Pular para o conteúdo
Publicidade

Ano novo

Por Bíblia Online

O Ano Novo é oportunidade de renovação e consagração. A Bíblia convida a esquecer o que ficou para trás e avançar em fé, confiança e esperança em Deus.

Ụmụnna m, nʼezie, abụbeghị m ihe ahụ m kwesiri ịbụ. Ma ihe m ji ike m niile na-eme bụ ichefu ihe niile ndị gara aga, na ilekwasị anya nʼihe ahụ m na-agbaso bụ nke dị m nʼihu. Ana m agbasi ọsọ ike iji gbaruo nʼisi, maka irite ihe ahụ a na-agbata nʼọsọ, bụ ọkpụkpọ ịbanye na ndụ eluigwe ahụ nke Chineke kpọrọ m site na Jisọs Kraịst.

Eleghị anya nʼazụ

Anaghị m ekwu na m etozuola oke, maọbụ nwezuo ihe niile. Ma a na m agbalịsi ike ka m jide ihe ahụ nke Kraịst Jisọs jidere m nʼihi ya. Ụmụnna m, nʼezie, abụbeghị m ihe ahụ m kwesiri ịbụ. Ma ihe m ji ike m niile na-eme bụ ichefu ihe niile ndị gara aga, na ilekwasị anya nʼihe ahụ m na-agbaso bụ nke dị m nʼihu. Ana m agbasi ọsọ ike iji gbaruo nʼisi, maka irite ihe ahụ a na-agbata nʼọsọ, bụ ọkpụkpọ ịbanye na ndụ eluigwe ahụ nke Chineke kpọrọ m site na Jisọs Kraịst.

Ịṅomi ụzọ Pọl

Ka anyị niile, bụ ndị tozuru oke nʼime mmụọ nwee uche dị otu a. bụrụkwa na ụfọdụ nʼime unu nwere uche ọzọ dị iche, Chineke ga-ekpughere unu nke a.

Ya mere, bụrụ na onye ọbụla amalite ịdị ndụ nʼime Kraịst, ghọọla onye e kere ọhụrụ, ihe ochie agaala, nke ọhụrụ anọchie.

Olileanya dị ndụ

Otuto dịrị Chineke Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst! Site nʼịba ụba nke ebere ya, o nyela anyị ndụ ọhụrụ baa nʼolileanya dị ndụ site na mbilite nʼọnwụ Jisọs Kraịst.

Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke,

nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.

Achụpụla m nʼihu gị,

anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị.

Dere duu nʼihu Onyenwe anyị,

were ndidi chere ya;

echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu,

mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile.

Jiri aka gị tulee ma hụkwa na Onyenwe anyị dị mma;

onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya.

ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị,

ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ.

Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo.

Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha;

ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.

Nʼihi na mụ onwe m maara echiche niile m na-eche banyere unu," ka Onyenwe anyị kwubiri, "echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, bụkwaghị echiche ime unu ihe ọjọọ, echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, na olileanya kwesiri ntụkwasị obi.

Aga m efekwasị unu mmiri dị ọcha, unu ga-adịkwa ọcha. Aga m eme ka unu dị ọcha site na-adịghị ọcha unu niile, na site nʼikpere arụsị unu niile. Aga m enye unu obi ọhụrụ, kenyekwa unu mmụọ ọhụrụ. Aga m ewepụ obi nkume nke mmehie dị nʼime unu, nye unu mkpụrụobi nke anụ ahụ. Aga m etinyekwa mmụọ m nʼime unu, mee ka unu gbaso ụkpụrụ m niile ma lezie anya mekwaa ihe niile m nyere nʼiwu.

Nke kachasị nke, kwerenụ ka ịhụnanya na-achị achị na ndụ unu, nʼihi na bụ nke a na-ejikọta ihe niile nʼotu.

Ka udo Kraịst na-achị achị nʼime obi unu, ebe unu bụ akụkụ nke otu anụ ahụ ahụ, a kpọrọ unu ka unu nọdụ nʼudo. Mgbe niile, nọọnụ na-ekele.

O meela ka ihe niile maa mma nʼoge nke ya. O tinyekwala ebighị ebi nʼime obi ndị mmadụ; ma o nweghị ka mmadụ ghọta ọrụ Chineke site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ.

Ha na-azụ anyị nwa oge nta dị ka ha si tụpụta nʼuche ha. Ma na-azụ anyị nʼihi ọdịmma anyị. na-achọ ka anyị keta oke nʼịdị nsọ ya. Mgbe ọbụla a na-ezi anyị ihe site nʼinye anyị ahụhụ, na-abụrụ anyị ihe mwute nʼoge ahụ, bụghịkwa ihe ọṅụ. Ma e mesịa, na-eweta udo na ndụ ezi omume nye ndụ ahụ azụrụ nʼime ya.

Ịnya isi banyere ihe echi ga-abụ

Ugbu a geenụ ntị unu bụ ndị na-asị, "Taa maọbụ echi, anyị ga-aga ebe dị otu a, maọbụ obodo dị otu a, ịzụ ahịa na ire ahịa, anyị ga-anọkwa ebe ahụ otu afọ kpaa ego." Olee otu unu si mara ihe ga-eme echi? Gịnị ka unu na-eche na ndụ unu bụ? Mmadụ dị ka anwụrụ ọkụ nke a na-ahụ anya nwa oge nta, nke ikuku na-emesịa bufuo. Kama ihe unu ga-ekwu bụ nke a, "bụrụ na Onyenwe anyị ekwe, anyị ga-adị ndụ, mee nke a maọbụ nke ọzọ." Ma ihe unu na-eme bụ ịnya isi na ịkpa nganga. Ụdị ịnya isi a bụ ihe ọjọọ. Ya mere, mmadụ ọbụla maara ihe bụ ezi ihe ma jụ ime ya na-emehie.

Seja o primeiro