Publicidade

Isaías 29

Ahụhụ dịrị obodo Devid

1 Ahụhụ ga-adịrị gị, gị bụ Ariel, Ariel,

gị obodo ebe Devid bi.

Gbakọnyenụ otu afọ nʼafọ ọzọ

nke unu ga-eji rie oriri, mee mmemme.

2 Ma aga m akpagbu Ariel,

ọ ga-eru ụjụ, ma bee akwa,

ọ ga-adị ka ala ebe ịchụ aja.

3 Aga m ama ụlọ ikwu m nʼakụkụ gị niile gburugburu,

aga m eji ọtụtụ ụlọ elu gba gị gburugburu

dokwaa ihe nnọchibido m niile megide gị.

4 Nʼọnọdụ mweda nʼala, ị ga-ekwu okwu site nʼala,

okwu ọnụ gị ga-esikwa nʼuzuzu pụta.

Olu gị ga-ada ka nke onye mmụọ site nʼala,

ọ bụ site nʼuzuzu ka okwu ọnụ gị na-ada ntakịrị ntakịrị ga-esi pụta.

5 Ma igwe ndị iro gị ga-aghọ ntụ,

igwe ndị na-adịghị eme obi ebere ga-adịkwa ka igbugbo ọka nke ifufe na-ebufu.

Mgbe ahụ, na mberede,

6 mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị,

Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji egbe eluigwe na ala ọma jijiji

na oke ifufe na oke ụzụ, na ọkụ na-erepịa erepịa, bịakwute ha.

7 Mba niile ahụ, ndị na-ebuso Ariel agha,

bụ ndị na-ebuso ya na ebe ya e wusiri ike agha,

ga-efu dịka nrọ,

onye na-arahụ ụra nʼabalị rọrọ.

8 Dịka mgbe onye agụụ na-agụ, nke na-arọ nrọ ebe ọ na-eri nri,

ma agụụ nọkwa na-agụ ya mgbe o si nʼụra teta.

Dịka onye agụụ mmiri na-agụ, nke nọ na nrọ hụ mmiri ọ na-aṅụ,

ma teta nʼụra chọpụta na akpịrị na-akpọsị ya nkụ ike, na-adakwa mba.

E, otu a ka ọ ga-adị

mgbe igwe ndị agha mba ahụ niile ga-ebuso ugwu Zayọn agha.

9 Ka ọ gbagwojuo unu anya. Ka o jukwa unu anya.

Kpuonụ onwe unu ìsì ka unu ghara ịhụ ụzọ.

Ṅagharịanụ ma ọ bụghị site na mmanya unu ṅụrụ,

sọọnụ ngọngọ ma ọ bụghị site na mmanya na-aba nʼanya.

10 Nʼihi na Onyenwe anyị awụkwasịla unu mmụọ nke oke ụra.

O mechiela anya ndị amụma unu niile,

kpuchie isi ndị niile na-ahụ ọhụ.

11 Ihe ndị a niile na-aga ime nʼoge dị nʼihu dịka akwụkwọ a kara akara. Mgbe e weere ya nye onye ma akwụkwọ ka ọ gụọ, ọ ga-asị, "Enweghị m ike, nʼihi na a kaala ya akara." 12 Mgbe e weere ya nye onye na-amaghị akwụkwọ, ọ ga-asị, "Ewela iwe, amaghị m agụ."

13 Onyenwe anyị sịrị,

"Ndị a ji ọnụ ha na-abịa m nso,

ha ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m,

ma obi ha dị anya nʼebe m nọ.

Ofufe ha na-efe m, bụ nke

gbadoro ụkwụ nʼihe mmadụ nyere nʼiwu, bụkwa nke a kuziiri ha.

14 Ya mere, otu ugboro ọzọ, aga m eme ndị a ihe oke iju anya

jiri ihe ịtụnanya tụkwasị nʼelu ihe ịtụnanya,

amamihe nke ndị maara ihe ga-ala nʼiyi,

nghọta nke ndị nwere nghọta ga-agba barịị."

15 Ahụhụ ga-adịrị ndị na-eche

na ha na-ezonarị Onyenwe anyị nzube ha,

ndị na-agbalịsị ike ime ihe ha zubere na nzuzo, ma na-asịrịta onwe ha,

"Chineke agaghị ahụ anyị. Ọ maghị ihe anyị na-eme!"

16 Lee ka unu si ekpu ihe ihu nʼala,

ka a ga-asị na ọkpụ ite dị ka ụrọ e ji akpụ ite.

Ihe mmadụ kpụrụ o nwere ike ịtụgharị gwa onye kpụrụ ya, sị,

"Ị kpụghị m"?

Ka ite o nwere ike ị sị ọkpụ ite,

"Ị ghọtaghị ihe ọbụla"?

17 Mgbe na-adịghị anya ọ bụ na Lebanọn agaghị aghọ ala ubi na-emepụta ihe,

ala ubi ahụ na-emepụta ihe ga-adịkwa ka oke ọhịa?

18 Nʼụbọchị ahụ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe a na-agụpụta site nʼakwụkwọ ahụ,

ndị ìsì, ndị ahụ naara ejegharị nʼọchịchịrị ga-emeghe anya ha,

hụkwa ụzọ ọzọ.

19 Ndị dị umeala nʼobi, na ndị ogbenye nʼetiti ndị mmadụ ga-achọta ọṅụ na obi ụtọ

nke Onyenwe anyị Onye dị nsọ nke Izrel na-enye.

20 Ndị na-adịghị enwe obi ebere agaghị adịkwa;

ndị niile na-akwa emo agaghị adịkwa,

ndị niile echiche ha bụ ime ajọ ihe ka a ga-ebipụ ndụ ha,

21 bụ ndị ahụ na-eme ka e site nʼokwu ọnụ ha mee onye ọzọ onye ikpe mara,

ndị na-eme ka onye na-ekpechite ọnụ onye a na-emegbu emegbu maa nʼọnya,

ndị na-eji ịgba akaebe ụgha mee ka ikpe ziri ezi hapụ irute ndị ezi omume aka.

22 Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị onye gbapụtara Ebraham na-agwa ụlọ Jekọb,

"Ndị m, a gaghị emekwa ka ihere mee unu ọzọ.

Ihu unu agaghị agbarụkwa ọzọ.

23 Mgbe ha hụrụ ụmụ ha,

bụ ọrụ aka m abụọ, nʼetiti ha,

ha ga-edo aha m nsọ,

ha ga-ekwupụta, nabatakwa ịdị nsọ nke Onye nsọ Jekọb,

ha ga-eguzokwa nʼihu Chineke Izrel nʼegwu na nʼịma jijiji.

24 Ndị na-akpafu nʼime mmụọ ha ga-enweta nghọta,

ndị ntamu ga-achọkwa ka ha mụta ihe."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-