Publicidade

Isaías 27

Mgbapụta dịrị Izrel

1 Nʼụbọchị ahụ,

Onyenwe anyị ga-eji mma agha ya

iwe ya, dị ukwuu dịkwa ezigbo ike,

taa agwọ ahụ na-akpụ akpụ bụ Leviatan ahụhụ.

Leviatan bụ agwọ mgbakọ ahụ;

ọ ga-egbukwa nnukwu anụ ọjọọ ahụ nke bi na mmiri.

2 Nʼụbọchị ahụ,

abụ a ga-adị nʼọnụ ha, abụ ha ga-abụ banyere ubi vaịnị nke na-amị ezi mkpụrụ.

3 "Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-elekọta ya,

ana m agba ya mmiri ụbọchị niile,

na-eche ya nche ehihie na abalị.

Ka onye ọbụla ghara iji ihe ọjọọ leta ya.

4 Adịghị m ewekwa iwe.

Ọ bụrụ na ọ bụ naanị ogwu na uke na-echere m aka mgba,

aga m ebili buso ha agha,

aga m esurekwa ha ọkụ.

5 Ma ọ bụghị otu a, ka ha bịakwute m maka nchekwa,

ha bịa ka mụ na ha mee udo.

E, ha bịa ka mụ na ha mee udo."

6 Nʼụbọchị ndị na-abịa, Jekọb ga-agba mgbọrọgwụ.

Izrel ga-agbawa okoko dịka osisi, maakwa ifuru,

jirikwa mkpụrụ mejupụta ụwa niile.

7 Onyenwe anyị atabeghị Izrel ahụhụ

dịka o si taa ndị iro ya.

O mebekwaghị ka e gbuo ndị ya

dị ka e si gbuo ndị iro ha.

8 Onyenwe anyị tara ndị ya ahụhụ, mee ka a dọrọ ha nʼagha ma buru ha gaa mba ọzọ.

Ọ bụ ifufe ọjọọ nke si nʼọwụwa anyanwụ

ka o ji bupụ ha.

9 Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka a ga-esi bupụ ikpe ọmụma dịrị Jekọb,

nke a bụkwa iju eju nke mkpụrụ e ji wezuga mmehie ya:

Mgbe ha gweriri nkume niile ha ji wuo ebe ịchụ aja arụsị ha

dịka ntụ,

mgbe ha wezugara ogidi arụsị Ashera,

na ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile.

10 Obodo ahụ e wusiri ike adakpọsịala.

Ọ ghọọla ọzara nke ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya.

Ọ ghọọkwala ebe ụmụ ehi na-akpa nri,

ebe ha na-amakpu na-ezu ike.

Ha ga-atacha ahịhịa dị nʼalaka osisi.

11 Mgbe alaka osisi ndị ahụ kpọnwụrụ daa,

ụmụ nwanyị ga-abịa chịkọtaa ha were ha kwanye ọkụ.

Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enweghị nghọta.

Ọ bụ nke a mere Onye kere ha adịghị emere ha ebere.

Onye ahụ kpụrụ ha agakwaghị egosi ha obi ebere.

12 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-ahọcha site nʼebe mmiri na-eru eru Yufretis ruo na Wadi nke Ijipt, ma gị, bụ Izrel ka a ga-achịkọta otu nʼotu. 13 Nʼụbọchị ahụ, opi ike ga-ada. Ndị ahụ na-ala nʼiyi nʼAsịrịa na ndị ahụ e mere ka ha gaa biri nʼIjipt dịka ndị mba ọzọ ga-abịa fee Onyenwe anyị ofufe nʼugwu nsọ ya dị na Jerusalem.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-