Publicidade

Miquéias 2

Nzube mmadụ na nzube Chineke

1 Ahụhụ na-adịrị ndị na-eche ihe ọjọọ nʼobi ha,

na ndị niile na-edina nʼakwa ha na-eche ajọ echiche.

Mgbe chi bọrọ, ha na-arụzu ihe ha chepụtara,

nʼihi na ikike imezu ya dị nʼaka ha.

2 Ha na-enwe anya ukwu nʼebe ubi ndị ọzọ dị, were ha nʼaka ike,

na ụlọ dị iche iche, ha ewere ha nʼike.

Ha na-ejikwa aka ike nara ndị mmadụ ụlọ ha,

ha na-ezunara ha ihe nketa ha.

3 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị na-asị,

"Lee, ana m akwado ihe ọjọọ megide agbụrụ a,

nke unu na-enweghị ike isite na ya wezuga onwe unu.

Unu agaghị eji nganga na-ejegharịkwa,

nʼihi na ọ ga-abụ oge ọjọọ.

4 Nʼụbọchị ahụ ha ga-akọcha unu,

ha ga-abụrụ unu abụ iru ụjụ iji ya kọchaa unu na-asị,

‘Anyị abụrụla ndị lara nʼiyi,

e kesaala ihe nnweta nke ndị m,

ọ napụla m ha.

O werela ubi anyị nyefee ha nʼaka ndị ahụ meriri anyị nʼagha.’ "

5 Nʼihi ya, ọ dịkwaghị onye ga-afọdụ nʼetiti ọgbakọ nke Onyenwe anyị,

onye ga-eji ihe ọtụtụ kee ala ahụ site nʼife nza.

Ndị amụma ụgha

6 Ndị amụma ha na-asị, "Unu ebukwala amụma."

"Unu ebukwala amụma banyere ihe ndị a,

ihere agaghị eme anyị."

7 Ụdị ihe a o kwesiri okwukwu, gị ụlọ Jekọb?

"Ntachiobi Onyenwe anyị ọ gwụla?

Ihe ndị a ọ bụ otu o si eme?"

"Ọ bụ na okwu m adịghị eme

onye ụzọ ya ziri ezi mma?

8 Ma ọ bụ unu na-ebili megide ndị m

dịka ndị iro.

Unu na-eyipụ ndị na-agafe agafe

uwe ọma ha yi nʼahụ ha na-enweghị mmetụta,

dịka a ga-asị na unu bụ ndị si nʼagha na-alọta.

9 Unu na-achụpụ ndị inyom ndị m

site nʼụlọ afọ ojuju ha.

Ụmụ ha ka unu na-anapụ ngọzị m

ruo mgbe ebighị ebi.

10 Bilienụ, pụọnụ,

nʼihi na ebe a abụkwaghị ebe izuike,

nʼihi na-emerụọla ya, e bibiela ya,

o bibikwaala, ruo na-ịrụzi ya agaghị adị ire.

11 Ọ bụrụ na otu onye abịa buoro unu amụma ụgha na-asị,

‘Aga m eburu unu amụma banyere mmanya na ihe ọṅụṅụ siri ike,’

ọ bụ onye amụma dị otu a ka ndị a chọrọ.

Nkwa nzọpụta

12 "Aga m achịkọta unu niile, gị Jekọb,

aga m akpọkọta ndị niile fọdụrụ nʼIzrel nʼotu ebe.

Aga m akpọkọta ha dịka atụrụ nʼime ọgba anụ,

dịka igwe ewu na atụrụ nʼebe ịta nri ya,

ndị mmadụ ga-ejupụtakwa nʼebe ahụ.

13 Onye ahụ na-egbuwa ụzọ ga-anọ nʼihu na-edu ha.

Ha ga-etipukwa ọnụ ụzọ ama ahụ, ma site na ya gafee.

Eze ha ga-agabigakwa nʼihu ha,

Onyenwe anyị ga-anọ nʼisi."

Veja também

Publicidade
Miquéias
Ver todos os capítulos de Miquéias
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-