Publicidade

Miquéias 3

Ịba mba nye ndịisi na ndị amụma

1 Mgbe ahụ ekwuru m sị,

"Geenụ ntị unu ndịisi ụlọ Jekọb,

na unu ndị na-achị ezinaụlọ Izrel.

Ọ bụ na unu ekwesighị ịmata ikpe ziri ezi

2 unu bụ ndị kpọrọ ezi ihe asị ma na-ahụ ajọ ọrụ nʼanya.

Unu na-agba ndị m akpụkpọ na ndụ

na-agbapụkwa anụ ahụ kpuchiri ọkpụkpụ ha.

3 Unu na-erida anụ ahụ ndị nke m,

na-agba ha akpụkpọ,

na-etijisi ọkpụkpụ ha,

na-egburi anụ ahụ ha,

dịka anụ a na-esinye nʼite."

4 Mgbe ahụ ha ga-akpọku Onyenwe anyị,

ma ọ gaghị aza ha!

Mgbe oge ahụ bịaruru, ọ ga-ezo ihu ha site nʼebe ha nọ

nʼihi ihe ọjọọ nke ha mere.

5 Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru:

"Banyere ndị amụma

bụ ndị na-eduhie ndị m,

mgbe ha nwere ihe ha ga-eri,

ha na-ekwusa ‘Udo’

ma ọ bụrụ na mmadụ enyeghị ha nri,

ha na-ebili buo agha megide onye dị otu a.

6 Ya mere nʼabalị ga-abịakwasị ha, napụ ha ike ịhụ ọhụ;

ọchịchịrị ga-ekpuchi ha, ka ha ghara ịjụta ase ọbụla.

Anwụ ga-ada nʼebe ndị amụma ahụ nọ,

ụbọchị ga-agbakwa ọchịchịrị nye ha.

7 Ndị ọhụ ụzọ ka ihere ga-eme,

ndị na-ajụ ase ka a ga-emebọ.

Ha ga-ekpuchi ihu ha,

nʼihi na ọsịsa ọbụla agaghị esite nʼebe Chineke nọ bịara ha."

8 Ma mụ onwe m, ejupụtara m nʼike,

ejupụtara m na Mmụọ nke Onyenwe anyị,

jupụtakwa na mmụọ nke ikpe ziri ezi,

na nke ịdị ike ikwupụta nye Jekọb njehie ya,

na nye Izrel mmehie ya.

9 Geenụ ntị unu ndị na-achị ezinaụlọ Jekọb,

na unu ndịisi ezinaụlọ Izrel.

Ndị kpọrọ ikpe ziri ezi asị,

ma na-ewere ihe niile na-ezighị ezi nʼọnọdụ ihe ziri ezi.

10 Ndị ji ọbara wuo Zayọn,

werekwa ajọ omume wuo Jerusalem.

11 Ndịisi ya na-ekpe ikpe nʼihi ngarị,

ndị nchụaja ya na-akụzi ihe nʼihi ụgwọ,

ebe ndị amụma ya na-ajụta ase nʼihi ego.

Ma ha dabere na Onyenwe anyị na-asị,

"Onyenwe anyị ọ nọnyeereghị anyị?

O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị anyị."

12 Ọ bụ nʼihi gị

ka a ga-akọgharị Zayọn dịka ala ubi,

Jerusalem ga-aghọ ebe e kpokọtara nkume na ngwongwo ụlọ dakpọrọ adakpọ,

ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ ga-aghọ ebe dị elu nke oke ọhịa tochiri.

Veja também

Publicidade
Miquéias
Ver todos os capítulos de Miquéias
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-