Publicidade

Isaías 26

Abụ Otuto

1 Nʼụbọchị ahụ, a ga-abụ abụ a nʼala Juda niile:

Anyị nwere obodo e wusiri ike.

Chineke na-eme ka mgbidi ya

na ebe ya niile e wusiri ike bụrụ nzọpụta nye anyị.

2 Meghee ụzọ ama niile,

ka mba ndị ahụ na-eme ezi omume bata,

e, bụ mba ahụ kwesiri ntụkwasị obi.

3 Ị na-eme ka ndị niile echiche uche ha guzosiri ike

nwee udo zuruoke,

nʼihi na ọ bụ na gị ka ha na-atụkwasị obi ha.

4 Tụkwasị Onyenwe anyị Chineke obi mgbe niile,

nʼihi na Onyenwe anyị Chineke bụ oke nkume nke mgbe ebighị ebi.

5 Ndị na-akpa nganga ka ọ na-ewedata ala,

na-emekwa ka obodo na-anya isi kpọọ ọnụ nʼala.

Mgbidi ya

ka ọ na-eme ka ọ daruo ala.

6 Ọ na-enyefe obodo ahụ

nʼaka ndị a na-emegbu emegbu,

na nʼaka ndị ogbenye ka ha zọtọọ ya ụkwụ.

7 Ụzọ nke onye ezi omume ha nʼotu,

gị, Onye ziri ezi, na-eme ka okporoụzọ ndị ezi omume dị larịị.

8 E, Onyenwe anyị, anyị na-aga nʼụzọ nke ikpe gị niile,

na-ele anya gị.

Aha gị na ihe niile e ji mara gị

bụ ihe na-agụsị obi anyị agụ ike.

9 Abalị niile ka obi m na-achọsi gị ike,

nʼụtụtụ eji m mmụọ m niile na-achọsi gị ike,

nʼihi na ọ bụ naanị mgbe ị bịara kpee ụwa ikpe

ka mmadụ ga-esi nʼajọ omume tụgharịa ime ezi ihe.

10 Obi ebere gị nʼebe ndị na-emebi iwu nọ

adịghị eme ka ha gbanwee.

Ọ bụladị nʼala a, ebe ndị ezi omume bi, ha na-anọgide na-eme ihe ọjọọ.

Ha adịghị echeta ịdị ukwuu gị, Onyenwe anyị.

11 Onyenwe anyị ebuliela aka ya elu,

ha adịghị ahụ ya.

Gosi ha ekworo gị banyere ndị gị, ka e si otu a mee ka ihere mee ha.

E, ka ọkụ ahụ ị kwadooro ndị iro gị rechapụ ha.

12 Onyenwe anyị, ị na-enye anyị udo;

nʼihi na ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị.

13 O, Onyenwe anyị Chineke anyị, ọ dị mgbe anyị nọ nʼokpuru ọchịchị ndị ọzọ dị iche iche,

ma ugbu a, ọ bụ naanị aha gị ka anyị na-efe.

14 Ndị niile anyị fere na mbụ anwụchaala; ha adịghịkwa ndụ;

mmụọ ha agakwaghị alọghachi ọzọ.

Nʼihi na ị tara ha ahụhụ, laa ha nʼiyi;

e chefukwaala ha.

15 I meela ka mba a dị ukwuu, Onyenwe anyị;

i meela ka mba a saa mbara.

I wetarala onwe gị nsọpụrụ,

i meela ka oke ala ahụ niile gbatịa.

16 Onyenwe anyị, nʼime mkpagbu ha, ha gbakwutere gị.

Mgbe iwe gị bịakwasịrị ha,

ọ bụ olu dị nta ka ha ji kpeere gị ekpere.

17 Gị, Onyenwe anyị, emeela ka anyị kwaa akwa,

dị ka nwanyị ime na-eme si ata ikikere eze na akwa akwa nʼihi ihe mgbu.

Otu a ka anyị nọ nʼihu gị.

18 Anyị anọọla ọnọdụ ihe mgbu, na ịta ikikere eze,

ma o nweghị ihe ọma anyị nwetara nʼime ya.

Mgbalị anyị niile emeghị ka nzọpụta rute ụwa aka.

O nwekwaghị ihe nwere isi anyị rụpụtara.

19 Ma ndị gị niile nwụrụ anwụ ga-adị ndụ, O Onyenwe anyị.

Ozu ha ga-esite nʼọnwụ bilie.

Unu ndị niile bi nʼaja

tetanụ ma tie mkpu ọṅụ.

Nʼihi na igirigi gị dị ka igirigi nke ụtụtụ,

ala ga-amụpụtakwa ndị ya niile nwụrụ anwụ.

20 Baanụ nʼụlọ, ndị m,

kpọchienụ ụzọ unu!

Zoonụ onwe unu naanị nwa oge nta,

tutu ruo mgbe iwe Chineke ga-agabiga.

21 Lee anya! Onyenwe anyị si nʼebe obibi ya

na-abịa ikpe ndị bi nʼụwa ikpe nʼihi mmehie ha niile.

Ụwa ga-ekpughepụ gosi ọbara niile a wụsiri nʼelu ya,

ọ gaghị ezokwa ndị niile e gburu lie nʼime ya.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-