Publicidade

Isaías 56

Nzọpụta dịrị ndị ọzọ

1 Nke a bụ ihe Onyenwe anyị sịrị,

"Debenụ ikpe ziri ezi,

meekwanụ ihe ziri ezi.

Nʼihi na nzọpụta m dị nso,

ezi omume m ga-apụta ihe mgbe na-adịghị anya.

2 Ngọzị na-adịrị onye na-eme nke a,

bụ onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike,

onye ahụ nke na-edebe ụbọchị izuike m na-emerụghị ya,

nke na-edebekwa aka ya ka ọ ghara ime ihe ọjọọ."

3 Ka onye ala ọzọ bụ onye jikọrọ onwe ya na Onyenwe anyị sị,

"Onyenwe anyị aghaghị i site na ndị ya kewapụ m."

Ka onye onozi ọbụla gharakwa ị sị

"Mụ onwe m bụ naanị osisi kpọnwụrụ akpọnwụ."

4 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru:

"Nye ndị onozi ahụ na-edebe ụbọchị izuike m niile,

ndị na-ahọrọ ihe na-atọ m ụtọ,

na ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike.

5 Aga m enye ha nʼime ụlọ m na nʼetiti mgbidi ya,

ihe ncheta na aha

dị mma karịa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.

Aga m enye ha aha ga-adị ruo ebighị ebi

nke a na-agaghị echezọ ruo ebighị ebi.

6 Ma ndị mba ọzọ ndị gbakwuuru Onyenwe anyị

ijere ya ozi,

na ịhụ aha Onyenwe anyị nʼanya,

nakwa ị bụ ndị ohu ya,

ndị niile na-edebe ụbọchị izuike nsọ na-emerụghị ya,

na ndị jidesiri ọgbụgba ndụ m ike,

7 ndị a ka m ga-akpọta nʼugwu nsọ m,

meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime ụlọ ekpere m.

Aga m anabata aja nsure ọkụ ha na onyinye niile ha nyere

nʼebe ịchụ aja m.

Nʼihi na a ga-akpọ ụlọ m

Ụlọ Ekpere nye mba niile dị iche iche."

8 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara,

bụ onye ahụ na-eme ka Izrel si nʼebe ha gbapụrụ ọsọ lọta,

"Aga m achịkọtakwa ndị ọzọ tinyere ha

tinyekọtara na ndị ya achịkọtarala."

Ebubo Chineke megide ndị ajọọ omume

9 Bịanụ, unu anụmanụ niile nke oke ọhịa.

Bịanụ dọgbuo, unu ụmụ anụmanụ nke oke ọhịa.

10 Nʼihi na ndị na-eche ndị m nche kpuru ìsì.

Ha niile bụ ndị amamihe kọrọ.

Ha dị ka nkịta dara ogbi,

nke na-adịghị agbọ ụja.

Ha hụrụ ịrahụ ụra na ịrọ nrọ,

na idina ndina nʼanya.

11 Ha bụ nkịta na-eribiga nri oke;

ha adịghị enwe afọ ojuju.

Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ na-enweghị nghọta,

ha niile echela ihu nʼụzọ nke aka ha,

onye ọbụla na-agbalịsị ike ịchọta uru nke ya.

12 Onye ọbụla na-asị, "Bịa ka m weta mmanya,

ka anyị ṅụjuokwa mmanya nʼaba nʼanya afọ anyị.

Echi ga-adịkwa ka taa,

ma ọ bụkwanụ dị mma karịa."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-