Publicidade

Isaías 50

Mmehie Izrel na nrube isi nke ohu ahụ

1 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,

"Olee ebe akwụkwọ m ji gbaa nne unu alụkwaghị m dị

bụ nke m ji chụpụ ya?

Ma ọ bụ onye nʼime ndị m ji ụgwọ

ka m resiri unu?

Ọ bụ nʼihi mmehie unu ka e ji ree unu;

nʼihi mmebi iwu unu ka e jiri chụọ nne unu.

2 Gịnị mere o ji bụrụ na o nweghị onye nọ ya mgbe m bịara?

Gịnị mere o nweghị onye zara m mgbe m kpọrọ oku?

Ọ pụtara na aka m dị mkpụmkpụ ịzọpụta unu?

Ọ ga-abụ na m enwekwaghị ike ịzọpụta?

Nʼihi na enwere m ike ịbara osimiri mba mee ya ka ọ ghọọ ala akọrọ.

Enwere m ike ime ka osimiri ghọrọ ọzara,

ka azụ niile dị nʼime ya nwụọ

nʼihi enweghị mmiri.

3 Ọ bụ mụ bụ onye ahụ na-eme ka ọchịchịrị kpuchie ihu eluigwe,

ka ihu eluigwe dịrị ka ihu onye na-eru ụjụ."

4 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị enyela m amamihe ya

ka m nwee ike ịmata ihe m ga-agwa ndị a ike gwụrụ.

Ụtụtụ niile ka ọ na-akpọte mmụọ m,

meghee akpa uche m, ime ka m ghọta uche ya.

5 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị emeghela ntị m abụọ,

ma enupughị m isi,

a tụgharịkwaghị m azụ.

6 Azụ m ka m megheere ndị tiri m ihe;

agba nti m abụọ ka m hapụụrụ ndị hopusiri m afụọnụ m.

Ezopụghị m ihu m

nʼebe ndị na-akwa emo, na ndị na-agbụ ọnụ mmiri nọ.

7 Ebe ọ bụ na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-enyere m aka,

ihere agaghị eme m.

Nʼihi ya, ejikerela m onwe m ime uche ya; agaghị m elekwa anya nʼazụ,

a maara m na ihere agaghị eme m.

8 Nʼihi na onye na-agụ m nʼonye ezi omume nọ nso.

Onye ga-apụta ibo m ebubo?

Ya pụta ka anyị guzo ihu na ihu!

Onye nwere ebubo megide m?

Ya bịa ka anyị kwuo ya.

9 Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka.

Onye pụrụ ịma m ikpe?

Lee, ha niile ga-aka nka dịrị ka uwe,

nla ga-erichapụkwa ha.

10 Onye nʼetiti unu bụ onye ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị,

na-egekwa ntị nʼokwu odibo ya?

Ka onye ahụ na-eje ije nʼọchịchịrị,

nke na-enweghị ìhè ọbụla,

tụkwasị obi nʼaha Onyenwe anyị

daberekwa na Chineke ha.

11 Ma lee, unu niile ndị na-amụnye ọkụ,

ndị meere onwe ha ọwaọkụ,

nke unu ji na-ejegharị nʼọchịchịrị,

gaanụ nʼihu na-ejegharị nʼìhè ọkụ ahụ unu mụnyeere onwe unu.

Ihe unu ga-anata site nʼaka Onyenwe anyị

bụ ihe mwute nke ga-abịakwasị unu.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-