Publicidade

Isaías 9

A mụụrụ anyị otu nwa

1 Ma otu ọbụla o siri dị, oge ahụhụ na ọchịchịrị na iru ụjụ ahụ agaghị adịgide nye ndị ahụ nọ na nkpa. Nʼihi na nʼoge gara aga, o mere ka e lelịa ala Zebụlọn na ala Naftalị anya, ma nʼoge dị nʼihu, ọ ga-eme ka a asọpụrụ Galili nke mba niile, nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọdan.

2 Ndị nọ na-agagharị nʼọchịchịrị

ahụla ìhè dị ukwuu;

ndị ahụ bi nʼala nke onyinyo ọnwụ

ka ìhè nwukwasịrị.

3 I meela ka mba ahụ baa ụba dịrị ukwuu,

mee ka ọṅụ ha dịkwa ukwuu,

ha na-enwe ọṅụ nʼihu gị,

dịka ọṅụ nke ndị ọrụ ubi nʼoge owuwe ihe ubi,

dịka ndị agha na-etegharị egwu ọṅụ

mgbe ha na-ekesa ihe a kwatara nʼagha.

4 Nʼihi na dịka nʼụbọchị nke Midia,

i gbajisiela

ibu arọ niile e bokwasịrị ha,

ihe mgbochi nke dị nʼubu ha,

nke bụ mkpara ndị na-akpagbu ha.

5 Nʼihi na akpụkpọụkwụ nke ndị agha na-eyi,

na uwe agha nke ọbara mechuru,

ha ga-abụ ihe a ga-agba ọkụ,

ha ga-abụ ihe ndị ga-eme ka ọkụ ree nke ọma.

6 Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa,

e nyekwala anyị otu nwa nwoke.

Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị.

Ndị a ga-abụ aha ya,

Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike,

Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo.

7 Alaeze ya ga-aba ụba, ọchịchị eze ya ga-abụ nʼọnọdụ udo

nke na-enweghị ọgwụgwụ.

Ọ bụ nʼocheeze Devid ka ọ ga-anọkwasị,

chịakwa nʼalaeze ya.

Ọ ga-eme ka alaeze ahụ guzosie ike;

ọ bụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume ka ọ ga-eji chịa

site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi.

Ịnụ ọkụ nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,

ga-emezukwa nke a.

Iwe Onyenwe anyị megide Izrel

8 Onyenwe anyị eziela ozi megide Jekọb

ọ ga-adakwasịkwa Izrel.

9 Ndị ahụ niile ga-amatakwa ya,

Ifrem na ndị bi na Sameria ga-amatakwa

bụ ndị na-eji nganga

na mpako na-ekwu sị,

10 "Nkume brik ndị ahụ adakpọsịala

ma anyị ga-eji nkume a waziri awazi wughachi ha;

ọ bụ ezie na e gbutusịala osisi sikamọ niile anyị ji wuo ụlọ anyị,

ma anyị ga-eji osisi ọma sida dochie ha."

11 Ma Onyenwe anyị a kpaliela ndị iro Rezin ka ha bilie megide ha,

ọ kwaliekwala ndị iro ha.

12 Ndị Aram sitere nʼọwụwa anyanwụ, na ndị Filistia sitere nʼọdịda anyanwụ

ha e werela ọnụ ghere oghe richapụ Izrel.

Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,

aka ya ka setịpụkwara esetipụ.

13 Ma ọ bụ ezie na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ataala ha ahụhụ dị otu a,

ndị Izrel echegharibeghị, ha alọghachikwutebeghị ya.

14 Nʼihi ya, nʼotu ụbọchị, Onyenwe anyị ga-ebibi ndịisi Izrel na ndị ọdụdụ,

ọ ga-ebibikwa alaka nkwụ na osisi achara niile.

15 Ndị okenye na ndị a maara aha ha bụ ndịisi ha,

ndị amụma ụgha bụ ọdụdụ ha.

16 Nʼihi na ndị ndu nke ndị ya eduhiela ha;

ndị na-ezi ha ụzọ emeela ka ha kpafuo.

17 Ya mere, Onyenwe anyị agaghị enwe mmasị nʼụmụ okorobịa ahụ,

ọ gaghị enwekwa obi ebere nʼebe ụmụ ndị na-enweghị nna maọbụ nʼebe ụmụ nwanyị na-enweghị dị nọ,

nʼihi na onye ọbụla nʼime ha adịghị asọpụrụ Chineke, bụrụkwa ndị ajọ omume,

ọnụ onye ọbụla na-ekwu ihe nzuzu.

Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,

aka ya ka setịpụkwara esetipụ.

18 Nʼezie, ajọ omume na-ere dị ka ọkụ:

ọ na-erepịa ogwu na uke,

ọ na-emekwa ka oke ọhịa nwuru ọkụ,

mee ka anwụrụ ọkụ si na ya rigoruo na mbara eluigwe.

19 Nʼihi iwe ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ewe,

ahụhụ ọ ga-enye ga-adị ka ọkụ na-ere ere;

ọ na-erepịa ala ahụ niile na ndị bi nʼime ya;

ọ dịkwaghị onye ga-azọpụta ibe ya.

20 Nʼala ahụ niile, ma nʼaka nri ma nʼaka ekpe,

onye ọbụla ga-agbalị ịdọtara onwe ya ihe oriri.

Ha ga-eri

ma afọ agaghị eju ha;

nʼezie, ha ga-eri ọ bụladị anụ ahụ ụmụ nke aka ha.

21 Ndị Manase ga-alụso ndị Ifrem ọgụ, ndị Ifrem ga-alụsokwa ndị Manase ọgụ.

Ha abụọ kwa ga-ejikọta aka lụso Juda ọgụ.

Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ.

Aka ya ka setịpụkwara esetipụ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-