Publicidade

Isaías 60

Ebube nke Zayọn

1 "Bilie, mụkee, nʼihi na ìhè gị abịala,

ebube Onyenwe anyị awaakwala nʼahụ gị dịka anyanwụ.

2 Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa niile,

oke ọchịchịrị na-ekpuchi ndị niile bi nʼụwa,

ma Onyenwe anyị ga-awa dịka anyanwụ nʼahụ gị

ebube ya ga-achakwa ka ihe nʼebe i nọ.

3 Mba niile dị iche iche ga-abịakwute ìhè gị,

ndị eze niile ga-abịaru mmụke nke ọwụwa gị.

4 "Welienụ anya unu abụọ elu legharịa gburugburu unu,

ha niile na-ezukọta na-abịakwute gị;

ụmụ gị ndị ikom na-esi nʼebe dị anya bịa,

ụmụ gị ndị inyom ka a ga-ekukwa nʼụkwụ.

5 Mgbe ahụ, ị ga-elepụ anya ma chakee,

obi gị ga-atọ gị ụtọ, saa mbara nʼihi ọṅụ,

nʼihi na akụ niile nke osimiri ka a ga-ewebatara gị,

akụnụba nke ọtụtụ mba ga-abịara gị.

6 Ọtụtụ igwe ịnyịnya kamel nke si Midia

na Efaa ga-ejupụta nʼala gị,

ma ndị sikwa nʼobodo Sheba

ga-ebutere gị ọlaedo na ụda na-esi isi ụtọ.

Ha ga-ekwusakwa otuto Onyenwe anyị.

7 A ga-enye gị igwe ewu na atụrụ niile nke ndị Keda.

Ebule niile nke Nebaiot ga-abụ nke gị.

A ga-anabata ha dịka onyinye nʼelu ebe ịchụ aja m.

Aga m edozi ụlọnsọ m dị ebube, mee ya ka ọ maa mma karịa.

8 "Olee ndị bụ ndị a na-efegharị dịka igwe ojii,

ndị na-efegharị dịka ụmụ nduru na-efeba nʼakwụ ha?

9 Nʼezie, mụ ka ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu na-echere;

ụgbọ niile nke Tashish ga-ebukwa ụzọ,

na-ebughachi ụmụ gị site nʼebe dị anya,

ha na ọlaọcha na ọlaedo ha niile.

Inye Onyenwe anyị bụ Chineke gị nsọpụrụ,

Onye nsọ nke Izrel,

nʼihi na ọ jirila ịma mma gọzie gị.

10 "Ndị mba ọzọ ga-abịa wuziere unu mgbidi unu niile.

Ndị na-achị achị na ndị eze ha niile ga-ejere unu ozi.

Ọ bụ ezie na m tikpọrọ gị nʼiwe m,

ma site nʼamara m, aga m emere gị ebere.

11 Ọnụ ụzọ ama gị ga-eghe oghe oge niile

site nʼụtụtụ ruo nʼụtụtụ,

ịnabata akụ niile si na mba dị iche iche.

A ga-edurukwa ndị eze dị iche iche bata nʼime ya nʼọnọdụ ndị a dọtara nʼagha.

12 Mba ọbụla jụrụ ijere gị ozi ga-ala nʼiyi;

a ga-ekpochapụ ha.

13 "Otuto niile na ịma mma niile nke Lebanọn ga-abụ nke gị.

Osisi junipa, na osisi fịa, na osisi junipa, na osisi saipres,

ka a ga-eji chọọ ụlọnsọ m mma.

Aga m emekwa ka ebube jupụta nʼebe ahụ ụkwụ m na-adị mgbe niile.

14 Ụmụ ndị na-emegbu gị ga-abịa kpọọ isiala nye gị.

Ndị ahụ niile na-elelị gị ga-abịa daa nʼala nʼihu gị sutu ụkwụ gị ọnụ.

Ha ga-akpọ Jerusalem, Obodo Onyenwe anyị,

Zayọn nke Onye nsọ Izrel.

15 "Ọ bụ ezie na ọ dị mgbe ị bụ onye a kpọrọ asị, onye a na-emegbu,

onye mmadụ niile na-eweda nʼala,

ma ugbu a, ị ga-ama mma ruo ebighị ebi;

ị ga-abụ ihe na-ewetara ọgbọ niile nke ụwa ọṅụ, nʼihi na otu a ka m ga-eme gị.

16 Ị ga-aṅụ mmiri ara nke mba dị iche iche,

ọ bụkwa ara ndị eze ka a ga-eji zuo gị.

Mgbe ahụ, ị ga-amata nʼezie na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nzọpụta gị

na Onye mgbapụta gị, Onye dị ike nke Jekọb.

17 Nʼọnọdụ bronz, aga m eweta ọlaedo,

nʼọnọdụ igwe aga m eweta ọlaọcha.

Nʼọnọdụ osisi, ọ ga-abụ ọla,

nʼọnọdụ nkume, ọ ga-abụ igwe.

M ga-eme ka udo bụrụ ndị nlekọta gị

ezi omume ga-abụ onye na-achị gị.

18 Ihe ike agaghị adịkwa nʼala gị ọzọ.

Agha niile ga-akwụsị, mbibi na ịla nʼiyi agaghị adịkwa.

Mgbidi gị ga-aghọ Nzọpụta,

ị ga-akpọkwa ọnụ ụzọ ama gị niile Otuto.

19 Anyanwụ agaghị abụkwara gị ìhè nʼehihie ọzọ,

maọbụ maramara nke ọnwa amụkwasị gị ihe,

nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ga-abụrụ gị ìhè ruo ebighị ebi,

Chineke gị ga-abụkwa ebube gị.

20 Anwụ gị agaghị ada ada,

ọnwa gị agaghị akwụsịkwa ịcha;

nʼihi na Onyenwe anyị ga-abụrụ gị ìhè ụbọchị gị niile,

iru ụjụ gị niile ga-agabigakwa.

21 Mgbe ahụ, ndị gị niile ga-abụ ndị ezi omume,

ha ga-enwetakwa ala ahụ ruo ebighị ebi.

Ha bụ ome nke m kụrụ,

bụ ọrụ aka m,

ime ka ịma mma m pụta ìhè.

22 Ezinaụlọ dị nta ga-aba ụba ghọọ obodo,

mba nta ga-aghọ obodo buru ibu.

Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,

ga-eme ka ha niile mezuo ọsịịsọ nʼoge ya."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-