Pular para o conteúdo
Publicidade

Aịzaya 19

Amụma e buru banyere Ijipt

1 Nke a bụ amụma megide Ijipt:

Lee, Onyenwe anyị na-abịa imegide Ijipt,

na-anọkwasịkwa nʼeluigwe ojii nke na-agba ọsọ.

Arụsị ndị Ijipt niile na-ama jijiji nʼihu ya.

Ọzọ, nʼihi ụjọ obi ndị Ijipt na-agbaze nʼime onwe ha.

2 "Aga m akpali ndị Ijipt mee ka ha lụọ ọgụ nʼetiti onwe ha.

Nwanne ga-emegide nwanne ya,

onye agbataobi ga-emegidekwa onye agbataobi ya;

obodo ga-emegide isi obodo;

otu a kwa, alaeze ga-emegidekwa alaeze.

3 Ndị Ijipt ga-ada mba nʼime mmụọ ha,

aga m eme ka nzube ha niile bụrụ ihe efu,

ha ga-ajụta arụsị na mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase,

jụọkwa ndị na-ajụta mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa.

4 Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya sị,

bụ nʼaka eze afọ tara mmiri,19:4 Eze Shabaka, onye Kush chịrị ala Ijipt na senchuri nke asaa. Aịz 20:4; Jer 46:26; Izk 29:19

nke na-adịghị eme ebere,

ka m ga-enyefe ndị Ijipt, ka bụrụ onye ga-achị ha."

5 Mmiri dị nʼosimiri ga-atada;

ga-atakwa takọrọkwa.

6 Ụzọ niile osimiri Ijipt ahụ si asọgharị

ga-atalata bido nʼisi isi.

Ahịhịa riidi niile na amị niile ga-akpọnwụsịkwa.

7 Ahịhịa ndụ niile dị nʼakụkụ Naịl ga-akpọnwụ,

ifufe ga-efesakwa ha.

Mkpụrụ niile a kụrụ nʼebe ahụ ga-ala nʼiyi,

ihe niile ga-anwụ.

8 Ndị ọkụ azụ ga-asụ ude, kwaa ụwa,

na ndị niile na-atụba nko azụ nʼime Naịl,

ndị na-agha ụgbụ nʼelu mmiri

ga-ata ahụ.

9 Ndị nʼarụ ọrụ flakisi etiri eti ga-eru ụjụ,

na ndị na-akpa akwa ọcha ka olileanya ha ga-agharịpụ.

10 Obi ụtọ agaghị adịkwara ndị na-esite nʼịkpa akwa enweta ego,

ha na ndị ọrụ dị iche iche a na-akwụ ụgwọ.

11 Naanị ndị nzuzu ka ndịisi Zoan bụ,

ndụmọdụ na-enweghị isi ka ndị na-adụ eze Ijipt ọdụ na-enye.

ga-esi aṅaa gwa Fero,

"Abụ m otu nʼime ndị maara ihe,

onye si nʼagbụrụ ndị eze ochie"?

12 Ebee ka ndị ikom gị ahụ maara ihe nọ ugbu a?

Ka ha gosi gị ma meekwa ka maara,

ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile

zubere megide Ijipt.

13 Ndịisi obodo Zoan aghọọla ndị nzuzu,

ndịisi obodo Memfis19:13 Memfis bụ isi obodo ndị Ijipt nʼoge ochie. Izk 30:13; Hos 9:6 aghọkwaala ndị e duhiere eduhie;

ndị bụ nkume isi nkuku nke ndị ya niile

eduhiela ndị Ijipt ụzọ.

14 Onyenwe anyị awụnyela nʼime ha

mmụọ nzuzu nke uche na-ezughị oke;

nke mere ka Ijipt na-adagharị nʼihe niile na-eme

dịka onye ṅụbigara mmanya oke si adagharị nʼihe gbọrọ.

15 dịghị ihe Ijipt nwere ike ime,

isi maọbụ ọdụ; alaka nkwụ maọbụ osisi achara.

16 Nʼụbọchị ahụ, ndị ikom Ijipt ga-adị ka ndị inyom, ha ga na-ama jijiji nʼegwu nʼihi aka ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile weliri elu imegide ha. 17 Ala Juda ga-ewetara ndị Ijipt oke egwu, oke ụjọ ga-atụ onye ọbụla akpọtaara aha Juda, nʼihi ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ezube megide ha.

18 Nʼụbọchị ahụ, obodo ise nʼime ala Ijipt ga-asụ asụsụ Kenan, ṅụọ iyi irubere Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile isi. Otu nʼime obodo ndị a ka a ga-akpọ Obodo anwụ.

19 Nʼụbọchị ahụ, ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja ga-adị nʼetiti ala Ijipt.19:19 Jen 28:18; Ọpụ 24:4; Jos 22:10,26,27 A ga-ewukwa otu ogidi ncheta nye Onyenwe anyị nʼoke ala ha. 20 Nke a ga-abụ ihe ama na ihe ngosi, na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọkwa nʼIjipt. Mgbe ha kpọkuru Onyenwe anyị maka ndị na-emegbu ha, ga-aza ha, ga-ezitere ha onye nzọpụta, onye ga-azọpụta ha. 21 Ya mere, Onyenwe anyị ga-eme ka ndị Ijipt mara onye bụ, nʼụbọchị ahụ, ha ga-amata Onyenwe anyị, jirikwa ịchụ aja na onyinye fee ya. Ha ga-ekwe Onyenwe anyị nkwa debekwa ya. 22 Onyenwe anyị ga-eti Ijipt ihe otiti, ma ga-agwọkwa ha. Ndị Ijipt ga-alọghachikwute Onyenwe anyị, ga-aṅakwa ntị nʼarịrịọ ha gwọọkwa ha.

23 Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe okporoụzọ atụliri atụli nke ga-esite na Ijipt ruo Asịrịa. Ndị Asịrịa ga-aga Ijipt, ndị Ijipt ga-agakwa Asịrịa, ndị Ijipt na ndị Asịrịa ga-eso fee ofufe. 24 Nʼụbọchị ahụ ka Izrel ga-abụ nke atọ imezu Ijipt na Asịrịa, bụrụ ngọzị nʼụwa. 25 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-agọzi ha, na-asị, "Ka ngọzị dịrị Ijipt, ndị m, dịrị Asịrịa nke bụ akaọrụ m, na Izrel ihe nketa nke m."

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também