Publicidade

Isaías 23

Amụma e buru banyere Taịa

1 Nke a bụ amụma megide Taịa:

Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri nke Tashish

nʼihi na e bibiela Taịa,

ahapụla ya na-enweghị ụlọ ọbụla maọbụ ọnụ mmiri mbata.

Ozi erutela ha aka

site nʼobodo Saiprọs.

2 Derenụ duu, unu ndị bi nʼala ahụ osimiri gbara gburugburu.

Unu ndị na-azụ ahịa na Saịdọn,

ndị na-ezipụ ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri, kwaanụ akwa.

3 Nʼelu ọtụtụ mmiri dị ukwuu,

ka mkpụrụ ọkụkụ Shihoa si bịa,

owuwe ihe ubi nke Naịl bụ ihe uru ahịa Taịa,

ọ ghọrọ ọma ahịa nke mba dị iche iche.

4 Ka ihere mee gị, Saịdọn, na gị bụ ebe e wusiri ike nke osimiri,

nʼihi na oke osimiri ekwuola okwu;

"Ime emetụbeghị m, nke m ji amụpụta nwa;

o nwebeghị mgbe m ji zụpụta ụmụ ndị ikom maọbụ ụmụ ndị inyom tozuru oke."

5 Mgbe ozi ga-abịara ndị Ijipt,

ha ga-anọ na mwute nʼihi ozi si Taịa.

6 Gabiganụ ruo Tashish

tisienụ mkpu akwa ike, unu ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu.

7 Nke a ọ bụ obodo ahụ ọṅụ na-ejupụta nʼime ya oge niile?

Obodo ahụ dịrịla kemgbe oge gara aga?

Nke a ọ bụ ihe fọdụrụ nʼobodo ahụ

ndị ya na-esi nʼime ya pụọ gaa nʼebe dị anya iwu obodo ọzọ?

8 Onye zubere ihe dị otu a megide Taịa,

bụ mba na-ekpube ndị ọzọ okpueze,

mba nke ndị ahịa ya bụ ụmụ eze,

nke ndị ọzụ ahịa ya bụ ndị a na-asọpụrụ nʼụwa?

9 Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere ya,

nʼihi iweda nʼala mpako na ịma mma ya niile,

na iwetara ndị niile a na-asọpụrụ nʼụwa nlelị.

10 Gaanụ kọọ ala ubi unu dịka ha na-eme nʼakụkụ Naịl,

unu ụmụada Tashish,

nʼihi na unu enwekwaghị ọnụ mmiri.

11 Onyenwe anyị esetipụla aka ya nʼelu osimiri

mee ka alaeze ha niile maa jijiji.

O nyela iwu banyere Fonisia

ka e bibie ebe ya niile nke wusiri ike.

12 Ọ sịrị, "Ị gaghị aṅụrị ọṅụ ịṅụ mmanya nʼoke oriri ọzọ,

gị ada Saịdọn na-amaghị nwoke, nke a na-emegbu emegbu.

"Bilie, gafee garuo Saiprọs,

ọ bụladị nʼebe ahụ, ị gaghị enweta ezumike."

13 Lee anya nʼala ndị Kaldịa,

ndị a gụpụrụla ugbu a na mmadụ!

Ndị Asịrịa mere ya

ka ọ bụrụ ebe obibi nye anụ ọhịa na-ebi nʼọzara.

Ha wuliri ụlọ nche ha niile dị elu gburugburu

tikpọọ ebe ya niile e wusiri ike,

mee ha ka ha tọgbọrọ nʼefu ghọọ mkpọmkpọ ebe.

14 Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri Tashish niile dị nʼoke osimiri,

nʼihi na e mebiela ebe unu niile e wusiri ike.

15 A gaghị echeta Taịa ọzọ, tutu iri afọ asaa agafee, nke bụ ogologo ụbọchị ndụ onye eze. Mgbe oge ahụ zuru, Taịa ga-adịkwa ka nwanyị akwụna e jiri rọọ abụ dị otu a:

16 "Welite ụbọ akwara, jegharịa nʼime obodo,

gị nwanyị akwụna e chefuru echefu;

kpọzie ụbọ gị nke ọma, bụọ ọtụtụ abụ,

ka e si otu a mee ka ị bụrụ onye e chetara echeta."

17 E, mgbe iri afọ asaa gasịrị, Onyenwe anyị ga-eleta Taịa. Ọ ga-alaghachi nʼọrụ ya dịka nwanyị akwụna, ya na alaeze niile dị nʼihu elu ụwa niile. 18 Ma uru ahịa ya niile, na ego niile ọ kpatara site nʼịzụ ahịa ka ọ ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị. Ha agaghị edokọkwa ha nʼotu ebe izo ha, kama uru ahịa ha niile ga-adịrị ndị niile na-ebi ezi ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ga-ejikwa ego ahụ zụọ ihe oriri na uwe dị mma.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-