Publicidade

Isaías 31

Ahụhụ dịrị ndị ahụ na-atụkwasị Ijipt obi

1 Ahụhụ dịrị ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka,

ndị nchekwube ha dị nʼike ndị ha na-agba ịnyịnya,

ndị na-atụkwasị obi ha nʼụgbọala ha, nke dị ọtụtụ,

ndị na-atụkwasịkwa obi ha nʼịdị ike nke ndị Ijipt na-agba ịnyịnya.

Ma ha adịghị ele anya inyeaka site nʼaka Onye Nsọ Izrel;

ha adịghị arịọkwa ya ka Onyenwe anyị nyere ha aka.

2 Ma ya onwe ya maara ihe, ọ pụrụ iweta ịla nʼiyi.

Ọ dịkwaghị agbanwe okwu ya.

Ọ ga-ebili megide ndị mba na-eme ihe ọjọọ;

ha na ndị niile na-enyere ndị na-eme ajọ ihe aka.

3 Nʼihi na ndị Ijipt bụ naanị mmadụ, ha abụghị Chineke!

Ịnyịnya ha nwekwara anụ ahụ, ha abụghị mmụọ.

Mgbe Onyenwe anyị setịpụrụ aka ya imegide ha,

ha ga-asọ ngọngọ;

ndị ha na-enyere aka ga-adakwa.

Ha niile ga-alakọkwa nʼiyi.

4 Ma ihe ndị a ka Onyenwe anyị gwara m,

"Dịka ọdụm na-agbọ ụja,

na-ebigbọ nʼelu anụ ọ dọgburu,

nʼagbanyeghị na-akpọkọtara igwe ndị ọzụzụ atụrụ

imegide ya,

ọ naghị atụ egwu mkpu ha,

mkpọtụ ụzụ ha adịghị enyekwa ya nsogbu,

Otu a kwa, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-arịdata

ibu agha nʼugwu Zayọn, na nʼugwu nta ya niile.

5 Dịka nnụnụ si efegharị nʼelu akwụ ya ichebe ụmụ ya,

otu a ka mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-esi chebe Jerusalem,

ọ ga-ekpuchi ya napụta ya,

ọ ghaghị ịgabiga ya, gbapụtakwa ya."

6 Lọghachitenụ azụ, unu bụ Izrel, laghachikwurunụ onye ahụ nke unu nupuru isi nʼebe ọdị ukwuu megide. 7 Amaara m nke ọma na ụbọchị ahụ na-abịa, mgbe onye ọbụla nʼime unu ga-atụfu arụsị ọlaedo na ọlaọcha niile nke aka mmehie unu kpụrụ.

8 "Mgbe ahụ, Asịrịa ga-ada, kama ọ bụghị site na mma agha mmadụ,

mma agha na-abụghị nke mmadụ efu ga-erichapụ ha.

Ha ga-esi nʼihu mma agha gbaa ọsọ,

ma ụmụ okorobịa ha ka a ga-akpụrụ tinye nʼọrụ mmanye.

9 Obodo ha niile e wusiri ike ga-ada nʼihi oke egwu,

ndị ọchịagha ha ga-atụkwa ụjọ mgbe ha hụrụ ọkọlọtọ agha."

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

Onye ọkụ ya dị na Zayọn,

onye ekwu igwe ọkụ ya dị na Jerusalem.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-