Publicidade

Isaías 57

1 Ndị ezi omume na-ala nʼiyi,

ma ọ dịghị onye ọbụla na-etinye ya nʼobi;

a na-ewezuga ndị ji obi ha niile na-efe Chineke,

ma ọ dịghị onye na-aghọta,

na-ewezugara onye ezi omume

pụọ nʼihu ihe ọjọọ.

2 Ndị na-agazi agazi nʼụzọ ha

na-abanye nʼudo.

Ha na-enwekwa izuike mgbe ha dinara nʼọnwụ.

3 "Ma unu onwe unu, bịanụ nʼebe a, unu ụmụ ndị mgbaasị,

unu ụmụ ndị na-akwa iko, na ụmụ ndị akwụna.

4 Onye ka unu na-akwa emo?

Onye ka unu na-akọcha,

na-arapụtakwara ire unu?

Unu ọ bụghị ụmụ ndị nnupu isi,

mkpụrụ ndị na-ekwu okwu ụgha?

5 Unu na-emejupụta ihe ọjọọ niile na-agụ obi unu agụụ

mgbe unu zukọrọ na-efe arụsị unu nʼokpuru osisi ook ọbụla.

Unu na-ewerekwa ụmụ unu chụọ aja

na ndagwurugwu niile, na nʼokpuru nkume niile dị elu.

6 Chi unu na-efe bụ nkume niile na-akwọ mụrụmụrụ,

nke dị na ndagwurugwu niile, ha bụ ihe nketa nza unu fere.

E, ọ bụ ha ka unu na-awụpụrụ onyinye mmanya unu niile

na onyinye mkpụrụ ọka unu niile.

Nʼihi ihe ndị a niile, m ga-esi aṅaa dere duu?

7 Ọ bụ nʼelu ugwu dị elu ka unu doziiri onwe unu ihe ndina,

nʼebe ahụ kwa ka unu gara chụọ aja unu.

8 Ọ bụkwa nʼazụ ọnụ ụzọ niile, na ibo ụzọ niile,

ka ị kwụbara oyiyi arụsị gị.

Ị gbakụtara m azụ,

yipụ uwe gị rịbanye nʼime ihe ndina gị,

ebe gị na ndị ahụ ị hụrụ nʼanya dinakọrọ,

imejupụta ihe ọjọọ ahụ na-agụ obi gị agụụ.

9 Ị were mmanụ jekwuru Molek

meekwa ka mmanụ otite gị na-esi isi ụtọ baa ụba.

Ị zipụrụ ndị nnọchite anya gị gaa na mba dị anya;

ị gbadara ruo nʼime ime ala mmụọ.

10 Oke mwagharị ndị a niile emeela ike gwụsịa gị,

ma ị dịghị asị, ‘Olileanya adịghị.’

Ị chọtara ntute nye ndụ gị,

ya mere, na ị daghị mba.

11 "Onye na-emenye gị ụjọ na egwu dị otu a?

Nke mere na ị dịghị agwa m eziokwu?

Ị naghị echetakwa m,

ị naghị atụgharịkwa ihe banyere m nʼobi gị?

Ọ bụ nʼihi na m gbara nkịtị oge ndị a niile

ka i ji hapụ ịtụ m egwu?

12 Lee, aga m ekpughe ezi omume gị na ọrụ ọma gị,

igosi gị na ihe ndị a ị gụrụ dị ka ezi ihe agaghị enyere gị aka.

13 Mgbe ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka,

ka arụsị niile ndị ịchịkọbara zọpụta gị.

Ikuku ga-eburu ha niile bufuo,

naanị otu nkuume ga-ekutu ha.

Ma onye ọbụla gbabara nʼime m izere ndụ

ga-eketa ala ahụ;

ha ga-enwetakwa ugwu nsọ m."

Nkasiobi dịrị ndị dị umeala nʼobi

14 A ga-asịkwa,

"Dozienụ ụzọ! Dozienụ ụzọ, mee ya ka ọ maa mma.

Bupụsịanụ ihe ịsọ ngọngọ niile nʼụzọ ndị m."

15 Nʼihi ihe a ka onye dị elu, onye e mere ka ọ dị ukwuu,

onye dị mgbe ebighị ebi, onye aha ya dị nsọ kwuru:

"Ebi m nʼebe dị elu nke dịkwa nsọ,

ibinyere onye dị umeala nʼobi, na onye wedara mmụọ ya nʼala,

itute mmụọ nke onye e wedara nʼala,

na ịkpọlite mmụọ nke onye dị umeala nʼobi.

16 Nʼihi na ọ bụghị ruo ebighị ebi ka m ga na-emegide gị,

maọbụ na-egosi iwe m.

Ọ bụrụ na m emee otu a, mmụọ ndị mmadụ ụwa niile ga-ada mba,

ya na mkpụrụobi niile ahụ m ji aka m kpụọ.

17 Ewesoro m ha iwe nʼihi mmehie ha na oke ọchịchọ ha.

Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ji taa ha ahụhụ, gbakụtakwa ha azụ.

Ma lee, ha nọgidesikwara ike na-eme mmehie, na-eme ihe ọbụla nke na-atọ obi ha ụtọ.

18 Ahụla m ihe niile ha mere ma aga m agwọ ha.

Aga m edu ha, kasịekwa ndị na-eru ụjụ nʼIzrel obi.

19 Aga m eme ka abụ otuto dị nʼegbugbere ọnụ ha.

Udo, udo, dịrị ndị nọ nso na ndị nọ nʼebe dị anya,"

ka Onyenwe anyị kwuru.

"Aga m agwọkwa ha."

20 Ma ndị niile na-emebi iwu dị ka oke osimiri na-amagharị amagharị,

nke na-adịghị ezu ike mgbe ọbụla.

Ọ na-amapụtakwa ụrọ na apịtị.

21 "Ọ dịkwaghị udo dịrị onye na-emebi iwu," ka Chineke kwuru.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-