Publicidade

Isaías 55

Bịanụ ndị akpịrị na-akpọ nkụ

1 Gee ntị, bịa onye ọbụla akpịrị na-akpọ nkụ,

bịanụ na mmiri,

unu ndị na-enweghị ego

bịanụ zụọ, riekwa.

Bịanụ, zuru mmanya na mmiri ara ehi

na-ejighị ego na-arụghị ọnụahịa ọbụla.

2 Nʼihi gịnị ka i ji na-atụfu ego gị ịzụ ihe na-abụghị ezi nri?

Gịnị mere i ji na-adọgbu onwe gị nʼọrụ nʼihe na-apụghị iju gị afọ?

Gee ntị, geenụ m ntị nke ọma, rie ezigbo nri

mkpụrụobi gị ga-enwe afọ ojuju na nri dị ezi mma!

3 "Tọọnụ ntị unu nʼala, bịakwute m!

Gee ntị, ka inwe ike dị ndụ.

Mụ na unu ga-aba nʼọgbụgba ndụ ebighị ebi,

bụ ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi nke m kwere Devid na nkwa.

4 Lee, emere m ya ka ọ ghọọrọ ndị niile dị iche iche onyeama,

ka ọ bụrụ onyendu na onyeisi ọchịchị nye ndị niile dị iche iche.

5 Nʼezie, gị onwe gị ga-akpọku mba dị iche iche na i maghị,

mba ndị ahụ na-amaghị gị ga-ejikwa ọsọ gbakwute gị,

nʼihi Onyenwe anyị Chineke gị,

Onye nsọ nke Izrel,

nʼihi na o meela ka ị bụrụ ihe dị oke mma."

6 Chọọnụ Onyenwe anyị mgbe a ga-achọta ya.

Kpọkuonụ ya mgbe ọ nọ nso.

7 Ka onye na-eme ihe ọjọọ hapụ ụzọ ya,

ka onye ajọ omume hapụ echiche ọjọọ ya niile.

Ka ha tụgharịa bịakwute Onyenwe anyị, ọ ga-emere ha ebere,

ha bịakwute Chineke anyị, nʼihi na ọ ga-agbaghara ha mmehie ha niile.

8 "Nʼihi na echiche m ha abụghị echiche unu,

ụzọ unu niile, ha abụkwaghị ụzọ m,"

ka Onyenwe anyị kwupụtara.

9 "Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa,

otu a ka ụzọ m niile si dị elu karịa ụzọ unu niile,

otu a kwa ka echiche m niile si dị elu karịa echiche unu niile.

10 Dịka mmiri na mkpụrụ mmiri

si esi nʼeluigwe ada nʼụwa

na-alaghachighị nʼeluigwe

ma ọ bụrụ na o meghị ka mmiri dee ala,

mee ka ihe ubi pupụta, too eto,

meekwa ka ọ mịa mkpụrụ nye onye na-akụ ihe ọkụkụ, bụrụkwa ihe oriri nye onye na-eri nri.

11 Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị.

Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu.

Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee,

baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya.

12 Nʼihi na unu ga-eji ọṅụ pụọ,

a ga-esikwa nʼebe ahụ dupụta unu nʼudo.

Ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile

na osisi niile nke ubi,

ga-eti mkpu ọṅụ,

kụọkwa aka nʼobi ụtọ.

13 Ebe ogwu na-eto na mbụ, osisi junipa ga-eto na ya;

ebe uke toro, osisi mietul ga-eto na ya.

Ihe ndị a ga-aghọrọ Onyenwe anyị aha dị ukwuu,

nke ga-abụkwa ihe ịrịbama

ga-adị ruo mgbe ebighị ebi."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-