọhịa ya na ala ya na-amị ezi mkpụrụ

nʼiyi kpamkpam,

dịka mgbe ọrịa na-ala mmadụ nʼiyi.

19 Naanị osisi ole na ole ga-afọdụ,

ha ga-adị ntakịrị ruo na nwantakịrị nwere ike gụọ ha ọnụ.

Ndị ga-afọdụ nʼIzrel

20 Nʼụbọchị ahụ, ndị fọdụrụ nʼala Izrel,

na ndị fọdụrụ ndụ nʼụlọ Jekọb,

agaghịkwa adabere nʼonye ahụ

tidara ha,

kama ha ga-adabere naanị na Onyenwe anyị,

Onye nsọ nke Izrel.

21 Ndị fọdụrụ ga-alọghachi, bụ ndị Nke Jekọb fọdụrụ

ga-alọghachikwute Chineke dị ukwuu.

22 Ọ bụ ezie na ndị gị Izrel dị ukwuu dịka aja dị nʼakụkụ osimiri,

ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ga-alọghachi.

A kabiela ịla nʼiyi,

nke dị oke ukwuu ya na ezi omume.

23 E, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpebiela

na ọ ga-ebibi ala ahụ niile.

24 Ya mere, ihe a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, sịrị,

"Unu ndị m, ndị bi na Zayọn,

unu atụkwala ndị Asịrịa egwu

bụ ndị na-eti unu mkpara igwe,

na-ewelikwa mkpọ megide unu dịka ndị Ijipt mere.

25 Nʼoge na-adịghị anya, iwe m ga-adajụ nʼebe unu nọ,

ma ọ ga-ebili megide ha, laakwa ha nʼiyi."

26 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji ụtarị tie ha ihe

dịka o sịrị tie ndị Midia ihe na nkume Oreb.

Ọ ga-eweli mkpanaka ya nʼelu oke osimiri,

ọ ga-eweli ya dịka o mere nʼIjipt.

27 Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka unu nwere onwe

unu site nʼebe ndị Asịrịa nọ.

Ụdọ igwe ha kenyere unu nʼolu ka m ga-adọbisi,

wezuga ibu arọ unu.

28 Ha erutela Ayịat;

ugbu a, ha nọ na Migrọn.

Ha na-edokọta ngwa agha ha na Mikmash.

29 Lee ka ha na-agabiga ụzọ warawara;

ha ekpebiela ịnọ ọnọdụ abalị na Geba!

Ndị Rema na-ama jijiji,

obodo Gibea nke bụ obodo Sọl agbapụla ọsọ ndụ.

30 Tienụ mkpu akwa unu ada Galim,

geenụ ntị unu ndị Laisha!

Leenụ ihe na-adanyere gị, gị Anatot!

31 Lee na Madmena nọ nʼọsọ,

ndị Gebim na-ezo onwe ha.

32 Ndị iro akwụsịla nʼobodo Nob taa;

ha na-atụ ugwu Zayọn

na Jerusalem aka,

na-ekwere ya nʼisi.

33 Lee Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,

ga-eji oke ike gbutuo ngalaba osisi niile.

Ọ ga-egbutukwa osisi ndị dị elu,

meekwa ka ndị toro ogologo dị ala.

34 Ya onwe ya ga-egbutu ha niile ka e si eji anyụike egbutu osisi dị nʼoke ọhịa.

Lebanọn ga-adakwa nʼihu Onye ahụ dị ike dịka osisi dị nʼoke ọhịa si ada.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-