Publicidade

Isaías 15

Amụma e buru banyere Moab

1 Amụma megide Moab:

Ar dị na Moab a laala nʼiyi,

a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị.

Kia dị na Moab a laala nʼiyi,

a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị.

2 Ndị niile bi na Dibọn

na-aga nʼihu ụlọ mmụọ ha ịkwa akwa. Ndị

Moab na-akwa akwa nʼihi Nebo na Medeba.

Isi ha niile bụ isi nkwọcha,

afụọnụ ha niile ka akpụchakwara.

3 Ha na-eyi akwa mkpe na-agagharị nʼezi,

mkpu akwa na-ada nʼelu ụlọ, na nʼama.

Ha niile ji iti mkpu na ịkwa akwa

na-ada nʼala.

4 Heshbọn na Eleale na-eti mkpu akwa,

a na-anụ olu akwa ha ọ bụladị ruo Jehaz.

Nʼihi nke a, ndị agha Moab na-eti mkpu akwa,

mkpụrụobi ha na-amakwa jijiji.

5 Ọ na-ewute mkpụrụobi m nʼihi Moab,

ndị ya na-agba ọsọ ruo ọ bụladị nʼobodo Zoa

na Eglat Shelishiya.

Ha na-akwa akwa

dịka ha na-arịgo Luhit.

Mgbe ha na-agbago ụzọ Heronaim,

ha na-ebe akwa mwute nʼihi mbibi bịakwasịrị ha.

6 Mmiri Nimrim atachaala!

Ahịhịa akpọnwụọkwala;

ahịhịa ndụ niile agwụkwala

o nwekwaghị akwụkwọ ndụ nke fọrọ.

7 Ya mere akụnụba ha kpakọbara ndị ha chekwara

ka ha buuru gafee ofe ndagwurugwu warawara nke ọdọ mmiri osisi pọpla niile.

8 Mkpu akwa ha na-ada ụda gburugburu oke ala Moab niile;

akwa ha na-ebesi ike na-ada ruo obodo Eglaim;

abụ akwa ha na-erukwa Bịa-Elim.

9 Iyi Dibọn jupụtara nʼọbara,

ma aga m atụkwasịkwa ọ bụladị ọtụtụ ihe ndị ọzọ nʼelu Dibọn!

Ọdụm ka a ga-atụkwasịrị ndị Moab gbapụrụ

tụkwasịkwara ndị fọdụrụ nʼala ahụ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_10-32-54-