Publicidade

Arca da aliança

Por Bíblia Online

A Arca da Aliança era o símbolo mais sagrado de Israel — representava a presença de Deus no meio do seu povo. Sobre ela brilhava a glória do Senhor entre os querubins.

Igbe ọgbụgba ndụ

"Ha ga-eji osisi akashia wuo igbe ọgbụgba ndụ nke ịdị ogologo ya ga-abụ otu mita na sentimita iri. Obosara ya bụ sentimita iri isii na asatọ. Ịla elu ya ga-abụkwa sentimita iri isii na asatọ. Machie ọlaedo a nụchara anụcha nʼime na azụ ya niile, jiri ọlaedo kpụọ ihe gburugburu akụkụ ya niile. Kpụọ mgbaaka ọlaedo anọ maka ya, kwụnye ha nʼụkwụ anọ ya, ya bụ mgbaaka abụọ nʼotu akụkụ, mgbaaka abụọ nʼakụkụ nke ọzọ ya Jirikwa osisi akashia mee mkpara ogologo. Emesịa, were ọlaedo machie mkpara ndị a. ga-etinye mkpara ndị ahụ nʼime mgbaaka ahụ dị nʼakụkụ igbe ahụ, ka bụrụ ihe iji na-ebu ya. Nʼihi nke a, mkpara ọlaedo ndị ahụ ga-adịgide nʼime mgbaaka ọlaedo igbe a oge niile. Ya mere, mgbe a rụsịrị igbe ọgbụgba ndụ ahụ, tinye Ihe Ama ahụ m nyere gị nʼime ya.

"ga-ejikwa ọlaedo a nụchara anụcha mee ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Ogologo ya ga-adị nzọ ụkwụ anọ. Obosara ya ga-abụ nzọ ụkwụ abụọ na ọkara. ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha, nke e tipịara etipịa kpụọ cherubim abụọ na nsọtụ abụọ nke ebe mkpuchi ahụ. Rụọ otu cherub nʼotu nsọtụ, otu cherub na nsọtụ nke ọzọ; mee ka cherubim ndị a na okwuchi igbe ahụ bụrụ otu na nsọtụ abụọ ahụ. Cherubim ndị a ga-agbasa nku ha laa elu, were ha na-ekpuchi okwuchi ahụ. Cherubim ndị ahụ ga-eche onwe ha ihu, na-ele anya nʼebe okwuchi ahụ dị. Tụkwasị ihe mkpuchi ahụ nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Tinyekwa Ihe Ama ahụ m nyere gị nʼime igbe ahụ.

Nʼebe ahụ, nʼetiti cherubim abụọ ndị ahụ dị nʼelu ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ, ka m ga-ezute gị, nye gị iwu niile ga-enye ndị Izrel.

Igbe Ọgbụgba ndụ

Bezalel ji osisi akashia wuo igbe ọgbụgba ndụ nke ịdị ogologo ya bụ otu mita na sentimita iri. Obosara ya ga-abụ sentimita iri isii na asatọ. Ịla elu ya ga-abụkwa sentimita iri isii na asatọ.

Nguzo e guzobere ụlọ nzute

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, "Guzobe ụlọ nzute ahụ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ. Dọnye igbe ọgbụgba ndụ nke Ihe Ama ahụ nʼime ya. Konyekwa akwa mgbochi nke ga-ezo ya.

O tinyere Ihe Ama nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Emesịa, tụkwasịkwara mkpara e ji ebu igbe ahụ nʼakụkụ igbe ahụ, were okwuchi igbe ahụ, nke bụ Oche Ebere ahụ, kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ. Emesịa, o bubatara igbe ahụ nʼime ụlọ nzute ahụ, kwụnyekwa akwa mgbochi nke mgbochi, kewapụ igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.

Mgbe Mosis banyere nʼụlọ ikwu ahụ ka ya na Onyenwe anyị kparịa ụka, nụrụ olu ahụ ka na-agwa ya okwu site nʼetiti cherubim abụọ ndị ahụ nʼelu ebe mkpuchi mmehie dị nʼelu igbe iwu ọgbụgba ndụ gwa ya okwu. Nʼụzọ dị otu a ka Onyenwe anyị si gwa ya okwu.

Ya mere ha sitere nʼugwu Onyenwe anyị bilie ije. Jeekwa ije abalị atọ. Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-aga ha nʼihu ụbọchị atọ ndị ahụ niile ịchọtara ha ebe ha ga-akwụsị zuo ike. Igwe ojii Onyenwe anyị dị nʼelu ha nʼehihie mgbe ha si nʼọmụma ụlọ ikwu ha bilie ije.

Mgbe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ ahụ biliri ije, Mosis na-ekwu sị,

"Bilie O Onyenwe anyị,

ka ndị iro ya bụrụ ndị a chụsasịrị;

ka ndị iro gị niile site nʼihu gị gbalaga."

Ma mgbe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ bịara ebe izuike, Mosis na-ekwukwa sị,

"Lọghachi O Onyenwe anyị,

bịakwute ọtụtụ mmadụ ndị a, bụ imerime puku ndị Izrel."

Mkpanaka Erọn epupụta ahịhịa

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, "Gwa ụmụ Izrel okwu, sitekwa nʼaka ha nata mkpanaka iri na abụọ otu mkpanaka nʼisi onyendu nke ebo ọbụla. Dekwasị aha onyendu ọbụla nʼahụ mkpanaka nke ya. Ma nʼelu mkpanaka Livayị dekwasị aha Erọn. A ga-enwe otu mkpanaka maka onyendu ebo ọbụla. Tinye mkpanaka ndị a niile nʼime ụlọ nzute, nʼihu Ihe Ama ahụ, ebe m na-ezute gị. Mkpanaka nke onye ahụ m họpụtara ga-ama ifuru ndụ. M ga-ewezugakwa ntamu niile nke ndị Izrel site nʼebe m nọ, bụ nke ha na-atamu megide unu."

Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel okwu ndị a. Ndị ndu ha nyere ya mkpanaka iri na abụọ, otu mkpanaka nʼisi otu onyeisi maka onyeisi ebo ha nʼotu nʼotu. Mkpanaka Erọn dịkwa nʼetiti nke ha. Mosis chịịrị ha niile dozie ha nʼihu Onyenwe anyị nʼime ime ụlọ nzute Ihe Ama ahụ.

Nʼechi ya, Mosis banyere nʼụlọ nzute Ihe Ama ahụ chọpụta na bụghị naanị na mkpanaka Erọn, onye nọchitere anya ebo Livayị, amaala ifuru, kama na waala okoko ma mịakwa mkpụrụ osisi chara acha a na-akpọ alụmọnd. Mgbe ahụ, Mosis sitere nʼihu Onyenwe anyị wepụta mkpanaka ndị ahụ niile gosi ha ndị Izrel niile. Ha hụrụ ha, ma nwoke ọbụla weghachiri mkpara osisi nke ya.

Onyenwe anyị gwara Mosis sị, "Tinye mkpanaka Erọn nʼihu Ihe Ama ahụ, ka dịgide nʼebe ahụ dịka ihe ama nye ndị nnupu isi. Nke a ga-eme ka ntamu ndị a megide m kwụsị, ka ha ghara ịnwụ." Ya mere, Mosis mezuru ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.

Ya mere, mgbe ndị Izrel sitere nʼụlọ ikwu ha bilie njem ịgabiga osimiri Jọdan, ndị nchụaja bụ igbe ọgbụgba ndụ buuru ha ụzọ na-aga ha nʼihu. Nʼoge owuwe ihe ubi ọbụla, osimiri Jọdan na-etoju etoju, sọjukwaa akụkụ ya niile. Ma ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ a bịaruru nso zọnye ụkwụ ha nʼọnụ mmiri Jọdan, mmiri si nʼelu elu osimiri ahụ kwụsịrị ịsọ, gara elu tụkọta onwe ya dịka mgbidi nʼebe dị anya, nʼobodo a na-akpọ Adam, nke dị nso obodo Zaretan. Ebe mmiri nke na-eruda na-asọbanye osimiri Araba, ya bụ, osimiri Nnu kwụsịrị ịsọ kpamkpam. Ya mere, ndị Izrel gabigara na ncherita ihu Jeriko. Ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị guzoro nʼala akọrọ nʼetiti Jọdan, Izrel niile gabigakwara tutu ruo mgbe mba ahụ niile gafesịrị nʼala akọrọ.

Mgbe ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ si nʼosimiri Jọdan rịpụta, dịka ọbụ ụkwụ ha na-emetụ nʼala akọrọ, mmiri osimiri ahụ sọghachiri nʼọnọdụ ya ruchie akụkụ ya niile, ka dị na mbụ.

Ma e mechiri ọnụ ụzọ e si abata Jeriko nke ọma, nʼihi ụmụ Izrel. dịghị onye ọbụla na-apụ nʼezi, dịghịkwa onye na-abata nʼime ya.

Ma Onyenwe anyị gwara Joshua sị, "Lee, enyefela m obodo a bụ Jeriko, ya na eze ya, na ndị dị ike ibu agha nọ nʼime ya, nʼaka gị. Gị na ndị agha gị zọọnụ ije gburugburu obodo a. Unu ga-ejegharị gburugburu mgbidi obodo a otu ugbo nʼụbọchị. Unu ga-esi otu a jegharịa ụbọchị isii. Ndị nchụaja asaa, ndị ga-eji opi mpi ebule asaa ga-ebu ụzọ gawa nʼihu. Ndị nchụaja ndị ọzọ ga-ebu igbe ọgbụgba ndụ. Nʼụbọchị nke asaa, unu ga-agba obodo ahụ gburugburu ugboro asaa. Mgbe unu na-eme nke a, ndị nchụaja asaa ahụ ga na-afụ opi mpi ebule ha. Emesịa, ndị nchụaja ga-afụsi opi ahụ ike otu ugbo ọzọ, ha ga-afụ ya ka daa ụda nke ukwu. Mgbe mmadụ niile nụrụ ụda opi a, ha niile ga-eti mkpu nke ga-ada ezi ụda. Nke a ga-eme ka mgbidi obodo ahụ daa. Mgbe ahụ, onye agha ọbụla ga-esite nʼebe ọbụla nọ banye nʼime obodo ahụ."

Ya mere, Joshua nwa Nun kpọrọ ndị nchụaja sị ha, "Burunu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ, ka ndị nchụaja asaa nʼime unu werekwa opi mpi ebule buru ụzọ na-aga nʼihu ya." Mgbe ahụ Joshua nyere ndị Izrel iwu sị ha, "Zọlịenụ ije! Gbaanụ obodo a gburugburu, ka ndị agha na-aga nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị."

Mgbe ụda opi ike ahụ dasiri ike, ndị agha tiri mkpu, na ụda opi ike ahụ. Mgbe ndị ikom tiri oke mkpu, mgbidi ahụ dara dapịasịa, nke mere na onye ọbụla chere ihu banye nʼime obodo ahụ, lụgbuo obodo ahụ.

Nʼagha a lụrụ nʼụbọchị ahụ, ndị Filistia doro onwe ha nʼusoro izute ndị Izrel, dịka agha na-agbasa, ndị Filistia lụgburu ụmụ Izrel, gbukwaa puku mmadụ anọ nʼime ha. Mgbe ndị agha Izrel fọdụrụ laghachiri nʼụlọ ikwu ha, ndị okenye Izrel jụrịtara onwe ha sị, "Gịnị mere Onyenwe anyị ji kwe ka ndị Filistia merie anyị taa. Ka anyị gaa Shaịlo buputa igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, ka o soro anyị jee agha, ka napụta anyị site nʼaka ndị iro anyị."

Ya mere, ha zigara ndị mmadụ ka ha gaa Shaịlo. Ha sitere nʼebe ahụ bute igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye ahụ na-anọkwasị nʼoche ebere nʼetiti cherubim. Ụmụ ndị ikom Elayị abụọ, bụ Hofni na Finehaz, nọnyeere igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ.

Mgbe e bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼebe ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha, ndị Izrel tiri mkpu mere ka ala maa jijiji. Mgbe ndị Filistia nụrụ ụda mkpu a, ha jụrụ sị, "Gịnị na-eme? bụ gịnị kpatara oke iti mkpu a nʼụlọ ikwu ndị Hibru?"

Mgbe a gwara ha na bụ nʼihi na igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị erutela, ụjọ tụrụ ndị Filistia. Ha sịrị, "Chi abatala nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na ihe dị otu a emetụbeghị nʼoge gara aga. Ahụhụ dịrị anyị! Onye ga-anapụta anyị site nʼaka chi ndị a dị ike? Nʼihi na bụ chi ndị a ji ihe otiti dị iche iche tie ndị Ijipt mgbe ụmụ Izrel nọ nʼọzara. Unu dị ike, unu ndị Filistia, bụrụkwanụ ndị ikom, ma bụghị otu a, unu ga-aghọ ohu ndị Hibru dịka ha bụụrụ unu ndị ohu. Bụrụnụ ndị ikom, lụọ agha!"

Ndị Filistia lụrụ ọgụ dịka dike, lụgbuo ndị Izrel. Ndị agha ji ụkwụ eje ọgụ ọnụọgụgụ ha dị iri puku atọ nwụrụ nʼotu ụbọchị ahụ. Ma ndị fọdụrụ gbalara nʼụlọ ikwu ha. Ndị Filistia dọtara igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼagha, ma gbukwaa Hofni na Finehaz ụmụ Elayị.

Aka Onyenwe anyị malitere ịdị arọ nʼahụ ndị Ashdọd, ha na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu, o ji etuto dị iche iche menye ha egwu ma bibiekwa ha nʼAshdọd nʼoke ala ya niile. Mgbe ndị Ashdọd hụrụ ihe na-eme, ha sịrị, "Anyị achọghị ka igbe ọgbụgba ndụ Chineke nke Izrel dịrị nʼetiti anyị, nʼihi na aka ya dị ike nʼahụ anyị, otu aka ahụkwa na chi anyị Dagọn." Ya mere, ha ziri ozi kpọkọta ndịisi ndị Filistia niile, jụọ ha sị, "Gịnị ka anyị ga-eme igbe chi ndị Izrel?"

Ha zara, "Ka e buru igbe chi ndị Izrel buga ya nʼobodo Gat." Ya mere ha buuru igbe Chineke nke Izrel buga Gat.

Ma mgbe ha bubatara ya na Gat, aka Onyenwe anyị malitere imegide obodo ahụ. O tinyere ndị obodo ahụ nʼọnọdụ oke egwu. O tiri ndị bi nʼobodo ahụ ihe otiti, ma nwantakịrị ma dimkpa, etuto dị iche iche toro ha nʼahụ. Ya mere, ha zilara igbe ahụ Ekrọn.

Ma mgbe igbe ahụ na-abata Ekrọn, ndị Ekrọn kwara akwa sị, "Ha e burula igbe ọgbụgba ndụ chi ndị Izrel butere anyị, ka anyị na ndị anyị nwụsịa!" Ya mere, ha kpọkọtara ndịisi ndị Filistia niile sị ha, "Sinụ nʼobodo zipụ igbe chi ndị Izrel, maọbụ zighachinụ ya nʼobodo e si bute ya na mbụ, ka hapụ igbuchapụ anyị na ndị anyị." Nʼihi egwu maka ọnwụ ejidela ndị niile bi nʼobodo. Aka Chineke dịkwa ike nke ukwuu megide obodo ahụ.

Mbughachi igbe ọgbụgba ndụ

Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nọrọ nʼobodo ndị Filistia ọnwa asaa. Emesịa, ndị Filistia kpọrọ ndị nchụaja ha na ndị na-ajụ mmụọ ase jụọ ha sị, "Gịnị ka anyị ga-eme banyere igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị? Gwa anyị otu anyị ga-esi zilaga ya nʼala ya."

Ndị ahụ zara sị, "bụrụ na unu ezighachi igbe ọgbụgba ndụ chi ndị Izrel, unu ezighachila ya nʼaka efu, kama jirinụ onyinye aja ikpe ọmụma zilaga ya. Unu mee nke a, ihe otiti ndị a ga-ala. Unu ga-amatakwa ihe mere o ji na-ata unu ahụhụ ndị a."

Ha were dịka okwu ndị a si dị. Ha weere nne ehi abụọ na-enye ụmụ ara kegide ha nʼụgbọala ahụ, werekwa ụmụ ha kpọchie nʼọgba anụ. Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na igbe nta ahụ e tinyere oke na oyiyi etuto ọlaedo ndị ahụ a kpụrụ akpụ ka ha dọkwasịrị nʼelu ụgbọala ahụ. Ehi ndị ahụ dọkpụrụ ụgbọ ahụ gawa nʼụzọ Bet-Shemesh. Ha na-ebekwa muuu mgbe ha na-aga. Ha sogidere ụzọ ahụ na-aga. Ha echigharịghị gaa aka nri maọbụ aka ekpe. Ndị eze ndị Filistia sogidekwara ha nʼazụ tutu rute nʼoke ala Bet-Shemesh.

Nʼoge a, ndị Bet-Shemesh nọ nʼubi na-ewe ihe ubi nke ọka wiiti na ndagwurugwu ala ahụ. Mgbe ha lepụrụ anya hụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, ọṅụ juru ha obi. Mgbe ụgbọala ahụ batara nʼubi nwoke a na-akpọ Joshua na Bet-Shemesh, kwụsịrị nʼakụkụ otu nkume ukwu dị nʼebe ahụ. Ngwangwa, ndị nọ nʼebe ahụ gbuwasịrị osisi e ji mee ụgbọ ahụ, gbukwaa ehi abụọ ahụ, were ha chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ. Ndị ikom Livayị nọ nʼebe ahụ buliri igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na igbe nta ahụ dị nʼakụkụ ya nke ọlaedo niile a kpụrụ akpụ dị nʼime ya, dọkwasị ha nʼelu nkume. Ndị Bet-Shemesh bụ naanị ndị Livayị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Dit 10:18 chụrụ ọtụtụ aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ nye Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ.

Ya mere, ndị ikom Kiriat Jearim bịara buru igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị bubata ya nʼụlọ Abinadab nke dị nʼelu ugwu. Ha doro Elieza, ọkpara Abinadab nsọ, ka bụrụ onye na-elekọta igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.

Mmeri Samuel meriri ndị Filistia na Mizpa

Igbe ahụ dịgidere na Kiriat Jearim ogologo oge, iri afọ abụọ zuruoke. Ma nʼoge a niile, ndị Izrel nọ na-eru ụjụ nʼihi Onyenwe anyị. chepuru ihu ya site nʼebe ha nọ.

Mgbe a gwara eze bụ Devid si, "Onyenwe anyị agọziela ezinaụlọ Obed-Edọm na ihe niile o nwere, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke." Nʼihi nke a, Devid ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm, nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buga nʼobodo Devid. Mgbe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ zọrọ nzọ ụkwụ isii; na-eji oke ehi na nwa ehi gbara abụba chụọ aja. Devid ji ike ya niile na-ete egwu nʼihu Onyenwe anyị. yi uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ nʼụbọchị ahụ, mgbe ya na ndị Izrel niile ji iti mkpu na ụda ịfụ opi ike na-ebubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.

Mbubata igbe ọgbụgba ndụ nʼime Ụlọnsọ Ukwu

Mgbe ahụ, eze Solomọn kpọkọtara ndị okenye Izrel, na ndịisi ebo niile, na ndịisi ezinaụlọ Izrel niile, ka ha bịakwute eze na Jerusalem, maka i site na Zayọn bụ obodo Devid bugota igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. Ndị Izrel niile gbakọtara bịakwute eze Solomọn nʼoge a na-eme mmemme nʼọnwa Etanim nke bụ ọnwa asaa nʼafọ.

Mgbe ndị okenye Izrel niile bịarutere, ndị nchụaja buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Ha bugotara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, ya na ụlọ nzute, na ngwongwo niile dị nsọ dị nʼime ya. Ndị nchụaja na ndị Livayị buliri ha elu. Eze Solomọn na ọgbakọ Izrel niile, bụ ndị zukọtara nʼebe nọ, nọ nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na-achụ aja ọtụtụ atụrụ na ọtụtụ ehi nke a na-apụghị ịgụta ọnụ maọbụ gbakọta ọnụọgụgụ ha nʼihi ịba ụba.

Ndị nchụaja bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼime Ebe Kachasị Nsọ, dọba ya nʼokpuru nku cherubim ahụ. Cherubim ndị ahụ gbasara nku ha nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, zochie igbe ọgbụgba ndụ ahụ na okporo osisi ndị e ji ebu ya. Okporo osisi ndị a dị oke ogologo, na e nwere ike site nʼEbe Nsọ, dị nʼihu ime ime ebe nsọ ahụ hụ isi ha anya, ma onye na-anọghị nʼEbe Nsọ ahụ adịghị ahụ ha. Ha ka dịkwa nʼebe ahụ ruo taa. O nweghị ihe dị nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ, karịakwa mbadamba nkume abụọ ahụ Mosis tinyere nʼime ya nʼugwu Horeb, nʼebe Onyenwe anyị na ụmụ Izrel gbara ndụ, mgbe ha si nʼala Ijipt pụta.

Mgbe ndị nchụaja si nʼEbe Nsọ ahụ pụta, igwe ojii jupụtara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ. Ndị nchụaja enwekwaghị ike jee ozi ha, nʼihi igwe ojii ahụ, nʼihi na ebube Onyenwe anyị jupụtara nʼime ụlọnsọ ya.

"Lọghachinụ unu ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi," ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, "nʼihi abụ m di unu. M ga-ahọrọ unu, otu onye site nʼotu obodo na mmadụ abụọ site nʼotu agbụrụ. M ga-akpọghachi unu Zayọn. Mgbe ahụ, aga m enye unu ndị ọzụzụ atụrụ masịrị m, ndị ga-eji amamihe na nghọta duo unu. Nʼụbọchị ahụ, mgbe ọnụọgụgụ unu mụbara dị ukwuu nʼala ahụ," otu ka Onyenwe anyị kwubiri ya, "ndị mmadụ agaghị asịkwa ọzọ, igbe ọgbụgba ndụ nke Onyenwe anyị.gaghị abakwa ha nʼobi maọbụ ha echeta ya; gaghị adịkwa ha mkpa maọbụ emepụtakwa ọzọ.

Ebe ofufe nke ụwa na nke eluigwe

Ọgbụgba ndụ nke mbụ nwere usoro ofufe na ebe nsọ nke ụwa nke a e jiri aka wuo. E guzobere ụlọ ikwu. Nʼọnụụlọ nke mbụ nʼụlọ ikwu ahụ, e nwere ihe ịdọba iheọkụ, na tebul, na achịcha e doro nsọ. Aha ọnụụlọ nke mbụ a bụ Ebe Nsọ. Nʼazụ akwa mgbochi nke abụọ ka e nwere ọnụụlọ a na-akpọ Ebe Kachasị Nsọ, nke nwere ebe ịchụ aja mgbaisiọma e ji ọlaedo wuo, na igbe ọgbụgba ndụ ahụ nke e jiri ọlaedo machie ahụ ya niile. Ihe dị nʼime ite ahụ bụ mánà na mkpanaka Erọn nke ahụ puputara ahịhịa, ya na mbadamba nkume e dekwasịrị iwu ọgbụgba ndụ. Ihe dị nʼelu igbe a bụ cherubim nke ebube ya, na-ekpuchite oche amara ahụ. Ma anyị enweghị ike ịkọwacha ihe niile ndị a nʼozuzu oke ugbu a.

Mgbe ahụ kwa, e meghere ụlọnsọ Chineke nke dị nʼeluigwe. A hụkwara igbe ọgbụgba ndụ nʼime ya. Nʼotu oge ahụ kwa, egbe eluigwe malitere ịgba, amụma gbukwara. Oke ifufe bidokwara ife. Oke ala ọma jijiji na akụmmiri igwe mere mkpọtụ nke ukwuu.

Seja o primeiro
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-