Publicidade

Isaías 53

1 Onye kweere ozi anyị,

ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị?

2 Nʼihi na o tolitere nʼihu Onyenwe anyị dịka ome,

dịka mgbọrọgwụ nke puputara nʼala kpọrọ nkụ.

O nweghị ụdịdị ọma maọbụ ịma mma nke ga-eme ka anyị lee ya anya.

O nweghị ihe ọbụla dị nʼụdịdị ya nke ga-eme ka ihe banyere ya masị anyị, maọbụ mee ka anyị chọsie ya ike.

3 Ndị mmadụ ledara ya anya, jụkwa ya.

Ọ bụ onye nwere ọtụtụ ihe mgbu, bụrụkwa onye hụrụ ọtụtụ ahụhụ.

Ma anyị gbakụtara ya azụ, jụ ilenye anya nʼebe ọ nọ.

E, anyị ledara ya anya, jụ ịgụ ya dịka ọ bụ ihe ọbụla.

4 Nʼezie, ihe mgbu niile anyị ka o buuru,

burukwa ahụhụ nke ọrịa anyị niile,

ma anyị gụrụ ya ka onye Chineke tara ahụhụ,

onye o tiri ihe otiti, na onye o mekpara ahụ.

5 Ma e tipụrụ ya ọnya nʼihi mmehie anyị:

ọ bụkwa nʼihi ajọ omume anyị ka e ji merụchaa ya ahụ.

E mere ka anyị nwee udo nʼihi ahụhụ ọ hụrụ;

ọ bụkwa ubiri ụtarị dị ya nʼahụ mere anyị ji bụrụ ndị ahụ dị ike.

6 Anyị niile akpafuola dịka igwe atụrụ;

onye ọbụla nʼime anyị etinyela isi ya nʼụzọ nke aka ya.

Ma Onyenwe anyị ebokwasịla ya

ajọ omume anyị niile.

7 A kpagburu ya, mesie ya ihe ike,

ma otu mkpụrụ okwu esighị ya nʼọnụ pụta.

E duuru ya pụọ dịka atụrụ a na-aga igbu egbu,

dịka atụrụ a na-akpachapụ ajị ya si anọ nwayọọ nʼihu ndị na-akpacha ya ajị,

otu a ka o si nọdụ na-asagheghị ọnụ ya.

8 Site na mmegbu na ikpe ka e ji wepụ ya.

Ma, onye nʼetiti ndị ọgbọ ya weliri olu kwuo okwu?

Nʼihi na e bipụrụ ya site nʼala ndị dị ndụ;

maka njehie ndị m ka e ji tie ya ihe.

9 E nyefere ya ka e lie ya dịka onye na-emebi iwu,

ọ bụkwa nʼetiti ndị ọgaranya ka e liri ya,

ọ bụ ezie na o nweghị ihe ọjọọ ọbụla o mere,

ọ dịkwaghị okwu aghụghọ si nʼọnụ ya pụta.

10 Ma ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị ịzọpịa ya, na ime ka ọ taa ahụhụ.

Nʼihi na ọnwụ ya bụ aja a chụrụ nʼihi ikpe ọmụma nke mmehie.

Ọ ga-ahụ ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ ya; ọ ga-adịkwa ndụ ogologo oge.

Nzube Chineke niile ga-emezukwa site na ya.

11 Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ,

ọ ga-emesịa hụ ìhè nke ndụ, afọ ga-ejukwa ya,

site nʼihe ọmụma ya, ka onye ezi omume ahụ, bụ ohu m ga-eme ka a gụọ ọtụtụ mmadụ dịka ndị ezi omume,

ọ ga-ebukwa mmehie ha niile.

12 Nʼihi ya, aga m enye ya oke nʼetiti ndị bara ụba,

ọ ga-esokwa ndị bụ dike keta ihe nkwata nʼagha,

nʼihi na ọ wụpụrụ ndụ ya nye ọnwụ,

a gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu.

Ma ya onwe ya buuru mmehie ọtụtụ mmadụ,

rịọọkwara ndị na-emebi iwu arịrịọ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-