Pular para o conteúdo
Publicidade

Aịzaya 20

Amụma e bụrụ banyere Ijipt na Kush

1 Nʼafọ ahụ, Sagọn, eze Asịrịa, zipụrụ ọchịagha onye ọkwa ya kasị ukwuu, ka gaa buso Ashdọd agha. gara meriekwa ya nʼagha. 2 Nʼoge ahụ Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ Aịzaya nwa Emọz. sịrị ya, "Yipụ uwe mkpe iyi nʼahụ, ya na akpụkpọụkwụ dị gị nʼụkwụ." O mere otu a, gbaara ọtọ, jegharịakwa nʼụkwụ efu.

3 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, "Dị ka ohu m Aịzaya si gbara ọtọ jegharịa nʼụkwụ efu afọ atọ ndị a niile, bụ ihe ama na ihe ịdọ aka na ntị na-egosi ihe gaje ịbịakwasị ndị Ijipt na ndị Kush.20:3 Nke a bụ mgbago Naịl 4 Nʼihi na otu a ka eze Asịrịa ga-esi kpụrụ ndị Ijipt na ndị Kush dọtara nʼagha. Ha ga-agba ọtọ na-ejegharị nʼụkwụ efu, ma nwantakịrị ma okenye. Otule ha gba ọtọ ga-abụrụ Ijipt ihe ihere. 5 Egwu ga-ejide ndị ahụ niile nwere nchekwube nʼike Kush, na ndị ahụ niile jiri Ijipt nyaa isi ga-ada mba. Ihere ga-emekwa ha.20:5 Aịz 30:3-5; 31:1; Izk 29:6-7 6 Nʼụbọchị ahụ, ndị ahụ dịnyeere ha, bụ ndị bi nʼọnụ mmiri ha ga-asị, bụrụ na ihe dị otu a dakwasịrị ndị Ijipt anyị tụkwasịrị obi inyere anyị aka, na ịnapụta anyị site nʼaka eze Asịrịa, ebeekwanụ ka anyị ga-agbaga?’ "

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também