Publicidade

Isaías 21

Amụma e buru banyere Babilọn

1 Amụma megide ọzara nke dị nʼakụkụ oke osimiri:

Dịka oke ifufe si nʼọzara Negeb na-efebiga,

ka onye na-eme ihe ike ga-esi nʼọzara bịa,

site nʼala nke oke egwu.

2 Ahụrụ m ọhụ dị egwu, ọhụ oke mbibi,

na ọhụ oke nrara nye nʼaka ndị mbibi, nʼebe onye na-apụnara mmadụ ihe nʼike na-akwakọta ngwongwo.

Bilienụ unu ndị agha Elam, buonu agha! Unu ndị agha Midia, gbaanụ obodo gburugburu!

Aga m eme ka ịsụ ude na mmegbu niile kwụsị.

3 Nʼihi nke a, ahụ m niile nọ nʼoke ihe mgbu,

oke ihe mgbu zuru m ahụ, dịka ihe mgbu nke nwanyị ime na-eme.

Amara m jijiji nʼihi ihe m nụrụ,

ihe m na-ahụ na-agbagwoju m anya.

4 Obi m anọkwaghị jụụ,

oke ọma jijiji na-eme ka m tụọ egwu;

chi ojiji nke m na-ele anya ya

aghọọlara m ihe ịma jijiji.

5 Ha na-akwado tebul.

Ha na-edozi ute ịnọdụ ala,

ha na-eri, ha na-aṅụ.

Bilienụ ndịisi agha,

teekwanụ ọta niile mmanụ!

6 Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m,

"Gaa, guzobe onye nche,

ka o kwuo ihe ọ na-ahụ.

7 Mgbe ọ hụrụ ụgbọ agha,

na usuu ịnyịnya,

na ndị na-agba ịnyịnya ibu,

maọbụ ndị na-agba ịnyịnya kamel ka ha na-abịa abụọ abụọ,

gwa ya ka o lezie ha anya nke ọma,

nọọkwa na njikere."

8 Onye nche na-elepụ anya tiri mkpu dịka ọdụm, sị,

"Onyenwe m, nʼehihie ụbọchị niile ka m na-eguzo nʼelu ụlọ nche,

nʼọnọdụ nche m ka m na-eguzokwa abalị niile.

9 Lee, otu nwoke nọ nʼime ụgbọ agha na-abịa,

ya na ndị nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa abụọ abụọ.

O nyeghachiri ọsịsa ahụ,

‘Babilọn adaala, e ọ daala,

arụsị niile apịrị apị nke chi ya niile

a kurisiela tọgbọrọ nʼala.’ "

10 O, ndị m, ndị a zọchara azọcha, dịka ọka a zọchara nʼebe ịzọcha ọka,

agwala m unu ihe

Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile

bụ Chineke Izrel kwuru.

Amụma banyere Edọm

11 Nke a bụ amụma megide Duma:

Otu onye si na Sia na-akpọ m oku,

"Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ?

Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ?"

12 Onye nche zara sị,

"Chi ọbụbọ na-abịa, abalị na-abịakwa.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịjụ ajụjụ, jụọnụ ajụjụ,

ma laghachikwa ọzọ."

Amụma e buru banyere Arebịa

13 Amụma megide Arebịa:

Unu ndị ije niile nke Dedan,

ndị na-anọ ọnọdụ abalị nʼoke ọhịa nke Arebịa,

14 kuterenụ ndị ahụ bịakwutere unu akpịrị na-akpọ nkụ mmiri ọṅụṅụ;

unu ndị bi nʼala Tema,

buterenụ ndị gbakwutere unu ọsọ ndụ nri.

15 Nʼihi na ọ bụ site nʼagha

nke e ji mma agha egbu ndị mmadụ,

na agha e ji akụ agbatu mmadụ

ka ha si na-agbapụ ọsọ.

16 Nke a bụ ihe Onyenwe anyị sịrị m, "Tupu otu afọ agwụ, dị ka esi agụ afọ onye ohu e goro ọrụ, ịma mma Keda ga-agwụsị. 17 Ndị fọdụrụ ndụ nʼime ndị na-agba ụta, ndị bụ dike nʼagha na Keda, ga-adị mmadụ ole na ole." Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel ekwuola ya.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-