Publicidade

Isaías 65

Ikpe na nzọpụta

1 "Ana m egosipụta onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m.

Ọ bụkwa ndị ahụ na-adịghị achọsi m ike na-achọta m.

Ana m agwa mba ahụ nke na-adịghị akpọku aha m,

asịrị m, ‘Lee m, anọ m nʼebe a.’

2 Ogologo ụbọchị niile ka m gbasapụrụ aka m abụọ

nye ndị na-enupu isi,

bụ ndị na-agbaso ụzọ na-ezighị ezi

ndị a na-agbaso ihe ọbụla ha tụpụtara nʼuche ha,

3 ndị na-anọgide na-akpasu m iwe

nʼihu m mgbe niile,

ndị na-achụ aja nʼubi ha a gbara ogige,

nʼebe ịchụ aja eji brik wuo,

4 ndị na-anọdụ nʼetiti ili,

ma na-anọdụkwa ọnọdụ abalị nʼebe nzuzo dị iche iche;

ndị na-eri anụ ezi,

ndị ite ofe ha jupụtara nʼanụ na-adịghị ọcha;

5 ndị na-asịrịta onwe ha, ‘Nọdụ iche, Abịala m nso,

nʼihi na ị ga-emerụ m, adị m nsọ karịa gị!’

Ma ndị dị otu a dịka anwụrụ ọkụ nʼimi m.

Ha bụ ọkụ na-enwu ehihie na nʼabalị.

6 "Lee, edeela ya rịị nʼihu m sị:

Agaghị m agba nkịtị, aga m akwụghachi nʼuju.

E, aga m akwụghachi ha.

7 Ọ bụghị naanị maka mmehie ha, kama maka mmehie nna nna ha niile,"

Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,

"Nʼihi na ha surere aja nsure ọkụ nʼelu ugwu dị iche iche,

kparịakwa m nʼelu ugwu nta niile.

Aga m akwụghachi ha nʼuju,

nʼihi ihe ndị a niile ha mere nʼoge gara aga."

8 Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,

"Dịka a na-achọta mmanya site nʼụyọkọ mkpụrụ vaịnị

ndị mmadụ asị, ‘Ebibila ya,

nʼihi na ngọzị ka dị nʼime ha,’

otu a ka m ga-eme nʼihi ndị ohu m;

Agaghị m ebibicha ha niile.

9 Aga m eme ka mkpụrụ site na Jekọb pụta,

sitekwa na Juda nweta ndị ga-enweta ugwu m niile.

Ndị m họpụtara ga-eketa ha,

ndị ohu m ga-ebikwa nʼebe ahụ.

10 Sharọn ga-aghọkwa ebe ịta nri nke igwe anụ ụlọ;

Ndagwurugwu Akọ ga-abụkwa ebe izuike nye igwe ehi,

na ndị m na-achọsi m ike.

11 "Ma unu ndị wezugara onwe unu site nʼebe Onyenwe anyị nọ,

ndị chezọrọ ugwu nsọ m,

ndị na-edozi tebul maka Ihuọma,

ndị na-agbaju mmanya agwara ọgwa nʼiko maka Akara aka.

12 Aga m eme ka unu zute mma agha;

unu niile ga-adakwa mgbe a na-egbu unu.

Nʼihi na akpọrọ m unu ma unu azaghị;

mgbe m gwara unu okwu, unu aṅaghị ntị.

Unu kpachapụrụ anya mehie megide m nʼihu,

họrọkwa ime ihe ndị ahụ unu maara nke ọma na m kpọrọ asị."

13 Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,

"Ndị ohu m ga-eriju afọ,

ma unu ga-anọ agụụ,

akpịrị ga-akpọkwa unu nkụ,

ma ha ga-aṅụ mmiri.

Unu ga-anọ nʼọnụma na ihere,

ma ha ga-anọ nʼọṅụ.

14 Ndị ohu m ga-abụ abụ

nʼihi ọṅụ nke jupụtara nʼobi ha,

ma unu ga-akwa akwa,

nʼihi ihe mgbu nke obi unu,

tiekwa mkpu akwa nʼihi obi ntiwa nke mmụọ unu.

15 Unu ga-ahapụ aha unu

nye ndị m họpụtara nye onwe m ka ọ bụrụ ihe ha ji abụ ọnụ;

nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-etigbu unu,

ma ọ ga-akpọ ndị ohu ya aha ọzọ.

16 Onye ọbụla na-ekpe ekpere nʼala ahụ,

ga-eme otu a nʼaha Chineke nke eziokwu,

onye ọbụla na-aṅụkwa iyi nʼime ala ahụ

ga-aṅụ iyi nʼaha Chineke nke eziokwu.

Nʼihi na-echezolam nsogbu niile ndị gara aga,

zokwa ha site nʼanya m.

Ụwa ọhụrụ na eluigwe ọhụrụ

17 "Nʼihi na lee, ana m eke

eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.

Ọ dịghị onye ga-echetakwa ndị ochie ahụ ọzọ;

ọ gaghị abatakwa nʼechiche onye ọbụla.

18 Ma ṅụrịanụ ọṅụ, tegharịakwa mgbe niile nʼobi ụtọ

nʼihi ihe nke mụ onwe m na-eke,

nʼihi na-aga eke Jerusalem ka ọ bụrụ ihe ọṅụ

ndị ya ga-abụkwa ihe obi ụtọ.

19 Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi Jerusalem,

nweekwa obi ụtọ nʼihi ndị m;

a gaghị anụkwa olu ịkwa akwa nʼime ya ọzọ,

maọbụ olu iti mkpu akwa.

20 "Ọ dịghịkwa nwa ọhụrụ nwụchuru anwụchu

ga-adị nʼebe ahụ ọzọ,

a gaghị ahụkwa agadi nwoke nke na-anọzughị ụbọchị ndụ ya;

nʼihi na a ga-agụnye onye nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ tupu ọ nwụọ

dị ka nwantakịrị;

a ga-agụkwa onye na-anọrughị narị afọ

dịka onye a bụrụ ọnụ.

21 Ha ga-ewu ụlọ, biekwa nʼime ya;

ha ga-akụkwa ubi vaịnị, riekwa mkpụrụ ha.

22 Ndị m agaghị ewukwa ụlọ hapụrụ ya ndị ọzọ,

maọbụ ghaa mkpụrụ nʼubi nke ndị ọzọ ga-aghọrọ rie.

Nʼihi na dịka osisi si adị ndụ ogologo oge

otu a ka ndị m ga-esi dịkwa ndụ ogologo oge.

Ha ga-aṅụrịkwa ọṅụ

nʼihe ahụ ha ji aka ha rụpụta.

23 Ha agaghị adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu.

Ha agaghị amụtakwa ụmụ ndị ga-emesịa nwụchuo ọnwụ.

Nʼihi na ha ga-abụ ndị Onyenwe anyị gọziri,

ha na ụmụ ụmụ ha.

24 Tupu ha akpọkuo m, aga m aza ha.

Mgbe ha ka nọ na-agwa m banyere mkpa ha, aga m anụ, zakwa ekpere ha.

25 Nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-atakọ nri nʼotu ebe,

ọdụm ga-ata ahịhịa dịka ehi,

ma agwọ ọjọọ niile ga-ata aja!

Ha agaghị emerụ ihe ọbụla ahụ,

maọbụ bibie ihe ọbụla nʼugwu nsọ m."

Ka Onyenwe anyị kwuru.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-