Publicidade

Isaías 19

Amụma e buru banyere Ijipt

1 Nke a bụ amụma megide Ijipt:

Lee, Onyenwe anyị na-abịa imegide Ijipt,

ọ na-anọkwasịkwa nʼeluigwe ojii nke na-agba ọsọ.

Arụsị ndị Ijipt niile na-ama jijiji nʼihu ya.

Ọzọ, nʼihi ụjọ obi ndị Ijipt na-agbaze nʼime onwe ha.

2 "Aga m akpali ndị Ijipt mee ka ha lụọ ọgụ nʼetiti onwe ha.

Nwanne ga-emegide nwanne ya,

onye agbataobi ga-emegidekwa onye agbataobi ya;

obodo ga-emegide isi obodo;

otu a kwa, alaeze ga-emegidekwa alaeze.

3 Ndị Ijipt ga-ada mba nʼime mmụọ ha,

aga m eme ka nzube ha niile bụrụ ihe efu,

ha ga-ajụta arụsị na mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase,

jụọkwa ndị na-ajụta mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa.

4 Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya sị,

Ọ bụ nʼaka eze afọ tara mmiri,

nke na-adịghị eme ebere,

ka m ga-enyefe ndị Ijipt, ka ọ bụrụ onye ga-achị ha."

5 Mmiri dị nʼosimiri ga-atada;

ọ ga-atakwa takọrọkwa.

6 Ụzọ niile osimiri Ijipt ahụ si asọgharị

ga-atalata bido nʼisi isi.

Ahịhịa riidi niile na amị niile ga-akpọnwụsịkwa.

7 Ahịhịa ndụ niile dị nʼakụkụ Naịl ga-akpọnwụ,

ifufe ga-efesakwa ha.

Mkpụrụ niile a kụrụ nʼebe ahụ ga-ala nʼiyi,

ihe niile ga-anwụ.

8 Ndị ọkụ azụ ga-asụ ude, kwaa ụwa,

na ndị niile na-atụba nko azụ nʼime Naịl,

ndị na-agha ụgbụ nʼelu mmiri

ga-ata ahụ.

9 Ndị nʼarụ ọrụ flakisi etiri eti ga-eru ụjụ,

na ndị na-akpa akwa ọcha ka olileanya ha ga-agharịpụ.

10 Obi ụtọ agaghị adịkwara ndị na-esite nʼịkpa akwa enweta ego,

ha na ndị ọrụ dị iche iche a na-akwụ ụgwọ.

11 Naanị ndị nzuzu ka ndịisi Zoan bụ,

ndụmọdụ na-enweghị isi ka ndị na-adụ eze Ijipt ọdụ na-enye.

Ị ga-esi aṅaa gwa Fero,

"Abụ m otu nʼime ndị maara ihe,

onye si nʼagbụrụ ndị eze ochie"?

12 Ebee ka ndị ikom gị ahụ maara ihe nọ ugbu a?

Ka ha gosi gị ma meekwa ka ị maara,

ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile

zubere megide Ijipt.

13 Ndịisi obodo Zoan aghọọla ndị nzuzu,

ndịisi obodo Memfis aghọkwaala ndị e duhiere eduhie;

ndị bụ nkume isi nkuku nke ndị ya niile

eduhiela ndị Ijipt ụzọ.

14 Onyenwe anyị awụnyela nʼime ha

mmụọ nzuzu nke uche na-ezughị oke;

nke mere ka Ijipt na-adagharị nʼihe niile ọ na-eme

dịka onye ṅụbigara mmanya oke si adagharị nʼihe ọ gbọrọ.

15 Ọ dịghị ihe Ijipt nwere ike ime,

isi maọbụ ọdụ; alaka nkwụ maọbụ osisi achara.

16 Nʼụbọchị ahụ, ndị ikom Ijipt ga-adị ka ndị inyom, ha ga na-ama jijiji nʼegwu nʼihi aka ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile weliri elu imegide ha. 17 Ala Juda ga-ewetara ndị Ijipt oke egwu, oke ụjọ ga-atụ onye ọbụla akpọtaara aha Juda, nʼihi ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ezube megide ha.

18 Nʼụbọchị ahụ, obodo ise nʼime ala Ijipt ga-asụ asụsụ Kenan, ṅụọ iyi irubere Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile isi. Otu nʼime obodo ndị a ka a ga-akpọ Obodo anwụ.

19 Nʼụbọchị ahụ, ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja ga-adị nʼetiti ala Ijipt. A ga-ewukwa otu ogidi ncheta nye Onyenwe anyị nʼoke ala ha. 20 Nke a ga-abụ ihe ama na ihe ngosi, na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọkwa nʼIjipt. Mgbe ha kpọkuru Onyenwe anyị maka ndị na-emegbu ha, ọ ga-aza ha, ọ ga-ezitere ha onye nzọpụta, onye ga-azọpụta ha. 21 Ya mere, Onyenwe anyị ga-eme ka ndị Ijipt mara onye ọ bụ, nʼụbọchị ahụ, ha ga-amata Onyenwe anyị, jirikwa ịchụ aja na onyinye fee ya. Ha ga-ekwe Onyenwe anyị nkwa debekwa ya. 22 Onyenwe anyị ga-eti Ijipt ihe otiti, ma ọ ga-agwọkwa ha. Ndị Ijipt ga-alọghachikwute Onyenwe anyị, ọ ga-aṅakwa ntị nʼarịrịọ ha gwọọkwa ha.

23 Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe okporoụzọ atụliri atụli nke ga-esite na Ijipt ruo Asịrịa. Ndị Asịrịa ga-aga Ijipt, ndị Ijipt ga-agakwa Asịrịa, ndị Ijipt na ndị Asịrịa ga-eso fee ofufe. 24 Nʼụbọchị ahụ ka Izrel ga-abụ nke atọ imezu Ijipt na Asịrịa, bụrụ ngọzị nʼụwa. 25 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-agọzi ha, na-asị, "Ka ngọzị dịrị Ijipt, ndị m, dịrị Asịrịa nke bụ akaọrụ m, na Izrel ihe nketa nke m."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-