Publicidade

Isaías 46

Chi dị iche iche nke ndị Babilọn

1 Bel na Nebo, arụsị ndị Babilọn makpu amakpu.

Lee, arụsị niile ha ka ebukwasịrị ha nʼazụ ịnyịnya ibu.

Arụsị niile apịrị apị bụ nke a na-ebugharị bụ ibu dị arọ,

ibu arụ nye ụmụ anụmanụ na-ada mba!

2 Ha makpuuru, rudakọkwa ala nʼotu;

ha enweghị ike iwezuga ibu ndị a nʼonwe ha,

ha onwe ha kwa, a dọtala ha nʼagha.

3 "Geenụ m ntị, unu ụmụ ụmụ Jekọb,

unu ndị fọdụrụ nʼụlọ Izrel,

unu bụ ndị m na-elekọta siterị na mgbe a mụrụ unu

na-akpọgharịkwa unu siterị na mgbe amụpụtara unu.

4 Mụ onwe m, bụ onye ahụ, ọ bụ m ga-elekọtakwa unu anya,

ọ bụladị ruo mgbe isi awọ jupụtara unu nʼisi, nʼagadi unu.

Nʼihi na ọ bụ m kere unu, aga m elekọtakwa unu.

Aga m agba unu ume, bụrụkwa onye nzọpụta unu.

5 "Onye ka unu ga-asị na o yiri m? Onye kwa ka mụ na ya ha?

Onye ka unu ga-eji tụnyere m?

6 Ụfọdụ mmadụ na-emeghe akpa ego ha wụpụta ọlaedo dị nʼime ya,

na-atụpụtakwa ọlaọcha nʼihe ọtụtụ,

were ya goo onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ka o jiri ya kpụọrọ ha chi,

emesịa, ha na-akpọ isiala na-efe arụsị ahụ ofufe.

7 Ha na-ebuli arụsị ahụ buru ya nʼubu ha,

buru ya debe ya nʼọnọdụ ya, nʼebe ahụ ka ọ na-akwụrụ.

Ọ dịghị apụ site nʼebe ahụ jegharịa.

Ọ bụrụ na mmadụ e tikuo ya mkpu, ọ gaghị aza,

ọ pụghị ịzọpụtakwa ha pụọ na nsogbu ha niile.

8 "Chetanụ nke a, ma tuleekwa ya,

ka ọ dịgidekwa unu nʼobi, unu ndị na-enupu isi.

9 Chetakwanụ ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga,

nʼihi na abụ m Chineke, chi ọzọ adịghịkwa.

Naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị onye ọzọ dị ka m.

10 Ọ bụ m na-egosi ikpeazụ site na mmalite,

ọ bụ m na-ekwu site na mgbe ochie ihe ga-eme nʼọdịnihu.

Ana m asị, ‘nzube m ga-eguzogide.

Ọ bụkwa ihe dị m mma nʼobi ka m ga-eme.’

11 Aga m esite nʼọwụwa anyanwụ kpọọ anụ ufe,

e, sitekwa nʼala ebe dị anya kpọọ nwoke ahụ ga-abịa mee nzube m.

Nʼihi na ihe m kwuru ya ka m ga-eme ka o mezuo;

ọ bụkwa atụmatụ m ka m ga-emekwa.

12 Geenụ m ntị, unu ndị isi ike,

unu ndị nọpụrụ ezi omume m nʼebe dị anya.

13 Ana m eweta ezi omume nso,

ọ dịghị nʼebe dị anya,

nzọpụta m agaghị anọkwa ọdụ.

Aga m enye Zayọn nzọpụta,

nyekwa Izrel ịma mma m.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-