Pular para o conteúdo
Publicidade

Aịzaya 17

Ozi e ziri banyere Damaskọs

1 Nke a bụ amụma megide Damaskọs,17:1 Jen 14:15; 15:2; 2Ez 16:9; Jer 49:23; Ems 1:3-5; Zek 9:1; Ọrụ 9:2 isi obodo Siria.

"Lee, Damaskọs agaghị adịkwa! Ọ gaghị abụkwa obodo ọzọ,

kama ọ ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke zedara ezeda.

2 Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime nʼobodo niile nke Aroea,

ọ ga-adịrị igwe atụrụ na ehi dị iche iche, ndị ga-amakpu,

ọ dịkwaghị onye ga-eme ka egwu tụọ ha nʼebe ahụ.

3 Ebe e wusiri ike nke Ifrem agaghị adịkwa,

ya na ike alaeze nke sị Damaskọs,

ndị fọdụrụ nke Aram ga-adị ka

ebube nke ndị Izrel,"

otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.

4 "Nʼụbọchị ahụ, a ga-eme ka nsọpụrụ Jekọb nwere bụrụ ihe e wedara nʼala.

Abụba dịkwa ya nʼahụ ga-atalata.

5 Ọ ga-adị ka ubi e si nʼime ya wee ihe mkpụrụ site nʼọka guzoro ọtọ,

na-achịkọta mkpụrụ nʼogwe aka ha

dịka mgbe mmadụ na-atụtụkọta mkpụrụ site nʼigbo ọka

nʼime Ndagwurugwu Refaim.

6 Ma ọ bụ ole na ole nʼime mkpụrụ ahụ ga-afọdụkwa,

dịka mgbe a kuchasịrị osisi oliv,

hapụ mkpụrụ abụọ maọbụ atọ, nke dị nʼalaka kachasị elu,

maọbụ mkpụrụ anọ maọbụ ise a hapụrụ nʼọnụ ọnụ alaka nke ahụ mịrị mkpụrụ."

Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwubiri ya.

7 Nʼụbọchị ahụ, ha ga-echeta onye kere ha,

nweekwa nsọpụrụ nʼebe Onye nsọ nke Izrel nọ.

8 Nʼụbọchị ahụ, ha agaghị elekwasịkwa chi ha dị iche iche anya ka ha nyere ha aka.

Ha agakwaghị efe ihe ndị ahụ ha ji aka ha mee.17:8 Aịz 2:8; 31:7

Ha agakwaghị asọpụrụ chi nwanyị ha bụ Ashera,17:8 Ashera bụ chi nwanyị ndị Kenan. Ọ bụ osisi ka e ji egosipụta oyiyi ya na ọtụtụ ebe ịchụ aja ya. Nkp 3:7; Dit 12:3; 16:21

maọbụ ebe ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ nke mkpịsịaka kpụrụ.

9 Nʼụbọchị ahụ, obodo ha niile e wusiri ike, nke ha hapụrụ nʼihi ndị Izrel, ga-adị ka ebe ahapụrụ ahapụ nye oke ọhịa na ahịhịa nke ọhịa. Ebe niile ga-abụ nnọọ mkpọmkpọ ebe.

10 Nʼihi na ị chezọla Chineke onye na-azọpụta gị.

I chetaghị Nkume ahụ, nke bụ ebe mgbaba gị.

Ya mere, ọ masịkwa gị kụọ ihe ọkụkụ dị iche iche nke dị ụtọ,

maọbụ manye alaka osisi vaịnị ị si nʼala ọzọ bubata,

11 ọ bụrụkwa na i mee ka ha too nʼụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala,

maọbụ na ha mara ifuru nʼụtụtụ ụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala,

ị gaghị aghọta mkpụrụ ọ mịrị,

nʼihi na ọ bụ naanị ọrịa na ihe mgbu ka ha ga-ewetara gị.

12 Ahaa, lee ụzụ nke ọtụtụ mmadụ na-eme,

nke yiri mkpọtụ oke osimiri.

Ọ bụ mkpọtụ nke mba dị iche iche;

ha na-eme mkpọtụ dị ka nnugharị nke ọtụtụ osimiri.

13 Ọ bụ ezie na ha na-agbọ ụja dịka mkpọtụ nke oke osimiri,

ma Chineke ga-abara ha mba nke ga-eme ka ha gbaa ọsọ.

A ga-achụsa ha dịka ifufe si efesa igbugbo ọka,

na dịka mpempe akwụkwọ ifufe siri ike na-ebugharị gburugburu gburugburu.

14 Nʼanyasị, ha na-eme ka oke egwu dịrị,

tutu ruo ụtụtụ, ha adịghịkwa.

Nke a bụ ihe nketa dịịrị ndị ahụ na-apụnara anyị ihe anyị nwere nʼike.

E, ọ bụ ihe nza ruru ndị ahụ ji ike na-anakọrọ anyị ihe anyị nwere.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.