Publicidade

Isaías 34

Ahụhụ dịrị mba niile

1 Bịanụ nso, unu ndị mba niile, ṅaa ntị.

Geenụ ntị, unu mba niile nke ụwa.

Ka ụwa na ihe niile dị nʼime ya,

na ihe niile na-esi nʼime ya apụta nụrụ.

2 Nʼihi na Onyenwe anyị na-eweso mba niile nke ụwa iwe,

iwe ya dị ọkụ megide ndị agha ha niile.

Ọ ga-ala ha nʼiyi kpamkpam,

nyefee ha nʼaka ndị ga-egbu ha.

3 Ndị ha e gburu egbu ka a ga-atụpụ.

Ozu ha ga-esikwa isi.

Ugwu niile ga-ejupụta nʼọbara ha.

4 Nʼoge ahụ, kpakpando niile nke eluigwe ga-agbaze,

a ga-apịakọtakwa mbara eluigwe dịka akwụkwọ,

kpakpando niile ga-ada

dịka ahịhịa osisi vaịnị kpọrọ nkụ,

dịka mkpụrụ osisi fiig chakpọrọ achakpọ.

5 Nʼihi na mma agha m arụchaala ọrụ ya nʼeluigwe,

lezie anya ihe gaje ime, ọ ga-adakwasị Edọm,

ndị m mara ikpe mbibi.

6 Mma agha Onyenwe anyị jupụtara nʼọbara,

abụba kpuchikwara ya,

ọbara ụmụ atụrụ na mkpi

na abụba sitere nʼakụrụ ebule

nʼihi na Onyenwe anyị nwere ịchụ aja na Bozra.

O nwekwara oke ogbugbu ga-adị nʼala Edọm.

7 Oke ehi ọhịa ga-esokwa ha daa,

ha na oke ehi ukwu na oke ehi nta.

Ala ga-ejupụta nʼọbara ha.

Uzuzu nke obodo ahụ ga-amịkọrọ ọbara ha.

8 Nʼihi na Onyenwe anyị nwere ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ.

Ọ bụ afọ ịkwụghachi Edọm ihe ha mere Zayọn.

9 Isi iyi ndị Edọm niile ga-agbanwe gbajie ojii,

uzuzu dị nʼala ga na-ere ọkụ dịka sọlfọ (ntụ ọkụ),

ala ahụ niile ga-enwuru ọkụ dị ka unyi ojii.

10 Ọ gaghị anyụ anyụ nʼabalị maọbụ nʼehihie;

anwụrụ ọkụ ya ga na-ala nʼelu ruo ebighị ebi.

Ala ahụ ga-atọgbọrọ nʼefu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ;

ọ dịghị onye ga-esitekwa nʼebe ahụ gafee ọzọ.

11 Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-enweta ya,

ikwighịkwighị ukwu na ugolọma ga-akpa akwụ ha birikwa nʼebe ahụ.

Chineke ga-eseti nʼelu Edọm,

eriri ọtụtụ nke ọgbaaghara,

na ihe ịtụ mgbidi nke e tikpọrọ etikpọ, tọgbọrọ nʼefu.

12 Ndị ya a na-asọpụrụ agaghị ahụkwa ihe ọbụla nʼebe ahụ nke ha ga-akpọ alaeze.

Otu a kwa, ụmụ ndị eze ya niile agaghị adịkwa.

13 Ogwu ga-etochi ụlọ ukwu ya niile;

ebe ya niile e wusiri ike ga-aghọ ahịhịa ogwu,

ọ ga-abụkwa ụlọ nkịta ọhịa

na nke ikwighịkwighị.

14 Anụ ọhịa niile nke ọzara ga-ezute nkịta ọhịa nʼebe ahụ.

Ụmụ mkpi ọhịa ga-awagharị nʼebe ahụ na-ebeku ibe ha akwa.

Nʼebe ahụ ka ụmụ anụ ọhịa na-akpagharị nʼabalị ga-ezo onwe ha,

chọtakwara onwe ha ọnọdụ ebe izuike.

15 Ikwighịkwighị ga-akpa akwụ ya nʼebe ahụ.

Ọ ga-anọkwa nʼebe ahụ yie akwa, zụọ ụmụ ya,

lekọtaa ha site nʼiji nku ya kpuchie ha.

Ebe ahụ kwa ka ndagbụ ga-ezukọkwa,

nke ọbụla na ibe ya.

16 Nyochaa akwụkwọ nsọ ka ị gụọ ihe Onyenwe anyị gaje ime:

Ọ dịghị anụ ọhịa ọbụla ga-efu.

Ọ dịghị nke ọbụla ga-anọ nʼebe ahụ hapụ ịkpọ ibe ya,

nʼihi na ọnụ ya enyela iwu a.

Mmụọ ya ga-achịkọtakwa ha.

17 Ọ bụ ya onwe ya ga-ekewa ala ahụ,

jiri ihe ọtụtụ nʼaka keere ha oke ahụ.

Ha ga-enweta ya ruo mgbe ebighị ebi,

nwekwa ebe obibi nʼebe ahụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-