Publicidade

Isaías 25

Toonu Onyenwe anyị

1 O Onyenwe anyị, ị bụ Chineke m;

aga m ebuli gị elu, nye aha gị otuto,

nʼihi na site na ntụkwasị obi zuruoke,

ị rụọla ọtụtụ ihe ịrịbama,

nke i tụrụ atụmatụ ha siterị nʼoge gara aga.

2 Nʼihi na i meela ka obodo ghọọ mkpọmkpọ ebe;

mee ka obodo e wusiri ike ghọọ ebe dakpọrọ adakpọ;

meekwa ka ebe siri ike nke ndị mba ọzọ ghọọ ebe obodo na-adịghịzi,

agaghị ewukwa ya ruo mgbe ebighị ebi.

3 Nʼihi nke a, ndị niile dị ike ga-asọpụrụ gị.

Obodo ndị ahụ na-emenye ndị mba ọzọ egwu ga-atụ gị egwu.

4 Nʼihi na ị bụụrụ onye na-enweghị ike ebe mgbaba;

ị bụkwaara ndị ogbenye ebe mgbaba nʼoge mkpa ha,

ebe nchebe siri ike nʼoge oke mmiri ozuzo,

na ndo nʼoge okpomọkụ.

Nʼihi na nkuume nke ndị na-adịghị emere mmadụ ebere

dị ka oke mmiri ozuzo nke na-amakwasị mgbidi,

5 dịkwa ka okpomọkụ nke na-adị nʼọzara.

Ị na-eme ka mkpọtụ nke ndị mba ọzọ kwụsị,

dịka ndo nke igwe ojii na-eweta si eme ka okpomọkụ dajụọ,

otu a ka abụ ọma nke ndị na-adịghị eme ebere si kwụsị.

6 Nʼelu ugwu a, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile

ga-anọ kwadooro ụwa niile oke oriri.

Ọ ga-abụ oke oriri nke ga-adịrị ndị niile.

Oke oriri nke ezi anụ na mmanya dị mma ga-adị.

7 Nʼelu ugwu a, ka ọ ga-ewepụ ihe ndị ahụ niile na-eweta ihu mgbarụ,

nke dị ka akwa e ji kpuchie mmadụ niile,

nke kpuchikwara ihu ndị mba niile.

8 Ọ ga-elomi ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.

Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-ehicha anya mmiri niile

site nʼihu mmadụ niile,

ọ ga-ewezuga ihe ịta ụta niile

dakwasịrị ndị ya site nʼụwa niile.

Onyenwe anyị ekwuola ya.

9 Nʼụbọchị ahụ, ndị mmadụ ga-asị,

"Nke a bụ Chineke anyị nʼezie,

anyị tụkwasịrị ya obi, ọ zọpụtakwara anyị.

Nke a bụ Onyenwe anyị ahụ, anyị tụkwasịrị ya obi,

ka anyị nwee ọṅụ ma ṅụrịakwa na nzọpụta ya."

10 Nʼihi na aka Onyenwe anyị ga-adịgide nʼelu ugwu a,

ma a ga-azọtọ ndị Moab nʼọnọdụ ha,

dịka esi azọda ahịhịa dị nʼokpuru ụkwụ mmadụ.

11 Ha ga-agbasa aka ha abụọ nʼime ya,

dịka onye na-egwu mmiri si agbasapụ aka ya,

ma Chineke ga-eweda mpako ha niile,

nʼagbanyeghị ọrụ aghụghọ niile nke aka ha.

12 Ọ ga-akwatu mgbidi gị niile dị elu nke e wusiri ike,

mee ka ha daruo ala,

ọ ga-eme ka ha daruo ala,

ruo mgbe ha ghọrọ uzuzu.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-